Ihe mere m ji akwado Yahaya Bello maka ọkwa Onyeisiala 2023 - Ralph Uwazurike

Ralph Uwazurike akọwaala ihe mere o ji akwado Gọvanọ Kogi State bụ Yahaya Bello maka ịbụ Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.

Cheta na Uwazurike na ndị otu ya mere ngagharị nkwado n'Owere n'izuụka gara aga, iji kpọọ oku ka ndị mmadụ nye Yahaya Bello nkwado.

Uwazurike kwuru na ọ bụ ya na ndị otu 'Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra' mere ngagharị ahụ, mana ndị MASSOB agọlahụla Uwazurike.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Ralph Uwazurike kwuru na ọ bụ "onye rịọrọ m ọrụ ka m ga-arụrụ ọrụ".

"O nwebeghị onye Igbo ọbụla bịara kọtara m na ọ na-apụta ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa."

"Onwebeghị onye n'ime ha kpọrọ m n'ekwentị, maọbụ zite mmadụ ka ha bịa kọtara m."

"Mana anọ m n'ụlọ m Yahaya Bello a kpọrọ ọtụtụ ndị mmadụ bịa be m na-arịọ m ka m kwado ya dịka ọ na-apụta ịzọ ọkwa onyeisiala."

Ihe Yahaya Bello ji bụrụ onye kacha tozuo oke

Uwazurike kwuru na ọ bụghị ebe onyeisiala Naịjirịa si pụta dị mkpa, kama ihe ka mkpa bụ onye ga-arụta ya bụ ọrụ nke ọma.

"Ikwu na ọ ga-abụrịrị onye Igbo enweghị isi, ebe ọbụla o si, ihe anyị chọrọ bụ onye ga-achịta nke ọma."

"Ọ dịkwa mkpa ka e nye onye ntorobịa dịka Yahaya Bello ọchịchị, maka na ọ bụ ndị okenye mebiri Naịjirịa etu ọ dị ugbua."

"Yahaya Bello achịala Kogi steeti ugboro abụọ, ọ bụrụ na ọ naghị eme ọfụma, ndị be ha gaara ịchutu ya n'ọchịchị."

"Ndị ntorobịa ma na ha nwere ọdịnihu na Naịjirịa, ya mere na e nye ha ọchịchị, ha ga-eme nke ọma."

Etoruola m ịbụ onye a na-akwanyere ugwu n'ala Igbo

Ralph Uwazurike kwuru na ọ bụ ihe mwute na ndị Igbo anaghị akwanyere ya ugwu ruuru ya.

O kwuru na ya emeerela ndị Igbo ọtụtụ ihe kwesịrị ka a na-akwanyere ya ugwu.

"Ndị niile pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala onweghị onye tozuru oke karịa m," Uwazurike kwuru.

"Agaala m mkpọrọ ugboro ugboro maka ndị Igbo."

"Ọ bụ m bu ụzọ kwulite okwu 'Igbo Presidency'."

"Ọ bụ m bidoro otu Massob, ma bụrụkwa onyeisi ya ruo taa."

"Ndị a na-ekwu na ha achụpụla m bụ ụmụaka na-arịọ ego nri."

Ụwazụike abụghị onye Massaob nke Massob na-akwado ije ihere ọ na-ejere Yahaya Bello - MASSOB

Otu Massob wepụtara akwụkwọ ozi n'ụbọchị Mọnde, abalị abụọ nke ọnwa Mee ma katọọ etu Uwazurike si eji aha ha etinye n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.

"Anyị achụpụla Uwazurike na Massob kamgbe afọ 2015 n'ihi mpụ ."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: