Ministerial List: Tinubu emeela Wike Minista maka Abuja, Keyamo Minista njem ụgboelu,Uche Nnaji Sayensị na teknụzụ

Onyeisiala Bola Tịnubu enyela ndị ọ họpụtara dịka Minista ọkwa ha, dịka ọnụ na-ekwuru ya bụ Ajuri Ngelale si gbaa ama n'ụbọchị Wenezde.

O nyere aka chịburu Rivas Steeti bụ Nyesom Wike, Minista na-ahụ maka Abuja; Festus Keyamiọ bụ Minista njem ụgbọelu, ebe Uche nnaji bụ Mịnịsta na-ahụ maka Sayensị na Teknuzu.

Aka chịburu Ebonyi steeti bụ Dave Umahi bụ Minista na-ahụ maka ọrụ, ebe Uju Kennedy bụ naanị nwaanyị zọrọ ikike inweta ọkọlọtọ APC maka ọkwa onyeisiala nwetara ọkwa Mị̄nịsta na-ahụ maka ụmụnwaanyị.

Aka chịburu Zamfara bụ Bello Matawalle nwetara ọkwa Mịnista nta na-ahụ maka nchekwa.

Ọkwa ndị ọzọ gụnyere:

  • Nkeiru Onyejeọcha: Mịnista na-ahụ maka ọrụ
  • Doris Anite: Minista na-ah ụ maka ụlọọụmmepụta ngwahịa, na azụmahịa
  • Wale Edun: Minista na-ahụ maka akụnaụba
  • Bosun Tijanu:"Minista na-ahụ maka nzirite ozi na teknụzụ intanet
  • Ishak Salako: Minista nta na-ahụ maka gburugburu.
  • Adegboyega Oyetola: Minista na-ahụ maka njem
  • Tunji Alausa: Minista nta na-ahụ maka ahuike
  • Dele Alake- Minista na-ahụ maka ọnatarachi dị n'ime ala
  • Adebayo Adelabu: Mịnista maka nahụ maka ọkụ
  • Ekperikpe Ekpo: Minista Nta na-ahụ maka Gaasi
  • Lola Ade-John: Minista na-ahụ maka njem Nlegharịanya,
  • John Enoh : Minista na-ahụ maka egwuregwu
  • Abubakar Momoh: Minista na-ahụ maka ndị ntorobia
  • Mohammed Badaru: Mịnista na-ahụ maka nchekwa
  • Yusuf T. Sunumu: Minista nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ
  • Ahmed M. Dangiwa: Mịnista na-ahụ maka ewumewu ụlọ na nhazi ebe mepere emepe
  • Abdullah T. Gwarzo:Mịnista nta na-ahụ maka ewumewu ụlọ na nhazi ebe mepere emepe
  • Atiku Bagudu: Minista na-ahụ maka bọjet
  • Abubakar Kyari : Minista na-ahụ maka ọrụụgbo
  • Yusuf M. Tuggar : Minista na-ahụ maka mmekọrịta Naijira na mba ndị ọzọ
  • Ali Pate: Minista na-achịkọta Ministri ahụike na nlekọta ọdịmma ndị mmadụ
  • Ibrahim Geidam: Minista na-ahụ maka okwu metụtara ndị uweojii
  • Betty Edu: Minista na-ahụ maka okwu metụtara ọnọdụ gbagbata na mbeleta ụbịam
  • Muhammed Idris: Minista na-ahụ maka mgbasaozi
  • Lateef Fagbemi: Minista na-ahụ maka ikpe/OKaiwu Ukwu Naijiria
  • Joseph Utsev: Minista na-ahụ maka mmiri
  • Heineken Lokpobiri: Minista nke nta na-ahị maka mmanụ agbịdị
  • Hannatu Musawa: Mịnista na-ahụ maka nka na omenala

Cheta na Onyeisiala Bola Tinubu zigaburu Ụlọomeiwu Ukwu aha ndịọ họpụtara ga-eso ya arụ ọrụ dịka minista na izu ole na ole gara aga.

Ihe mere ndị ụlọomeiwu ebinyebeghi aka n'elu aha El-Rufai na mmadụ abụọ ọzọ

Ụlọomeiwu Naijiriịa enyochaala ma nabata aha mmadụ 45 n’ime 48 ndị onyeisiala Bola Tinubu họpụtara ịbụ minista.

