Ihe ndị mmadụ na-ekwu dịka Nyesom Wike kwuru na ya ga-eso zọọ ọkwa Onyeisiala na 2023

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Aha Gọvanọ Nyesom Wike na-ewu ugbua na soshal midia Naịjirịa dịka o kwupụtara mmasị ya iso zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ dị mma etu Wike si tinye isi ya iso zọọ ya bụ ọkwa, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ gaghị achịta aja.

Toochukwu kwuru na ya ga-atụnyere Wike kama ịtụnyere Atiku maọbụ Tinubu, kama onye kacha bụrụ mmasị ya bụ Peter Obi.

Matt Bobmanuel kwuru na Wike nwere ihe niile iji bụrụ onyeisiala; ị chọọ udo o nye gị ya, ị chọọ aghara o nye gị ya.

Henry Chibuike Ugwu kwuru na ụdị mmadụ Wike ekwesịghị ịbụ Onyeisiala Naịjirịa.

Onye ọzọkwa kwuru na Wike bụ onye aka ike.

Ihe mere ejiri kpụrụ gọvanọ Rivas Steeti bụ Nyesom Wike n'ọnụ

Gọvanọ Rịvas Steetyi bụ Nyesom Wike ekwuputala na ọ ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala Naijirịa nke a ga-eme n'afọ 2023.

Ọ bụ na nzụkọ emere na Benue steeti nke ndị ọchịchị PDP n'ụbochị Sụnde ka o kwuru nkea.

Ọ bụ na nzụkọ a ka o kwuru sị " oruola mgbe a ga-asị ndị otu APC 'Ozuola' ọ bụ kwa nụ mụ onwe m nwereike ị gwa ha etu".

Wike kwuru na ike ọchịchị abụghị ihe a na-enye enye kama na ọ bụ ihe a na-anara anara.

O kwuru sị, "Unu erela ikike ntuliaka unu, unu nyem ya ka m wehachi ike n'aka otu Pati PDP".

Onye bụ Nyesom Wike?

Nyesom Wike bụ gọvanọ Rivas Steeti.

A mụrụ ya n'afọ 1963

Ọ bụ onye obodo Rumuepirikom nke dị n'okpuru ọchịchị Obio-Akpor nke Rives Steeti.

Wike bụbụ onyeisioche okpuru ọchịchi Obio-Akpor site n'afọ 1999 ruo afọ 2007.

Ọ bụkwa onyeisi ndị ọrụ (Chief of Staff) Chibuike Rotimi Amaechi oge ọ bụ gọvanọ Rivas Steeti

Wike rụkwara ọrụ dịka Mịnịsta nta na-elekọta agụmakwụkwọ na Naịjirịa n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan.

N'afọ 2015 ka Nyesom Wike zọrọ ma merie ọkwa Gọvanọ na Rivers steeti.

O merikwara ntuliaka nke ugboro abụ n'afọ 2019.