Genetically Modified Mosquitoes: Ị nụla maka anwụnta ndị a e ji ebuso ọrịa ịba agha?

Anwụnta ndị agbanwere akụrụndụ ha

Ebe foto si, Oxitec company

Nkọwa foto, Ndị ọkachamara sayensị na-ekwu na anwụnta ndị ahụ anaghị ebutere mmadụ ọrịa
    • Onye dere ya, Dorcas Wangira
    • Ndị mere akụkọ a, Africa Health Correspondent, BBC News

A tọhapụla ọtụtụ anwụnta arụgharịrị akụrụndụ ha na Djibouti na mbọ a na-agba iji kwụsị mfesa anwụnta ndị na-ebute ọrịa ịba.

Oke anwụnta ndị ahụ na-adịghị ata ata a kpọrọ ‘male Anopheles stephensi mosquito’ nke ụlọọrụ Oxitec dị na mba United Kindom rụpụtara nwere akụrụndụ na-egbu anwụnta ndị nke nwaanyị tipụ ha etozuo oke.

Ọ bụ naanị anwụnta ndị nwaanyị na-ekesa ọrịa ịba na nje ndị ọzọ ma ọ bụrụ na ha taa mmadụ.

Ihe a bụ nke mbụ a na-atọhapụ ụdị anewụnta ahụ n’ọwụwa anyanwụ Afrịka ma bụrụ nke ugboro abụọ na mba Afrịka niile.

Dịka ụlọọrụ ahụike Amerịka bụ Centres for Disease Control and Prevention (CDC) siri kwuo, e werela ụdị nkanụụzụ ahụ mee ihe na Brazil, Cayman Islands, Panama na India.

Dịka CDC siri kwuo, atọhapụla ihe karịrị ụdị anwụnta ahụ karịrị otu ijeri n’ụwa dum kemgbe afọ 2019.

N’ụbọchị Tọzde 24 Mee 2024 ka atọhapụrụ agba nke mbụ nke anwụnta ahụ n’ikuku n’otu obodo di na Djibouti bụ Ambouli.

Nke ahụ bụ mmalite nke atụmatụ mgbakọaka dị n’etiti Oxitec Ltd, gọomenti Djibouti na ụlọọrụ obi ebere bụ Association Mutualis.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

“Anyị arụọla ezigbo anwụnta na-anaghị ata ata, na anaghịkwa ebufe mmadụ ọrịa. Mgbe anyị tọhapụrụ ụmụ anwụnta ndị a, ha na ndị nke nwaanyi ọjọọ ahụ ga-enwe mmekọ,” ya ka onyeisi ụlọọrụ Oxitec bụ Grey Frandsen gwara BBC.

Anwụnta ndị ahụ arụpụtara n’ụlọọgwụ nwere ụdị akụrụndụ pụrụ iche nke na-egbochi anwụnta ndị nke nwaanyị ịnya ndụ ruo n’agadị ọbụrụ ma ha na ha nwee mmekọ.

Ndị ọkachamara sayensị aka ha dị n’atụmatụ ahụ kwuru na ọ bụ naanị anwụnta ndị nke oke na-anya ndụ mana ha ga-emechakwa nwụọ.

Anwụnta stephensi nwere ikike ịtụba ndị nke nwaanyị ime n’ihi na ha adịghị ka ndị nke oke Anopheles a pịrị apị bụ ndị ezipụrụ na Burkina Faso n’afọ 2018.

Ntọhapụ anwụnta ndị ahụ bụ otu akụkụ atụmatụ a kpọrọ ‘Djibouti Friendly Mosquito Program’ bụ nke malitere kemgbe afọ abụọ nke ebumnobi ya bụ ịkwụsị mmụba anwụnta Anopheles stephensi achọpụtara na mba ahụ n’afọ 2012.

Ọ fọdụrụ obere ihe ka mba ahụ kpochapụ ọrịa ịba tupu ya achọpụta ihe ruru mmadụ iri atọ nwere ọrịa. Kemgbe ahụ, ọnụọgụ ndị nwere ọrịa ịba arịala ezigbo elu na mba ahụ rute puku iri asaa na atọ n’afọ 2020.

Ụdị anwụnta ahụ nọ n’ime mba Afrịka isii ugbua, ndị gụnyere Ethiopia, Somalia, Kenya, Sudan, Nigeria na Ghana.