Nke a so n'ihe ha mere n'ọgbakọ ha n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọgọọstụ 2023.

Onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Godswill Akpabio ebinyebeghi aka n’elu aha mmadụ atọ fọrọ afọ n’ihi mpụtara nnyocha metụtara nchekwa nọ n’aha ha agwụchabeghi.

Mmadụ atọ ndị a bụ aka chibụrụ Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai, Stella Okotete nke Delta Steeti na Abubakar Danladi nke Taraba Steeti.

E mere nbinyeaka nakwa nabata ndị a a họpụtara dịka enyochachara ha.

Mana mkpọtụ dapụtara oge amalitere inyocha aha Festus Keyamo nke mere ụlọomeiwu jiri kpọchie ụzọ ha ma ghara ịgbazi ọgbakọ ahụ n’anwụ.

Mkpọtụ a dapụtara oge Darlington Nwokocha bụ onye omeiowu na-anọchịte mpaghara Abia Central Senatorial District ji iwe kwuo na Keyamo kparịrị ndị ụlọomeiwu a nke agba ọchịchị itoolu n’oge nke Buhari ma boo ya ebubo nrụrụaka.

O kwuru na a kpọbuola Keyamo oku ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ihu ụlọọmeiwu ajhụ maka okwu otu ọrụ (Special Public Works programme) e nyere ministri ya oge ahụ ka ọ rụọ mana o kweghị bịa zaa oku a kpọrọ ya .

Ozi pụtara na e mechara nabata aha ya Keyamo.

Ka ọ dị ugbua, ihe a na-ache ugbua bụ ka onyeisiala kenye ndị a ahọpụtara ministri ha ga-arụ ọrụ n’ime ya.

Ọtụtụ okwu adapụtala kemgbe a malitere nhọpụta ndị minista nke oge ọchịchị a dịka mgbe ọtụtụ mkpọtụ dapụtara na Twitter maka nhọpụta Bosun Tijani dịka onye minista.

Ihe mere Bosun Tijani jiri rịọ mgbaghara maka ozi megide Tinubu o wepụtara na Twitter n'afọ 2019

Otu n'ime ndị Onyeisiala Bola Tinubu họpụtara ga-arụrụ ya ọrụ dịka minista bụ Bosun Tijani arịọla mgbaghara maka okwu o kwugidere Tinubu n' ọbaozi Twitter n'afọ 2019.

Tijani mere nke a dịka ọ gara nnyocha nke Ụlọọmeiwu Ukwu na-eme ndị Tinubu họrọ maka ibinye aka na nhọpụta ha n'ụbọchị Satode.

Ọ sịrị, "Ndị omeiwu Ukwu, nabatanụ arịrịọ mgbaghara m, agafere m oke."

"Ihe nile m kwuru , sị gbaghara m."

"Emere m nke a n'ihi mkpasu iwe."

Ozi Tijani wepụtara a Twitter n'abalị 29 nke ọnwa Julai afọ 2019 malitere wuwe na soshal midia dịka ọ pụtara ihe na aha ya so na ndị a ga-eme minista.

N'ozi ahụ , Tijani kwuru sị, " Ọ ghọwala omenala . Tinubu na-afanye ụnụ n'ọnụ akụkọ nkọgheri sitere na amamihe ya." Gaanụ ga tinye oge na ego ụnụ n'ihe bara uru ma ọ bụrụ na ụnụ chọrọ ị na-akọ ụdị akụkọ nkọgheri a."

Onyeisiụlọomeiwu ukwu bụ Godswill Akpabio nabatara mgbaghara ọ rịọrọ ma sị ya hụlata na nkwanye ugwu gawa n'ihu.

Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka Bosun Tijani

Ya bu ihe mụnyere ọkụ na Twitter, dịka ụfọdụ na-eto ya, ebe ụfọdụ na akatọ ya maka ịbụpụcha asọ, were ire ya racharakwa ya.

@dipoaina kwuru na ọ kwesịghị ka e nye ya ọkwa mịnista, ya gaa na mba ọzọ ọ hụrụ na ya bụrụ mịnịsta.

@Yawehs_Elect sịrị na Tijani gosiri na ọ bụ onye ekwesịghị ntụkwasiobi dịka ọ gwachara ndị n'ọchịchị eziokwu laghachi azụ n'okwu ya ka ọ hụrụ ohere.inweta ọkwa.

