Nnamdi Kanu: Ịhe ọkaiwu Kanu kwuru dịka ụlọikpe nyere DSS iwu ka ha nye ohere ịhụ dọkịta

Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja enyela ndị uweojii nzuzo Naijiria iwu ka ha nye onye ndu otu Indigenous People of Biafra(ipob) bụ Nnamdi Kanu ohere ịhụ dọkịta ọbụla masịrị ya n'ihi nsogbu ntị.

Cheta na n'ọnwa Eprelụ afọ a, ndị ọkaiwu tiri mkpu n'ụlọikpe na-arịọ ka DSS nye Kanu ohere ilekọta ahụike ya bụ nke ha sịrị dịzị oke njọ n'ihi nsogbu ntị nke ọ dị mkpa ka awa ya ahụ.

Jọstịs Binta Nyako , onye kụpụrụ n'akụkụ ọjụjụ DSS jụrụ , kwuru na Kanu nwere ikike inweta nlekọta ahụike dịka ọ nọ na mkpọrọ.

O nyekwara DSS iwu ka enye Kanu akwụkwọ nile metụtara ahụike ya kemgbe ha jichiri ya.

N'okwu ya dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, ọkaiwu Kanu bụ Mike Ozekhome gosiri obi ụtọ ya na ntuziaka ahụ.

" Ọkaikpe sị ka enye Nnamdi Kanu ohere ịhụ dọkịta masịrị ya."

" Ọ sịkwara na ndị dọkịta ya kwesịrị ịnọ oge ọbụla DSS chọrọ inyocha ya maọbụ nye ya nlekọta ọbụlaa , ma dekọọ ihe gara."

" Kemgbe ka anyị degaara DSS akwụkwọ ugboro abụọ jị arịọ ha ka ha nye Kanu ohere ịga waa ntị n'ihi nsogbu ntị ya na- akawanye njọ, ha egeghị ntị."

Ọ gara n'ihu kwuo na obi adịghị Kanu mma maka nọrọnụlọ n'aga n'Ọwụwa Anyanwụ.

" Ọ sịrị m na ọ bụrụ na atọhapụ ya, na ya ga-enwe ohere gwa ndị ntaakụkọ okwu ji kwuo na ya akwadoghị ya n'ihi na ọ na-akụda akụnaụba Ọwụwa Anyanwụ."

Cheta na e jichiri Kanu na mkpọrọ DSS kemgbe abalị 27, ọnwa Juun afọ 2021 bụ mgbe e si mba Kenya kụlata ya ma kpọpụ ya ụlọikpe maka ebubo metụtara iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria.