Ivory Coast abụrụla dike Afrịka ka ha mabuuru Iko AFCON 2023

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu bọọlụ Elephant nke Ivory Coast amaburula Iko Mba Afrịka nke afọ 2023 a gbara na mba ha.
Ha mere nke a site n'iji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Super Eagles nke Naịjirịa n'agba nke ikpeazụ asọmpi ahụ.
Na-agbanyeghi na Naịjirịa bu ụzọ nye ha goolu mana ha si n'azụ saa goolu ahụ ma merie.
Goolu Super Eagles si n'aka William Troost Ekong na nkeji 38’ bụ nke o ji isi sụnye n’azụ neetị ndị Ivory Coast.
Ha sara gooolu a site n'aka Frankie Kassie nyere na nkeji 62' bụ nke o ji isi ya nye dịka Ekong.

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Getty Images
Ha mezuru goolu ha abụọ na nkeji 81' site n'aka Serbastain Haller.
Ugbua asọmpi, ha na-agba Naịjirịa goolu abụọ asatara otu dịka asọmpi ka kpụụ ọkụ n'ọnụ.
Nke bụ eziokwu bụ na asọmpi a kpụụ ọkụ n’ọnụ dịka Naịjirịa siri ọnwụ isa bọọlụ ahụ mana oge gụnahụrụ ha.
Ugbua Ivory Coast amabutela iko a ugboro atọ dịka Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Etu asọmpi a dị n'etiti Ivory Coast na Naịjirịa ga-esi gaa

Ebe foto si, Total Energy AFCON
Asọmpi egwuregwu bọọlụ Iko Mba Afrịka nke afọ 2023 ga-akụrụ ọnụ na Sọnde 11 Febụwarị 2024 mgbe mba na-ahazi ya bụ Ivory Coast ga-ele Naịjirịa ọbịa n’agba nke ikpeazụ.
Asọmpi a ga-ebiri ọkụ ma ọ kụọ elekere itoolu nke abalị, a ga-agba ya n’ọgbọegwuregwu Alassane Ouattara dị n’Abidjan bụ isiobodo Ivory Coast.
Ivory Coast vs Naịjirịa: Asọmpi isi na isi

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Elephant nke Ivory Coast na Super Eagles nke Naịjirịa abụghị anụ taa ma a bịa n’asọmpi bọọlụ ọkachasị n’Iko Mba Afrịka.
Otu abụọ a ezutela onwe ha n’asọmpi bọọlụ ugboro iri abụọ na asatọ, Naịjirịa emeriela ugboro itoolu ebe Ivory Coast merikwara ugboro itoolu dịka ha gbara nhatanha ugboro iri.
Mana a bịa n’asọmpi Iko Mba Afrịka (AFCON), ha ezutela onwe ha ugboro asaa, Naịjirịa merie ugboro atọ, Ivory Coast meriri ugboro abụọ dịka ha gbara nhatanha ugboro abụọ.
Etu otu abụọ a siri rute n’agba ikpeazụ AFCON 2023
Super Eagles nke Naịjirịa gbara ọtụtụ asọmpi ma merie tupu ha erute agba nke ikpeazụ a dịka emeritughi ha n’asọmpi niile ha gbarala.
N’agba mbụ, ha zutere Equatoria guinea dịka ha gbara nhatanha, mana ha meriri Ivory Coast (1 -0) nakwa Guinea Bissau.
N'agba mgbapụ Super Eagles gbapụrụ Kameruun ma gbapụkwa Angola n'agba anọ nke ikpeazụ (quarter finals) ma merie Saụt Afrịka n’agba abụọ nke ikpeazụ.
N’aka nke ọzọ Ivory Coast emechaghị ọfụma n’agba mbụ nke asọmpi a, dịka ha meriri Guinea Bissau, ebe Naịjirịa na Equatorial Guinea merichara ha.
Mana jisiri ike tozuo oke n’agba mgbapụ ma zute ndị dịka Senegal, Mali na DR Kongo, merichaala ha iji rute n’agba nke ikpeazụ.
Ugboro ole Naịjirịa na Ivory Coast mabutere Iko AFCON

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu abụọ a aṅụtụla mmiri ụtọ dị na mmeri asọmpi Iko Mba Afrịka.
Otu egwuregwu Super Eagles nke Naịjirịa amabutela iko a ugboro atọ n'afọ 1980, 1994 nakwa 2013.
Ebe Ivory Coast amabutela ya ugboro abụọ gụnyere n'afọ 1992 na 2015.
Ọ bụrụ ha merie n'asọmpi abalị a, ọ ga-abụ nke ugboro atọ ebe Naịjirịa merie ọ bụrụ nke ugboro anọ.
Ya mere anya onye ọbụla ji nọrọ n'asọmpi abalị a ịma mbe bụ oke n'ime ha abụọ. Maka akụkọ banyere nke a chọta BBC Igbo n'akara websaịt ha.









