You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe Nnamdi Kanu gwara anyị gwa ndị Igbo- Eze Chukwuemeka Eri ,Ifeanyi Ụbah
Eze ọdịnala Aguleri bụ Eze Chukwuemeka Eri na Senetọ na-anọchite anya Anambra-South n'Ụlọọmeiwu Ukwu Naijiria bụ Ifeanyi Ubah agbaala ama na obi adịghị onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu mma maka ọnọdụ nọrọnụlọ a na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria.
Nke a pụtara ihe ụbọchị Fraide, abalị atọ nke ọnwa Ọgụstụ, afọ 2023, dịka ndị ndu Igbo abụọ a gara leta Nnamdi Kanu n'ogige ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS n'Abuja.
E ji Kanu na mkpọrọ DSS kemgbe ọnwa Juun afọ 2021 dịka a na-ekpe ya ikpe maka ebubo metụtara iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria.
Ozi si n'ọnụ Eze Chukwemeka Eri na Ubah na-abịa ka ọ gachara otu izuụka Nnamdi Kanu dere akwụkwọozi degara Simon Ekpa site n'aka otu n'ime ndị ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor sị ka ọ kwụsị ịmanye nọrọnụlọ n'Ọwụwa Anyanwụ.
Kanụ sị na ndị na-etinye nọrọnụlọ na-emegide mmụọ dị n'ala Igbo- Eze Chukwemeka Eri
N'ozi ya, Eze Chukwuemeka bụ aka ji ọfọ Igbo nile kwuru sị,"Ọ(Nnamdi Kanu) sịrị na ihe na-afịọ n'ala Igbo karịziri ya, na ya na-arịazị ọrịa n'ihi na ndị mmadụ jizi aha ya na-egbu ndị mmadụ n'ala Igbo, na-akwụsị ụmụaka ịga akwụkwọ na a na-eme nọrọnụlọ, ụmụṅwaanyị na-ere ọka na ọpapa, a na-agbagbusi ha."
"Ndị nile na-eme ihe ndị a mara na ọ bụghị Nnamdi Kanu ka ha na-eme ya, mmụọ dị n'ala Igbo ka ha na-emesi ike."
O kwukwara sị, "Ọ sịrị m, 'ọ bụ etu a ka ndị igbo ga-esi abụrụ otu?'"
Eze Chukwuemeka, onye kwuru na ọ bụ Kanu kpọrọ oku ka ya bịa hụ ya n'Abuja, gbara ama sị, " Ọ sịri na ọ bụrụ na ihe nile a kwụsị, ahụ ya adị ga mma, nsogbu nile adị mma, ya apụta."
Ọ kwukwara na Kanu kwuru na ihe ọ chọrọ n'aka ụmụafọ Igbo bụ ekpere ha, na ọ bụghị tigbuo-zọgbuo.
Kanu sị na bụ ndị ekperima ji aha ya ezu ohi,atọrọ ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ- Ifeanyi Uba
N'otu aka ahụ, Senetọ Ifeanyị Ụba kwuru sị, " Ozi Nnamdi Kanu ziri m zie ndị Igbo taa bụ abalị atọ nke Ọnwa Ọgọstụ nke afọ 2023 nke ọ sị mụ na Igwe nọkọọ zie ndị mmadụ ozi."
"Ka ndị na-anụrụ m okwu gwaa ndị Igbo nile na nọrọụlọ kwa Monde na-emebisi ihe n'ala Igbo. Ndị Igbo gawa ahịa."
Ubah, onye kwuru na ọ bụ ụmụnne Kanu bụ ndị haziri ọgbakọ ya na Kanu gara n'ihu kwuo na Kanu gwara ya, na "ọ bụ ndị ekperima ji aha ya ezu ohi na atọrọ ndị mmadụ".
Ha zutere Nnamdi Kanu n'ezie- Okaiwu Ifeanyi Ejiofor
Okaiwu Kanu bụ Ifeanyị Ejiofor gbakwara akaebe na mmadụ abụọ ndị a gara hụ Kanu n'ozi o wepụtara n'akara ya n'ọbaozi Facebook ụbọchị Fraide.
Ọ sịrị, "Eze Chukwuemeka Eri, Eze Akajiovo Igbo Nile, Ezeora XXXIV nke Aguleri, na Senetọ Ifeanyi Uba gara taa leta Mazi Nnamdi Kanu n'isiụlọọrụ 'State Security Service' (SSS) dị n' Abuja ebe e ji Kanu ugbua."
"Oge ha hụrụ, o kwukwara kwusie ike ma katọọ nọrọnụlọ na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ, sị na ndị na-amanye ya na steeti nile dị n'Ọwụwa Anyanwụ bụ ndị iro ndị be anyị."
Cheta na onye ndu otu alaka Ipob kpọrọ onwe ha 'Autopilot' bụ Simon Ekpa tinyere nọrọnụlọ izuụka abụọ n'Ọwụwa Anyanwụ nakwa na Monde ọbụla n'izuụka were akpo oku ka a tọhapụ Kanu.
A gbagbuola ọtụtụ ndị mmadụ, tọọrọ ụfọdụ ma mebie ngwahịa dara nde kwuru nde naira dịka ndị ji egbe na-amanye ndị mmadu nọrọ n'ụlọ ụbọchịn'Ọwụị̀a Anyanwụ n'ihe ruru afọ abụọ.