Ụfọdụ ihe ndị dị mkpa banyere mmalite egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị n’ụwa

Otu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa so na otu akacha mara n'asọmpị bọọlụ ụmụnwaanyị n'Afrịka

Egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị n’ụwa na-akpọkọtabụ ọtụtụ igwe ndị mmadụ na ndị nso nso ọnụ karịa nke ụmụnwoke n’oge gara aga – n’ọge ahụ, mgbe ụfọdụ ọnụọgụgụ igwe ndị mmadụn na-abịa ele egwuregwu bọolụ ụmụnwaanyị na-eji ihe ruru 50,000 karịa ndị na-abịa ele nke ụmụnwoke.

N’ebe afọ 1920, egwuregwụ bọọlụ ụmụnwaanyị na-amịta mkpụrụ nke ukwu dịka mba Briten nwere otu bọọlụ ruru 150.

Mana otu na-ahụ maka egwu bọọlụ bụ FA mechara machie egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị dịka ha kwuru na “egwuregwu a adịchaghị mma nye ụmụnwaanyị”.

O ruru afọ 50 ọzọ tupu egwụ bọọlụ ụmụnwaanyị eteela n’ụra ọzọ, nke a so n’ihe mere egwu bọọlụ ụmụnwaanyị ji anọzị n’azụ egwuregwu bọọlụ ụmụnwoke ugbua.

Dịka a na-agba iko mba ụwa Fifa nke ụmụnwaanyị 2023 na mba New Zealand, anyị tinye anya n’ụfọdụ ihe ndị dị mkpa banyere asọmpị egwuregwụ bọọlụ ụmụnwaanyị n’ụwa nakwa etu o siri malite.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Lily Parr bụ nwaanyị mbụ e tinyere aha ya ma nye nkwanye ugwu 'Hall of Fame' pụrụiche n'ụlọ ngosi 'National Football Museum' n'afọ 2002

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Lily Parr bụ nwaanyị mbụ e tinyere aha ya ma nye nkwanye ugwu 'Hall of Fame' pụrụiche n'ụlọ ngosi 'National Football Museum' n'afọ 2002

Nwaanyị a bụ oyiri Eden Hazard n’oge ndụ ya

Lily Parr so na ụmụnwaanyị mbụ ji egwuregwu bọọlụ mere aka ọrụ. Ọ gaara otu Dick Kerr nke ụmụnwaanyị bụ otu aha ya si n’ebe a na-edobe ngwa ọgụ na mpaghara Preston n’oge agha ụwa nke mbụ bụ ebe ọtụtụ ndị so n’otu bọọlụ a bi.

Otu a bụ otu bọọlụ ụmụnwaanyị nke mbụ yi uwe ‘shorts’ ma bụrụ otu bọọlụ mbụ gara mba ndị ọzọ ga sonye n’egwuregwu bọọlụ.

Nwaada Lily bụ onye ise nwụrụ na-amasị nke bụ na oge ụfọdụ a na-eji akpa anwụrụ sịga (Woodbine cigarettes) akwụ ya ụgwọ ọnwa.

Lee ọha ndị mmadụ gbakọrọ ikiri asọmpị bọọlụ ụmụnwaanyị nke Theatrical Ladies Football a gbara n'afọ 1912 na Briten

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Lee ọha ndị mmadụ gbakọrọ ikiri asọmpị bọọlụ ụmụnwaanyị nke Theatrical Ladies Football a gbara n'afọ 1912 na Briten

Egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị n’oge ahụ na-arata ọha ndị mmadụ

Igwe ndị mmadụ na-agbakọta ele egwregwu bọọlụ ụmụnwaanyị n’oge agha a ọkachasị oge amalitere ịkpọku ụmụnwaanyị ka ha malitere ịrụ n’ụlọọrụ mepụta ihe bụbu ebe ụmụnwoke ndị e zigara aha na-arụbu.

N’ụbọchị ekeresimesi nke afọ 1917, mmadụ 10,000 gbakọtara lelee asọmpị bọọlụ ụmụnwaanyị a gbara na Preston.

Ụbọchị na-esote ụbọchị ekeresimesi bụ ụbọchị ‘Boxing Day’ nke afọ 1920, otu ụmụnwaanyị nke Dick Kerr gbara asọmpị nke igwe mmadụ ruru 53,000 bịara kirie n’ama egwuregwu Everton's Goodison Park ground. Puku kwuru puku igwe ndị mmadụ chọrọ ibata kirie asọmpị a tọrọ n’ezi ama egwuregwu a dịka ha enweghi ike batanwuo.

Otu Everton nke ụmụnwoke ratara ọnụọgụgụ kacha elu ndị bịara kirie asọmpị ha n’afọ 2014/15. Ya bụ ọnụọgụgụ bụ 39,000.

