Bruno Labbadia: Ihe ị kwesịrị ịma maka nwamadị ahụ kagburu ịchịkọta 'Super Eagles'

Bruno Labbadia
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

N’ụtụtụ Tuzde 27 Ọgọst 2024, otu na-ahụ maka egwuruegwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Nigerian Football Federation' (NFF) kwupụtara Bruno Labbadia dịka onyenchịkọta ọhụrụ nke otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagles.

Ọ bụ odeakwụkwọ NFF bụ Mohammed Sanusi kwupụtara nke ahụ dịka ọ sịrị na “NFF enyela nkwado ka a họpụta Maazị Labbadia dịka onyenchịkọta ọhụrụ nke otu egwu bọọlụ Super Eagles.”

Labbadia bụ onye a hopụtara ga-anọchi anya Finidi George, onye gbara arụkwaghịm n’ọnwa Juun afọ 2024 dịka ọ gasịrị mkpụrụ ụbọchị ole na ole a họpụtara ya dịka onyenchịkọta otu egwu bọọlụ ahụ.

Mana ụbọchị Fraịde 30 Ọgọst, 2024, Otu NFF mechara nye Augustine Eguavoen ọrụ dịka onye nkuzi bọọlụ ga-edu otu Super Eagles Naịjirịa gaa asọmpị Iko Afrịka na Morocco n’afọ 2025.

Ozi si na ngalaba mgbasaozi NFF kwuru na ihe mere ha jiri nye Eguavoen ọrụ ahụ bụ maka enweghị ezi nkwekọrịta dị n'etiti ha na onye nkụzị bọọlụ bụ Bruno Labbadia si mba Germany.

Onyeisi NFF bụ Ibrahim Musa Gusau kwuru na “Kemgbe abalị atọ garaaga ka ha na Bruno Labbadia na-akpa gbasara etu a ga-esi kwụọ ego ụtụisi mba Germany manyere n’isi ego a ga-akwụ ya”.

Onye bụ Bruno Labbadia?

Bruno Labbadia
  • A mụrụ ya na Darmstadt, mba Jamini n’abalị 8 Febụwarị, afọ 1966.
  • Ọ bụụrụ onye ọgbaabọọlụ n’otu egwu bọọlụ Darmstadt 98, Hamburger SV, FC Kaiserslautern, Bayern Munich, FC Cologne, Werder Bremen, Armenia Bielefeld na Karlsruher SC.
  • Dịka onye ọgbaabọọlụ, ọ mabutere iko Bundesliga oge ọ na-agbara Bayern Munich.
  • Ọ bụbu onyenchịkọta otu egwu bọọlụ Hertha Berlin, VfB Stuttgart, VfL Wolfsburg, Hamburger SV na Bayer Leverkusen, tinyekwara ndị ọzọ.

Ndị bụbu ndị nchịkọta otu egwu bọọlụ Super Eagles

Super Eagles team
  • John Finch (England) – 1949
  • Daniel Anyiam (Nigeria) – 1954-1956; 1964-1965
  • Les Courtier (England) – 1956-1960
  • Moshe Beit Halevi (Israel) – 1960-1961
  • George Vardar (Hungary) – 1961-1963
  • Joey Blackwell (England) – 1963 – 1964
  • József Ember (Hungary) – 1965-1968
  • Sabino Barinaga (Spain) – 1968-1969
  • Peter 'Eto' Amaechina (Nigeria) – 1969-1970
  • Karl-Heinz Marotzke (Germany) – 1970-1971; 1974
  • Jorge Penna (Brazil) – 1972-1973
  • Jelisavčić 'Father Tiko' Tihomir (Yugoslavia) – 1974-1978
  • Otto Glória (Brazil) – 1979-1982
  • Gottlieb Göller (Germany) – 1981
  • Adegboye Onigbinde (Nigeria) – 1983-1984; 2002
  • Chris Udemezue (Nigeria) – 1984-1986
  • Patrick Ekeji (Nigeria) – 1985
  • Paul Hamilton (Nigeria) – 1987; 1989
  • Manfred Höner (Germany) – 1988-1989
  • Clemens Westerhof (Netherlands) – 1989-1994
  • Amodu Shaibu (Nigeria) – 1994-1995; 1996-1997; 2001-2002; 2008-2010
  • Johannes Bonfrere (Netherlands) – 1995-1996; 1999-2001
  • Philippe Troussier (France) – 1997
  • Monday Sinclair (Nigeria) – 1997-1998
  • Bora Milutinović (Yugoslavia) – 1998
  • Thijs Libregts (Netherlands) – 1999
  • Christian Chukwu (Nigeria) – 2002-2005
  • Augustine Eguavoen (Nigeria) – 2005-2007; 2010; 2022
  • Berti Vogts (Germany) – 2007-2008
  • Lars Lagerbäck (Sweden) – 2010
  • Samson Siasia (Nigeria) – 2010-2011; 2016
  • Stephen Keshi (Nigeria) – 2011-2014; 2015
  • Sunday Oliseh (Nigeria) – 2015-2016
  • Gernot Rohr (Germany) – 2016-2021
  • José Peseiro (Portugal) – 2022-2024
  • Finidi George (Nigeria) – 2024
  • Augustine Eguavoen (Nigeria) – 2024-?