Ọ na-ara ezigbo ahụ ịchụpụ anwụnta Stephensi sitere Asia. A na-akọwakwa ya dịka anwụnta ọlọrọọhụrụ n’ihi na usoro agbaochie e ji achụ anwụnta anaghịzi emetụta ya. Ọ na-ata ma n’ụtụtụ ma n’abalị ma na-agba isi akwara nyere akụrụngwa chemical e ji achụ ụmụ ahụhụ.

Onye ndụmọdụ ahụike n’obi ọchịchị Djibouti bụ Dr Abdoulilah Ahmed Abdi gwara ụlọ mgbasaozi Financial Times na ebumnobi gọọmenti bụ “ime ngwangwa tụgharịa nkesa ọrịa ịba na Djibouti bụ nke rịrịla elu kemgbe afọ iri gara aga”.

“N’oge na-etechabeghị anya, ọrịa ịba bụụrụ nke na-ejighị ike dịrị n’ime obodo anyị,” ya ka onyeisi Association Mutualis bụ Dr Bouh Abdi Khaireh kwuru.

“Ugbua anyị na-ahụ ka ndị mmadụ na-ahụsi anya n’ihi ọrịa ịba kwa ụbọchị na Djibouti. Ọ dịla ezigbo mkpa ịgbata ọsọ enyemaka ọhụrụ.”

Ọ dịla mfe iwepụta atụmatụ ọhụrụ e ji ebu agha megide ọrịa ịba n’ihi ọdịdị Djibouti, obodo ọnụogụ ya jiri obere karịa otu nde nke ọtụtụ mpaghara ya mepere emepe, ka ndị nhazi ihe omume ahụ kwuru.

“Ịba bụ ọrịa ọjọọ na-emetụta ahụike anyị. Ndị mmadụ na-eche ịhụ etu ezigbo anwụnta ndị a ga-esi nyere anyị aka n’agha a,” ya ka Saada Ismael, onye nyara ndụ site n’ọrịa ịba ma na-enye aka na nhazi obodo gwara BBC.

Onye ọrụ ahụike na-elebara anwụnta ndị ahụ anya

Ebe foto si, Oxitec company

Nkọwa foto, Ọrịa ịba na-egbu ihe karịrị mmadụ 500,000 n’Afrịka kwa afọ

Anụmanụ ndị agbanwere akụrụndụ ha abụrụla okwu na-eko achịcha na mba Afrịka. Otu ndị na-ahụ maka ogbe obibi na ndị na-agba ama adọọla aka na ntị banyere ọghọm ndị ọ ga-ebutere ogbe obibi nakwa usoro nkesa ihe oriri.

Mana Mr Frandsen sitere n’ụlọọrụ Oxitec na-ekwu na enwebeghị mmetụta ọjọọ o ga-ebutere ogbe obibi maọbụ ahụike mmadụ achọpụtarala kemgbe ihe karịrị afọ iri, bụ mgbe onye rụpụtara ụmụ anwụnta ahụ tọhapụrụ otu ijeri n’ime ha.

“Ebe anyị lekwasara anya bụ ịhụ na ihe ọ bụla anyị zipụrụ n’ogbe obibi bụ nke dị ezigbo mma ma bụrụkwa nke ga-aba uru. O nweghị mmetụta ọjọọ nyere ogbe obibi. Ha anaghị ebutere mmadụ ọrịa,” ka ọ gbakwunyere.

Anaghị ahụta akụrụndụ ahụ agbanwere agbanwe n’ime mmiri asọ anwụnta ma dịkwa ka Oxitec siri kwuo, onye ọbụla ọ tara agaghị enwe mmetụta akụrụndụ ahụ.

“Usoro a nwere ike ịkpalite okwu na ụka n’ọdịniịhu,” ya ka onye ndụmọdụ ahụike obi ọchịchị mba ahụ bụ Dr Abdi na-ekwu.

Ọ bụrụ ma ya gaa nke ọma, a ga-aga n’ihu zipụ anwụnta ndị ahụ n’ebe ọ dị ọtụtụ na mba ahụ tutu ruo n’afọ na-abịa abịa.

Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization kwuru na ịba bụ ọrịa ọjọọ na-egbu opekata mpe mmadụ narị puku isiii (600,000) kwa afọ n’ụwa dum. Ọnwụ mmadụ itoli n’ime iri bụcha ndị a na-ahụta na mpaghara okeọhịa Afrịka.