You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe ndị na-azụ ahịa n'Ogbete 'main market' kwuru banyere Ọgbaghara dapụtara ebe ahụ
Ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n'Ogbete akọwaala ihe mere n'ọgbaghara dapụtara ebe ahụ na Wenezde 26 Julaị 2023 n'ihi ngagharịiwe mgbachi ụlọahịa
Ha kwuru na ọ bụ nghọtahie dapụtara n'etiti ụfọdụ ndị a gbachiri ụlọahịa na ndịisi ahịa ahụ butere ngagharịiwe.
Otu nwoke sị na onyeisi ahịa gwara ndị a ka ha kwụsị ịkụka ụlọahịa gọọmentị gbachiri, kama ka ha bịa tinye akwụkwọ maka ohere iji gbapee ụlọahịa ha.
Na ọ bụ ihe were ụfọdụ ndị a iwe nke mere ha jiri malite ngagharịiwe.
Otu nwoke ọzọ kwuru na ihe gọọmentị gaara ime bụ ikpọkọta ndị na-azụ ahịa ka ha nwee mkparịtaụka banyere imepe ụlọahịa ha n'ụbọchị Mọnde.
O gbakwụnyere na ha kwesịrị itinye ezi nchekwa n'ụbọchị Mọnde a na-eme 'sit at home' ka ndị mmadụ nwee ike ịpụta bịa zụọ ahịa.
Ihe malitere ngagharịiwe n'ahịa Ogbete
Ngagharịiwe a bụ maka mgbachi gọọmentị steeti ahụ gbachiri ụlọahịa ha kamgbe ụbọchị Mọnde 24 Julaị.
Gọọmentị gbachiri ụlọahịa ụfọdụ ndị mmadụ maka na ha rubereisi n'iwu ịnọ n'ụlọ na-ekweghi agbape ahịa ha n'ụbọchị Mọnde.
Cheta na gọvanọ Peter Mbah nyere iwu dịka ọ banyere n'ọchịchị sị ka a kwụsị ịnọ n'ụlọ ma sị a ga-agbachi ụlọahịa, ụlọọrụ ndị mere nke a.
Ụfọdụ ndị nke a metụtara malitere ime ngagharịiwe na-akpọ oku ka gọọmentị gbapee ụlọ ahịa na o nweghi ihe ọjọọ ọbụla ha mere.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ahịa Ogbete kwuru na ndị a agbachiri ụlọahịa ha rutere n'ụtụtụ Wenezde ma malite ịkụkasị igodo e jiri gbachie ụlọahịa ha.
Onyeisi ndị ahịa 'Ogbette main market traders association (OMMTA)' bụ Maazị Aniagu gwara ha ka ha kwụsị ime nke, na gọọmentị gwara ha bịa mee nyocha tupu e mepee ụlọahịa ha.
Ha malitere na-eme ngagharịiwe nke mere ọgbaghara jiri dapụta n'ahịa Ogbete ahụ.
Mgbe ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii, ndịagha nakwa ndị ọzọ wuchiri ebe ahụ ha malitere ịgba egbe ka mgbọ tụrụ otu nwaokoroọbịa bụ e mechara kwuo na ọ nwụọla.
Ndị mmadụ nọ n'ahịa malitere ịgbaọsọ aghara aghara
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ Daniel Ndukwe kwuru na ọ bụ eziokwu na ọgbaghara dapụtara n'Ogbete kama na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gara ebe ahụ ime ka udo chịa.
O kwuru na o enweghi ozi ọbụla banyere onye a sị na a gbagburu n'Ogbete ebe ahụ ha natara.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ihu kwuo na a gbachiela ahịa Ogbete niile ugbua na ụgbọala 'armoured tank' ndị ọrụ nchekwa kwụchịm n'ahịa ahụ ugbua
Ahịa Ogbete bụ nnukwu ahịa a ma ama dị n'okpuruọchịchị Enugwu North.
Ọ bụ ya bụ ahịa kachasị ibe bụ ebe a na-ere ọtụtụ ihe dị iche iche na steeti ahụ.
Ihe gọọmenti Enugwu kwuru
BBC Igbo kpọtụụrụ gọọmentị Enugwu steeti site n'aka ọnụ na-ekwuru ha bụ Uche Anichukwu.
O kwuru na ọ gaghị azanwu oku mgbe ahụ kama sị ka e zitere ya ozi n'ekwentị.
Mana ọ zabeghi ozi e zigaara ya tupu akụkọ apụta.
Mana odeakwụkwọ Gọọmentị Enugwu steeti bụ Chidiebere Onyia site n’akwụkwo ozi o wepụtara nke ụlọọrụ Channels TV gosiri na kwuru na “ndị a mere ngagharịiwe dara iwu gọọmenti nyere maka usoro iji agbapegharị ụlọahịa ha.”
Ọ bụ nke a butere ọgbaghara n’etiti ndịisi ahịa ahụ na ụfọdụ ndị a gbachiri ụlọahịa ha.
Onyia gara n’ihu kwuo na gọọmenti na-eme nyocha banyere etu ihe niile si mee, tinyere onye a sị na a gbara egbe.
Gọọmentị gara n’ihu kpọọ oku ka udo chịa, ka ndị Enugwu steeti dere jụụ ma na-aga mkpa dịịrị ha dịka ha ga-ewete ezi nchekwa ndụ na akụnaụba.