Onye ka Naịjirịa ga-enye ọrụ na-etiti Andersson na Renard na-achọ ọrụ nkuzi bọọlụ na mba a?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Oluwashina Okeleji
- Ndị mere akụkọ a, Digital Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
O teela aka Naịjịrịa na-achọ onye nkuzi bọọlụ maka otu egwuregwu Naịjirịa a na-akpọ Super Eagles, mana e nwere ihe mgbagwojuanya n'usoro e ji eweputa onye ga-enwere ọrụ ahụ na-etiti mmadụ abụọ fodụrụ n'ime ndị a chọrọ iye ọrụ ahụ.
Kemgbe Finidi George rituru dịka onye nkuzi bọọlụ nke Ugo Naịjirịa, enweghị onye nọ n'oche ahụ.
Finidi bụ onye e nyere ọrụ oge ahụ dịka meriri naanị otu asụmpị n'ime asọmpị anọ o du ndị Ugo Naịjirịa ga gbaa. Ndị o meriri bụ Benịn 2-1 ma budaa Naịjirịa n'ala tebulu dịka ndị na-esota mba ịkpaazụ na tebulu.
Naịjirịa ugbua na-ele anya na otu onye n'etiti nwoke Sweden bụ Janne Anderson na onye nke France bụ Herve Renard ga-eweta ọrụ ahụ.
Otu na-ahazị egwuriegwu bọọlụ n'Naịjirịa bụ Nigeria Football Federation (NFF) nọ n'ọnọdụ ime ngwangwa ka e nweta onye nkuzi bọọlụ maka n'itozu AFCON 2025 ga-amanita n'ọnwa Septemba 2024.
Andersson nwere mmasị mana ọ chọrọ ka e nye ya obere oge

Ebe foto si, Getty Images
Andersson dangbanyere n'ihe Naịjirịa chọrọ ma ị tulee ndeko ya nakwa ego ole a ga akwụ ya.
N"afọ garaaga ka nwoke ahụ dị afọ 61 hapụrụ ọrụ dịka onye nkuzi bọọlụ na mba Sweden bụ ebe ọ rụrụ ọrụ afọ asaa ma rụọ na-agba na-eso agba nke so agba ikpaazu na asọmpị mba ụwa nke afọ 2018 ma ruo mba 16 n'asọmpị Euro 2020.
Ọ rituru n'oche n'ọwa Nọvemba oge oweghị ike ime ka Sweden gaa Asọmpị mba ụwa n'afọ 2022 na Euro 2024.
Andersson bụ naanị na Sedwen ka ọ kuziri bọọlụ. O ji otu egwu bọọlụ IFK Norrkoping nwere buru iko asọmpị na mba ahụ, mana ọ chọrọ ịga n'Afrịka n'agbanyịghị na-onweghị mmụta ịtụzị bọọlụ na mba ọzọ na-abụghị Sweden.
Naanị nsogbu dị ugbua bụ na naanị n'ọwa Septemba ka o wereike iwere ọrụ na Naịjirịa mana tupuu oge ahụ eruo, Naịjirịa ekwesila ịzụta ndị Benin na ndị rwanda.
Nke a ga-eme asị osote ya bụ Peter Wettergren na Augustine Eguavoen duru ugo Naịjirịa gaa asọmpị abụọ ahụ
NFF ha nwereike ịkwụ Renard ụgwọ?

Ebe foto si, Getty Images
Renard kacha dị ngaraọnụ ma bụrụ ihe ga-ata akpụ inye ya ọrụ.
Nwoke onye mba Furenchi ahụ bụ onye dugoro mba abụọ n'Afrịka wee turu ugo n'AFCON.
N'afọ 2018 na 2022, Renard durula mba Morocco na mba Saudi Arabia gaa asọmpị mba ụwa bụ ebe ọ nọ merie Argentina bụ ndị mechere buru iko ahụ.
Ọrụ ikpeazụ ọ rụrụ bụ ịdụrụ ụmụnwanyị France gaa asọmpị mba ụwa nke afọ 2023 nakwa olimpik nke afọ a bụ ebe ọ mere ọfụma.
Nwoke ahụ dị afọ 55 ka ndị mmadụ na-achọ iye ọrụ na mba dị icheiche, ma Amerika na ndị ọzọ.
Ndị Egypt chọrọ ịkwụ ya ego ruru $2m (£1.5m) kwa afọ bụ nke Naịjirịa enweghị ike ịkwụ ya.
Ọ chọrọ ịbụ onye nkuzi bọọlụ na mba kacha mana oge adịghịzị n'etiti ya na Naịjirịa.
Ọrụ tara akpụ dị n'ihu

Ebe foto si, Getty Images
Onye ọbụla nwetara ọrụ ịkụzịrị ndị otu Super Eagles nke Naịjirịa bọọlụ nwere ọtụtụ ihe ọ ga-arụ.
Itozu ịsọ gbaa asọmpị mba ụwa bụ nke na-ata akpụ ugbua.
Ọzọ bụ ime ka ụlọ mgbasaozi ga-enyereaka mee ka ndị nkwadọ egwuregwu bọọlọ na-akwado ha.
Ọtụtụ ihe ọ ga-ahazị ma kwụsị gụnyere ịjị ndị na-agba bọọlụ ụgwọ na ihe nrịte dị icheiche adịghị enyezi ha bụ nke na-eme oge niile ugbua.








