You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mgbọtọ, mperete, ikporo na ihe olụndị dị iche iche na-akpọ nwagbọghọ n'ala Igbo
Agbọghọ bụ nwata nwaanyị tozuorola ihe e ji nwaanyị eme mana ọ lụbeghị di.
Ọtụtụ obodo dị iche iche n'ala Igbo nwere ihe ha na-akpọ nwagbọghọ dịka olundị ha siri dị.
Akụkọ a ga-eleba anya n'ihe ụfọdụ obodo ndị a na-akpọ 'nwagbọghọ' nakwa ihe mere ha jiri akpọ ya.
Ihe obodo ndị a na-akpọ nwata nwaanyị alubeghị di
Arochukwu: Arochukwu bụ otu n'ime obodo ndị dị n'Abia steeti, ihe gbasara omenala na-amasị ha nke ukwuu.
Dịka otu okenye Arochukwu bụ Santos Okereke gwara BBC Igbo na ndị Arochukwu na ihe ha na-akpọ agbọghọ bụ 'Mpetere'.
O kwuru "Mpetere pụtara nwagbọghọ mara mma."
"Mpetere dịka okwu e ji amanyere azụ asa, etu e si akpọ nwaaanyị mara mma 'asa'.
"Mpetere bụ azụ na-eji ugwu na ngala aga".
Owere: Ndị Owere na-akpọ agbọghọ, 'mgbọtọ' ya bụ onye na-agba ọtọ dịka Maazị Chigozie Nnabuihe na-akụzi asụsụ Igbo na Mahadum Lagos si kwuo.
Nnabuihe kwụrụ sị, "Ụmụ aghọghọ anaghị eyi akwa, ha na-eji jigida eyichi ahụ."
Oge gboo, nwata nwaanyị na-agbagide ọtọ ruo oge ọ lụrụ di.
Onịcha: Ndị Ọnịcha dị n'Anambra steeti na-akpọ ya 'okporo' maọbụ 'ikporo'.
Nnabuihe kọwara sị, "Ndị e ji olu ha dee Akwụkwọ Nso; ndị Obosi na ndị Ọnịcha na-akpo agbọghọ 'okporo'."
Ika: Ndị Ịka na Delta steeti na-agba ya 'okposho' (Ịka).
Ndị Enuanị na-akpo ya 'okpoho'.
"Ị gafee Osimiri Niger, ndị Enuanị na-akpo ya 'okpoho'.
Izzi/Ikwo : Dịka nwa afọ mpaghara ahụ bụ Chinyere Moses si kwuo, ndịIzzi dị n' Ebonyi steeti na-akpọ agbọghọ, 'nwangboko'.
Ọ bụghị naanị ha, ndị Ikwo na-akpọkwa agbọghọ 'nwamgboko'.
Ebonyi: Ndị Ebonyi steeti na-akpọ agbọghọ "ogeri''.
Dịka Nwabuihe si kwuo, "Ndị Ebonyị, mpaghara Afikpo, Ohafia na-akpọ nwagbọghọ 'Ogeri'."