Rotavirus Vaccine: Ihe mere o ji dị mkpa inye ụmụaka ọgwụ mgbochi maka ọrịa a

Nwata a na-enye ọgwụ mgbochi

Ebe foto si, UNICEFNigeria

Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha etinyela ọgwụ mgbochi a kpọrọ 'Rotavirus Vaccine' ka ọ bụrụ iwu na ụmụaka niile a mụrụ ọhụrụ na Naịjirịa ga-agbarịrị ya.

Mịnịstrị ahụike kwuru nke a n'Abuja n'ụbọchị Mọnde ma kọwaa na ya bụ ọgwụ mgbochi ga-abụ n'efu n'ihi na gọọmentị nakwa otu na-akwalite ọgwụ mgbochi n'ụwa niile bụ GAVI akwụọla ụgwọ ya.

Ọnụọgụgụ gosiri na ụmụaka ọnụọgụgụ ha ruru puku iri ise (50,000) na-anwụ kwa afọ na Naịjirịa n'ihi nje 'rotavirus'

Gịnị bụ ọrịa 'Rotavirus'?

Nwata na-ebe akwa

Ebe foto si, Iwaria

Rotavirus bụ ọrịa nje na-efe efe nke na-akpata afọ ọsịsa na mmadụ ịnyụ nsị mmiri mmiri nke bekee na-akpọ 'diarrhea'.

Nje a na-emetụta ma ụmụaka ma okenye, mana ọ na-aka njọ n'ahụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise.

Ọrịa 'rotavirus' na-amalite ma ọ gachaa ihe dịka abalị abụọ mmadụ butere ya bụ nje.

Etu nje a si efesa bụ site na mmadụ imetụ onye butere ya bụ nje ahụ, maọbụ ịmetụ aka n'ebe maọbụ n'ihe onye bu nje a metụrụ aka bịakwa metụ aka ahụ n'ọnụ maọbụ n'ime ya.

A na-ahụkarị nje 'rotavirus' n'ahụ ụmụaka dị afọ atọ ruo afọ ise.

Ndị karala nka, nakwa ndị na-elekọta ụmụaka nwekwara nnukwu ohere ibute nje a.

Nje 'rotavirus' na-efesakarị n'oge udummiri.

Njirimara ọrịa 'rotavirus'

N'ahụ ụmụaka, njirimara nje 'rotavirus' gụnyere:

  • Nwata na-anyụ nsị mmiri mmiri gafee otu ụbọchị
  • Nwata na-agbọkwa agbọ ugboro ugboro
  • Nsị nwata a ga na-eji oji maọbụ nwee obere ọbara na ya
  • Ahụ nwata ahụ ga-adị ọkụ gafee selshọs iri atọ na asatọ (38.9 C)
  • Ike ọgwụgwụ, ahụ ezughị ike, nakwa ahụ mgbu
  • Ihe ngosipụta na mmiri kọrọ nwata n'ahụ: dịka ọnụ ịkpọ nkụ, ọ naghị anyụ mamịrị, anya mmiri anaghị apụta ma ọ na-ebe akwa.

Mgbe ọbụla ị hụrụ ụdị ihe a n'ahụ nwatakịrị, were ọsọ kpọga ya ụlọọgwụ.

N'ahụ ndị okenye, njirimara ọrịa 'rotavirus' gụnyere:

  • Ịnyụ nsị mmiri mmiri ihe karịrị ụbọchị abụọ
  • Ịnyupụ ihe mmiri ọbụla banyere gị n'ahụ
  • Ịhụ ọbara n'ime nsị gị maọbụ agbọ ị gbọpụtara
  • Ahụ ọkụ karịrị selshọs iri atọ na itoolu (39.4 C)
  • Ihe ngosipụta na mmiri kọrọ gị n'ahụ: dịka oke akpịrị ịkpọ nkụ, ọnụ ịkpọ nkụ, anyụghị mamịrị, oke ike ọgwụgwụ, ajụ ibu mmadụ

Mgbochi ọrịa 'rotavirus'

Nwata a na-enye ọgwụ mgbochi

Dịka ngalaba 'World Health Organisation' si kwuo ụzọ kacha mma iji gbochie ibute nje 'rotavirus' bụ ọgwụ mgbochi.

Etu e si enye ọgwụ mgbochi 'rotavirus' bụ ịtụnye ya n'ọnụ.

Ugboro abụọ maọbụ atọ ka e kwesịrị inye nwata ọgwụ mgbochi 'rotavirus'; nke mbụ bụ tupu nwata eruo izuụka iri na ise, nke ikpeazụ bụ ma nwata ruo ọnwa asatọ.

Chetakwa na oge ụfọdụ, ọgwụ mgbochi 'rotavirus' nwereike ịkpatara nwatakịrị ka o nwee ụdị ihe ngosipụta ya bụ ọrịa.

Nke a anaghị eme oge niile, mana ọ bụrụ na ị chọpụta na nwa natara ọgwụ mgbochi 'rotavirus' malitere nyụwa nsị mmiri mmiri maọbụ gbọwa agbọ, biko kpọgara ya dọkịnta n'oge.

Mgbochi ndị ọzọ

Onye na-akwọcha aka

Ebe foto si, Iwaria

Ụzọ ọzọ ị ga-esi chekwaa onwe gị ma gbochie 'rotavirus' bụ ịkwọcha aka gị oge niile ma ị gachaa mposi, ma i hichaa nsị nwatakịrị, nakwa ma i hichaa agbọ nwatakịrị gbọrọ.

Gbaa mbọ na-eji mmiri na ncha na-ehicha okirikiri ebe nwa gị na-anọkarị iji gbuo nje ọbụla dị ebe ahụ.

Sachaa ihe ọbụla ị chọrọ iri nke ọma tupu i rie ya; n'ihi na nje 'rotavirus' na-esikwa na nri adịghị ọcha efesa.