Ụmụnwaanyị na-agba egwuregwu bọọlụ n'afọ 1970 tupu a machie ụmụnwaanyị isonye asọmpị a

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị na-agba egwuregwu bọọlụ n'afọ 1970 tupu a machie ụmụnwaanyị isonye asọmpị a

E mechara machie egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị

N’ụbọchị ise nke ọnwa Disemba afọ 1921, otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ bụ ‘Football Association’ (FA) machiri ụmụnwaanyị isonye n’asọmpị ndị a na-agba bụ nke FA hazịrị. Nke a pụtara na ụmụnwaanyị ndị a ma ama dịka Lily Parr enweghiziike esonye n’ama egwuregwu ndị zuruoke ma nwee ihe ndị e ji kwesịrị ekwesị.

FA n’oge ahụ kwuru na “asọmpị bọọlụ abụghị ihe dị mma ụmụnwaanyị isonye, ụmụnwaanyị isonye abụghị ihe e kwesịrị ịkwado”.

N’afọ 1971, e mechara bulie mmachi a dịka e mechara hibe otu n’ahụ maka egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị ka afọ olemaole gachara – a kpọrọ otu a ‘Women's Football Association’ (WFA).

Otu bọọlụ ụmụnwaanyị Briten n'afọ 1997 mgbe FA malitere ịgba mbọ ikwalite asọmpị bọọlụ ụmụnwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu bọọlụ ụmụnwaanyị Briten n'afọ 1997 mgbe FA malitere ịgba mbọ ikwalite asọmpị bọọlụ ụmụnwaanyị

N’ikpeazụ, ka afọ 50 gachara - Ụmụnwaanyị nweziriike iji egwuregwu bọọlụ mere aka ọrụ

Iwu maka iji okike mmadụ dịka nwoke maọbụ nwaanyị megide mmadụ, bụ iwu a kpọrọ ‘Sex Discrimination Act’ n’afọ 1975 mere ka ọ dị mfe ụmụnwaanyị ime ọzụzụ ma bụrụ ndị ogbo opi n’egwuregwu bọọlụ.

Ọ bịara bụrụ ihe tara akpụ ikiri asọmpị bọọlụ ụmụnwaanyị n’igwe TV dịka e mechara kpọpụta mpụtara asọmpị ikpeazụ nke ikp mba ụwa ụmụwaanyị n’afọ 1970 n’igwe TV.

N’afọ 1989, ụlọ ntaakụkọ Channel 4 malitere igosi egwuregwu bọọlụ oge niile.

N’afọ 1997, otu FA wepụtara atụmatụ ha ikwalite egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị si n’ala ruo na ntolite.

N’afọ 2011, asọmpị Women’s Super League malitere. Dịka ebe ọnwa Sepụtemba 2014 ruru, ihe ruru ụmụnwaanyị nde abụọ na ụma malitere na-agbazị bọọlụ na mba Briten.

Otu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa n'afọ 1997

Ebe foto si, Super Falcons/Facebook

N’ọnwa Nọvemba afọ ahụ, e rere akwụkwọ iji bata kirie asọmpị otu bọọlụ ụmụnwaanyị Briten ruru 55,000 nke a bụ ụbọchị ha zutere mba Germany. Ọnụọgụgụ riri elu karịa 40,181 bụ ọnụ ọgụgụ ndị zutere akwụkwọ ile egwu bọọlụ ụmụnwoke Briten gbara na Wembley.

N’Afrịka, asọmpị bọọlụ ụmụnwaanyị malitekwara rịwa elu dịka a malitere ịgba asọmpị ụmụnwanyị Women's Africa Cup of Nations malitere n’afọ 1991 maba e malitere ịgba ya kwa afọ abụọ n’afọ 1998.

Otu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ otu Super Falcons bụ otu a ma ama n’egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị n’Afrịka nakwa n’ụwa.

Otu a enwetela mmeri n’asọmpị Women’s Africa Cup of Nations ugboro 11. Otu a bụkwa naanị otu si ‘Confederation of African Football’ rurula agba so agba ikpeazụ n’asọmpị iko mbaụwa Fifa nke ụmụnwaanyị nakwa asọmpị Olympics.

Ha sokwa naanị otu ụmụnwaanyị Afrịka ndị sonyerela n’asọmpị iko mbaụwa Fifa niile a gbarala.

Nwaada Oshoala dị afọ 29 na-agbara otu bọọlụ Barcelona bọọlụ ugbua dịka e depụtara aha ya na mkpọpụta aha ndị a na-akwanyere ugwu nke 'Forbes 30 under 30'

Ebe foto si, Asisat Oshoala/Instagram

Nkọwa foto, Nwaada Oshoala dị afọ 29 na-agbara otu bọọlụ Barcelona bọọlụ ugbua dịka e depụtara aha ya na mkpọpụta aha ndị a na-akwanyere ugwu nke 'Forbes 30 under 30'

Ụfọdụ na-ahụta nwaada Asisat Oshoala bụ onye otu Super Falcons dịka nwaanyị kacha acha ọkụ n’egwuregwu bọọlụ n’Afrịka.

O nwetala ihe nrite nwaanyị kacha n’egwu bọọlụ Afrịka ugboro ise (Africa Women’s Footballer of the Year).

O nwetala ọtụtụ ihe nrite n’aha Naịjirịa nakwa aha otu bọọlụ ndị ọzọ ọ na-agbara na mba ofesi.