Ihe i kwesịrị ịma maka Bosun Tijani

Tijani so na onye hiwere ụlọmmụta teknuzụ a na-akpọ C0 Creation Hub (CChub) dị na Legọs.

Nwa amadia gbara afọ 46 gara akwụkwọ na mahadum 'University of Jos'>

Nwa afọ Ogun steeti ahụ gakwara akwụkwọ na mahadum ' University of Leicester," dị na mba Briten.

Tinubu tinyere aha Keyamo, wepụ Shetty

N'ụbọchị Fraịde, Onyeisiala Bola Tinubu ewepụla aha otu n'ime ndị ọ họpụtaburu maka ọkwa Mịnịsta tinye mmadụ abụọ ndị ọzọ.

O wepụrụ aha Mary Shetty sonyere n'otu 'Presidential Campaign' onyeisiala tinye Festus Keyamo bụbụ Minista nta nke ọrụ na Mariga Mahmoud bụbụ Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Kano steeti.

Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naijria bụ Godswill Akpabio bụ onye gbara nke a n'anwụ n'ụbọchị Fraide oge ọ gụpụtara akwụkwọozi onyeisiala detara ndị omeiwu.

Shetty, onye Kano steeti abịalarị n'Ụlọomeiwu n'ụtụtụ Fraide maka nnyocha ndị a họpụpatara maka ọkwa mịnịsta oge o nwetara ozi na e wepụla aha ya.

O webeghị anya ihe mere e ji wepụ aha nwaada ahụ gbara gbara afọ 44 bụ dọkịta na-ahụ maka mmerụahụ(physiotherapist) mabụrụkwa onye na-enyere ndị nọ na mkpa aka.

Tinubu ewepụtala Oyetola, Lalong, Bagudu, Geidam na Matawalle na ndị ọhụrụ ọzọ dịka minista

Onyeisiala Naijiria bụ Bola Ahmed Tinubu ewepụtala aha mmadụ 19 ọhụrụ ọzọ dịka ndị ọ họpụtara ga-eso ya arụ ọrụ dịka ndị mịnista.

Onyeisi ọrụ ya bụ Femi Gbajabiamila bụ onye wegara Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria akwụkwọ bu aha ndị a gụnyere ndị bụbu gọvanọ mmadụ ise n'ehihie Wenezde.

Ha gụnyere aka chịburu Osun steeti bụ Adegboyega Oyetola; nke chịburu Kebbi steeti bụ Atiku Bagudu; nke chiburu Zamfara steeti bụ Bello Matawalle; ogbo ya nke Yobe bụ Ibrahim Geidam na nke chịburu Platu steeti bụ Simon Bako Lalong.

Ndị a ga-eme ya ndị bụbu gọvanọ mmadụ itoolu ga-enweta ọkwa Minista.

Ndị ọzọ a họpụtara ọhụrụ bụ bụ Ahmed Tijjani; Bosun Tijjani; Dr Maryam Shetti; Ishak Salako

Tunji Alausa; Tanko Sununu na Lola Adejo; Shuaibu Abubakar; Tahir Mamman; Aliyu Sabi,Alkali Ahmed; Heineken Lokpobiri na Uba Maigari.

Ndị Ụlọomeiwu Ukwu ga-eme ndị ọhụrụ a ga-eweta ọnụọgụgụ ndị minista Tinubu họpụtarala mmadụ 47, nnyocha ma binye aka na nhọpụta ha n'ụbọchị Fraide, abalị anọ nke ọnwa Ọgọstu, afọ 2023.

Ụlọomeiwu amalitela nnyocha ndị Onyeisiala Tinubu hopụtara maka ọkwa minista

Ndị ụlọomeiwu amalitela nnyocha ndị Onyeisiala Tinubu họpụtara maka ọkwa minista. Ndị Sineti si na ha ga-enyo ụfọdụ n'ụbọchị Monde ma mecha ndị ọzọ mgbe ọzọ.

Lee ihe Nyesom Wike kwuru dịka ndị ụlọomeiwu ukwu nyochara ya n'ehihie taa maka ọkwa Mịnịsta dịka ndị ọzọ:

Wike,Umahi, El-Rufai Onyejiocha na ndị ọzọ aha ha dị n'akwụkwọ ndị a ga-eme minista

Ụfọdụ ndị bụbu gọvanọ n'ọchịchị Muhammadu Buhari mmadụ anọ so na ndị aha ha dị na ndị Onyeisiala Bola Tinubu họpụtara dịka ndị ga-abụ ndị imeobi ọchịchị ya.

