Ezinaụlọ Chinyere Awuda asaala ndịuweojii n'okwu ihe ha sị gburu nwa ha

Ndị ezinaụlọ Chinyere Awuda, nwaada a hụrụ ozi ya n'ọdọmmiri dị n'ụlọnkwarị Coosmila Hotel dị n'Anambra steeti agbaghaala nchọpụta nke ndị uweojii mere n'isi nwa ha.

Ezinaụlọ ahụ bụ na-arụtụ aka etu ndị uweojii si mee nnyocha ha ngwangwa na ngwangwa na-ekwusị ike na ọnwụ nwa ha agbaghị aka dịka ha kpọrọ oku ka ndị uweojii gbaa n'anwụ ihe onyonyo a hụrụ n' igwe onyonyo 'CCTV nke ụlọ nkwarị ụbọchị ọdachi mere.

Ndị uweojii Anambara steeti nọrọ ụbọchị fraide(28/7/2023) kwuo na nnyocha ha mere gosiri na nwaada ahụrụ ozu ya n'ọdọmmiri ụlọnkwarị dị nOka, isiobodo Anambara steeti na nsonso a bụ mmiri riri ya, na ọ bụghị ntigbu ka e tigburu.

Mana ezinasụlọ ya site n'ozi ọkaiwu ha bụ Okaiwu Eziafa Charisma Enwedo wepụtara na mgbede Fraide kwuru sị , "Akwụkwọ nnyocha ozu kwuru na ọ bụ mmiri riri Chinyere Awuda n'ọdọmmiri a gbahapụrụ agbaghapụ."

"Nke a ebighị okwu etu e si gbuo Nwaada Chinyere Awuda dịka anyị dị njikere iso okwu a gaa n'ihu."

"Anyị chọrọ ka ndị uweojii Naijiria , ngalaba nke Ọka wepụtara ọha iiheonyonyo ha ji nke gosiri dimkpa bụ nchị a na-enyo so na ndị chụkpuru Chinyere n'ọdọmmiri ahụ."

Ha gara n'ihu jụọ ajụjụ nkọwa apa a hụrụ n'akaekpe Chinyere maọbụmmiri mmiri riri ya nyere ya apa n'aka.

Ma jụkwa ihe mere na onye chụkpuru ya n'ọdọmmiri ahụ akpọghị oku ka a gbatara ya ọsọ enyemaka.

N'abalị 17 nke ọnwa Julai afọ 2023, a hụrụ ozu Nwaada Chinyere Awuda n'ọdọmmiri a naghị egwu egwu dị n'ogige ụlọnkwarị Cosmila Hotel dị n'Ọka.

Akụkọ fegharịrị na soshal midia kwuru na e tigburu Chinyere tụnye ozu ya n'ọdọmmiri maka ịtụtụ ego a na-efe otrtu ọgaranya na-eme mmemme n'ụlọakụ ahụ n'abalị foro ụbọchị a hụrụ ozu ya.

Ihe 'autọpsy'gosiri maka nwaada a hụru ozu ya na 'swimming pool' - Ndị uweojii Anambra

Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na nnyocha ha mere gosiri na ọ bụghị ntigbu ka e tigburu nwaada ahụrụ ozu ya n'ọdọmmiri ụlọnkwarị dị nOka, isiobodo Anambara steeti na nsonso a.

Akụkọ fegharịrị na sohal midia boro ebubo na otu ọgaranya na-abịakarị na ụlọnkwari ahụ na ndị enyi ya tigburu Nwaada Awuda maka ịtụtụ ego ndị enyị ya bọrọ ya, tunye ozu ya n'ọdọmmiri.

Mana ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ha nwụchiri nwoke ahụ mere mmemme n'ụlọnkwarị ahụ ma buga ozu nwaada ahụ ụlọọgwụ maka nnyocha bụ ebe ha cjhhọpụtara na ọ bụ mmiri riri ya.

Ozi nke ọnụ na-ekwuru bụ Tochukwu Ikenka binyere aka ma wepụta ụbọchị Fraide kwuru sị, "Nnyọcha ozu gosiri na ihe gburu ya bụ na mmiri riri ya."

" Ọ bụghị ntigbu ka e tigburu ya dịka ọkachaamara n'inyocha ozu kwuru na o nweghị ihe dị ya n'ahụ gosiri na a kpụgburu ya akụgbu."

"Ọ dịka ọ danyere na ọdọmmiri ahụ mmiri rie ya."

Nkwupụta ndị uweojii na-abịa abalị ole na ole nna nwada ahụ boro ebubo na ndị uweojii na-achọ ikpuchi ihe mere n'okwu ahụ, dịka ụlọntakụkọ Punchi si kwuo.

Nna nwata ahụ bụ Patrick site n'ọnụ ọkaiwu ya gwara Punch sị, "Onye uweoji na-enyochga okwu ahụ(the investigating Police officer) na B Division, ndị a na-enyo n'aka ha dị na ya bụ ihe na ndị nwe ụlọnkwarị ahụ na-arịọ ezzinaụlọ nwa ha nwụrụ ka ekpezie okwu ahụ tupu ndị uweojii emechaa nchọpụta ha."

Ihe anyị ma maka Chinyere Awuda a sị e tigburu, tufuo ozu ya na 'Swimming pool' ụlọnkwari n'Anambra steeti

Gọọmentị Anambara steeeti agbachiela ụlọnkwarị, Cosmila Hotel & Suite dị n'Ọka Anambara steeti n'ihi ọnwụ otu nwaada gara n'ụlọnkwari ahụ.

Akụkọ fegharịrị na soshal midia na-ebo ebubo na e tigburu nwaada a kpọrọ Chinyere Awuda a na-etu "Chizzy," onye Nnobi Anambara steeti, tufuo ozu ya n'ọdọmmiri ''swimming pool' ụlọnkwarị 'Cosmila Hotel &Suites', Ụbọchịụka.

Akụkọ ahụ kwukwara na a hụrụ ka otu onye anyị achọghị ịkpọ aha ya na ndị enyi ya na-eti nwaada ahụ ihe na klụb dị n'ụlọ nkwari ahụ n'abalị foro Ụbọchịụka bụ ụbọchị a hụrụ ozu ya dịka o sere n'elu ọdọmmiri ụlọnkwarị ahụ.

Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ n'ụtụtụ Tozde dịka akụkọ ahụ na-akpọtụ kwuru na e kweghị ya banye ogige ụlọnkwarị ahụ nke a na-ekwe ya ese foto.

Mana n'ehihie, kọmishona na-ahụ maka njem nlegharịa anya na steeti ahụ bụ Don Onyenji na ndị otu ọrụ ya wuchiri n'ụlọnkwari ahụ.

Onyenji, onye gosiri obi mwute n'ihe mere kwuru na a ga-agbachi ụlọnkwarị ahụ ganye na ndị uweojii emecha nnyocha ha.

N'otu aka ahụ, ndị uweojiii Anambara steeti ekwuola na ha na-enyocha ọnọdụ nwaada ahụ ozu ya si nwụọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo n'ekwentị na ha ma maka akụkọ ahụ.

O kwukwara na ha na-eme nnyocha banyere ya.

"Eeh, anyị ma maka ya. Anyị na-eme nnyocha maka ya."