Nnamdi Okafor: Gọọmentị na ndị omeiwu Anambra Steeti akwaala arịrị maka ọnwụ onye otu ha

Onye ji ọkwa 'majority leader' n'ụlọomeiwu Anambra Steeti

Ebe foto si, Nnamdi Okafor

Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo etiela ebewu maka ọnwụ Nnamdi Okafor bụ onye omeiwu na-anọchiteanya Awka South na steetị ha.

N’akwụkwọ odeakwụkwọ gọọmentị ha wepụtara, Soludo sị na Okafor bụ onye so n’ihe a na-eme n’ọgbakọ ndị omeiwu n’Anambra.

Ọ sị na ọ bụ obi mwute ka gọọmentị ya na ndị Anambra ji nabata ozi ọnwụ Okafor ma tie ezinaụlọ ya aka n’obi.

N’otu aka ahụ ndị ụlọomeiwu Anambra Steetị kwara arịrị maka ọnwụ onye otu ha a.

Onyeisi ndị omeiwu a bụ Uche Okafor sị na ọ bụ nke a wutere ha nke ukwuu maka na Okafor maara nke ekwe na-akụ.

Nnamdi Okafor nke Awka South n'ụlọomeiwu

Ebe foto si, Nnamdi Okafor

Ọ kọwara ọnwụ ya dịka oke ihe funahụrụ ndị ụlọomeiwu nakwa gọọmentị Anambra Steetị.

N’aha ndị omeiwu niile, o tiri ezinaụlọ Nnamdi Okafor aka n’obi maka ọnwụ ya ma sị ka mkpụrụ obi ya laa na ndokwa.

Akụkọ kwuru na Okafor dara n’ala ma nwụọ n’ụlọọgwụ Sandton City dị na Johannesburg nke mba Saụt Afrịka.

Na nke a mere mgbe ọ gara ọzụzụ ndị ji ọkwa n’ụlọomeiwu Anambra Steeti bụ nke o so n’ime ha dịka ‘majority leader’.

A mabeghi kpọmkwem ihe butere ọnwụ Nnamdi Okafor.

Ọnwa Okafor na-abịa n'ime ọnwa atọ onye omeiwu ọzọ bụ Okechukwu Okoye nke Aguata Two nwụchara.

Ihe i kwesịrị ịma maka Nnamdi Okafor

Nnamdi Okafor e ji 'Akajiugo Awka' maara

Ebe foto si, Nnamdi Okafor

  • Okafor, onye a na-etu 'Akajiugo Awka' bụ onye Umuzocha dị n'Ọka, isiobodo Anambara steeti.
  • Ọ gara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ' St Patrick Primary School ,Awka bụ ebe o siri gawa Dennis Memorial Grammar School, (DMGS) Onitsha.
  • Ọ gara mahadum n'ala Bekee ebe ọ gụrụ banyere mkpụrụọgwụ na 'Florida Agricultural and Mechanical University dị na Tallahassee, Florida.
  • Ọ nọrọ ebe ahụ malite ọrụ n'ụlọọgwụ 'Jackson Memorial Hospital' dị na Miami, Florida tupu ọ malite ụlọọrụ nke ya.
  • Ọ lọghachiri Naijiria n'afọ 2010 banye ndọrọndọrọ ọchịchị.
  • Mbọ ọ gbara ịzọ ọkwa onye ga-anọchite mpaghara ya amịtaghị mkpụrụ na mbụ mana o meriri na ntuliaka ọ zọrọ n'aha pati Apga n'afọ 2015.
  • Okafor na-anọchiteanya mpaghara Awka-South n'ụlọomeiwu steeti ahụ.
  • A ma Nnamdi dịka onye na-akwalite ndị ntorobia dịka o nwere asompi egwu bọọlụ 'Dr. G. Nnamdi Okafor Champions Cup nke ọ na-ehiwe kwa afọ maka ndị Ọka na ndị Ọkpụnọ.
  • A makwa ya maka inye ọtụtụ ụmụakwụkwọ ohere ịgụ akwụkwọ n'efu.
Nnamdi Okafor

Ebe foto si, Nnamdi Okafor