Aka chịburu Ebonyi steeti bu David Umahi, nke chịburu Rivas steeti bụ Nyesom Wike,ogbo ya nke Kaduna steeti bụ Nasir el-Rufai na nke Jigawa steeti bụ Abubakar Badaru so n' aha mmadụ 28 Onyeisiala Bola Tinubu zigara Ụlọomeiwu Ukwu maka nnyocha na ibinye aka dịka ndị Minista n'ụbọchị Tọzde.

Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria bụ Godswill Akpabio kpọpụtara aha ndị a n'ụbọchị Tọzde dịka Onyeisi ọrụ Onyeisiala Naijiria(Chief of Staff) bụ Femi Gbajabiamila wetara ya akwụkwọ ozi n'Ụlọomeiwu Ukwu

Mkpọpụta a na-abịa ka ọ fọrọ naanị otu abalị ka ọ kụrụ ọnụ n' abalị 60( abalị 28 nke ọnwa Julai ) site n'ụbọchị e duru ya n'iyi ọrụ bụ ohere iwu Naijiria nyere onyeisiala ịhọpụta ndị mịnịsta.

Ndị ọzọ a kpọpụtara gụnyere Nkiru Onyejiocha bụbụ oneiwu na-anọchite Isuikwato/Umunneochi n'Ụlọnnọchiteanya; Uche Nnaji,onye fere ọkolọtọ otu APC n'ọkwa gọvanọ Enugwu steeti na Ntuliaka 2023; Dr. Diris Anite Uzoka, Kọmishọna Imo steeti na-ahụ maka ego n'Ọchịchị Hope Uzodimma; Hannatu Musawa, onye ọkaiwu; Betta Edu, bụbu Kọmishona ahụike na Krọs Rivas.

Ndị ọzọ aha ha dị n'akwụkwọ ahụ gụnyere : Abubakar Momoh; Yusuf Maitama Tukur; Ahmad Dangiwa; na Olubunmi Ojo, omeiwu na-anọịchite Akoko North East/‎Akoko North n'ụlọomeiwu Nta kemgbe afọ 2019.

Ndị ọzọ bụ:

Uju Kennedy Ohanenye: Onye ojiegoachụego, Ohanenye bụ nanị nwaanyị pụtara zọọ ikike ife ọkọlọtọ APC n'ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023.

Stella Okotete: O so na ndị ndu ụmụnwaanyị APC

Bello Muhammad Goronyo: Odeakwụkwọ APC na mpaghara 'North West'

Dele Alake- Bụbu Kọmishona mgbasaozi n'oge ọchịchị Bola Tinubu dịka gọvanọ Legọs steeti nakwa onye ndụmodu pụrụ iche na mgbasaozi dịka onyeisiala Naijiria

Ekperikpe Ekpo: Onye fere ọkọlọtọ APC maka ọkwa Senetọ na-anọchite bụbụ omeiwu na-anọchite Abak/Etim Ekpo/Ika n'Ụlọomeiwu Nta

Lateef Fagbemi: Bu onye ọkaiwu nwere agba(SAN)

Mohammad Idris: Bubụ onye omeiwu na-anọchite Gwadabawa-North dị na Sokoto steeti n'Ụlọomeiwu Nta.

Olawale Edun: Bụbu Komishona na-ahụ maka ego na Legọs steeti oge Tinubu bụ gọvanọ bụ onye ndụmọdụ ya pụrụ iche n'ihe gbasara ego(monetary policies) dịka Onyeisiala Naijiria

Waheed Adebanwo

Emman Suleman Ibrahim: Bụbu onyeisi ụlọọrụ na-ebu agha megide ịgba mgbere mmadụ'National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons, NAPTIP'(2020-2021)

Ali Pate- Bụbụ Minista ahụike nta n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan

Joseph Usev:

Abubakar Kyari: Bụbu Senetọ na-anọchite Borno North n'Ụlọomeiwu Ukwu

John Enoh: Bụbu Senatọ na-achọchite Cross River Central n'Ụlọoemiwu Ukwu

Sani Abubakar Danladi: Bụbu Osote Gọvanọ Taraba steeti oge Danbaba Suntai bụ gọvanọ steeti ahụ