Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Noni Madueke

Ebe foto si, Madueke/Instagram
Chukwunonso Tristan Madueke etiela ịgba dịka otu n’ime ndị ọkụbọọlụ na-eto eto site na mgbe ọ nọ na Netherlands ruo ugbua ọ banyere otu egwu bọọlụ Chelsea.
Lee ụfọdụ ihe ndị i kwesịrị ịma gbasara ya
1. Aha ya bụ Chukwunonso Tristan Madueke mana e ji Noni Madueke mara ya nke ọma.
2. Ọ na-agbara otu egwu bọọlụ mba England ndị akarịbeghị afọ iri abụọ na otu (21).
3. A mụrụ ya na London dị na England n’abalị 10 Maachị 2002
4. Ọ gbara afọ iri abụọ na abụọ (22)
5. Ogologo ya dị 1.82m (6ft)
6. Ọ banyere otu egwu bọọlụ Chelsea n'abalị 20 Jenụwarị 2023 maka ịgbara ha bọọlụ afọ asaa na ọkara
7. Ọ malitere ịgba bọọlụ n’abalị 3 Febụwarị 2023
8. Ọ sụnyere ọkpụ goolu atọ oge Chelsea zutere otu egwu bọọlụ Wolves n'ụbọchị Sọnde 25 Ọgọst 2024
9. Noni Madueke na-agbara otu egwu bọọlụ Chelsea n'akụkụ








