Ebute Metta building collapse update: "Ana m achọ Ugochukwu nwa m"

Otu nwaanyị a zọpụtara n'ụlọelu ogogo atọ dara na Legọs ekwuola na ọ ka na-achọ nwa ya nwoke n'ebe ahụ.
Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ha agbapụtala mmadụ 23 dị ndụ , ebe ha hụụla ozu mmadụ asatọ nnwụrụ n'ọdachị ahụ mere n'abalị ụbọchị ụka n'Ebute Metta na Legọs.
Nwa anyị ahụ a kpọrọ mama Ugochukwu' gwara onye ntaakụkọ BBC na a zọpụtara ya, di ya nakwa ụmụ ya abụọ ndị ọzọ mana o si ụlọọgwụ gbapụta ịchọ Ugochukwu bụ onye ọ hụbeghị anya kemgbe ụzọụtụtụ oge a gbapụtara ya mgbe ọ nụrụ kepukepu na o nwere nwa nwoke a zọpụtara.
Mana o ruru ebe ahụ ụlọ dara ọ bụghị nwa nke ya. Ọ ka nọ ebe akwa achọ nwa ya.
Di nwaanyị ahụ nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ maka oke ọbara ọgbara n'odachi ahụ.
Cheta na ụlọ ogogo atọ dara n'akụkụ Legọs steeti a kpọrọ Ebute Metta n'abalị ụbọchị ụka.
Dịka ụbọchị Monde na-agwụcha, mmadụ itoolu anwụọla, ebe a zọpụtara ihe karịrị mmadụ iri abụọ n'ọdachi ahụ mere n'abalị foro taa bụ nwa.

Ụlọọrụ gbatagbata bụ Nema ekwuola na ndị nwụrụ n'ụlọelu ogogo atọ dara na Legọs eruola mmadụ asatọ.
Ụlọ dara n'Ebute Metta dị na Legọs n'abalị ụbọchị ụka.
Onye nchịkọta Nema bụ Ibrahim Farinloye kwuru na "a hụrụ ozu ụmụnwoke abụọ ọzọ nke mere ya mmadụ asatọ".

Farinloye kwuburu na a hụla "mmadụ anọ gụnyere nwoke abụọ na nwaanyị abụọ gunyere otu agadi nwoke na otu nwaokorobịa a kpọrọ "Tahin" nke mere ndị nwụrụ mmadụ ise".

Otu nwaanyị azọpụtara n'ụlọ ahụ dara ada ekwuola na ọ ka na-achọ nwa ya nwoke n'ebe ahụ.
Aha nwa ahụ bụ Ugochukwu bụ naanị otu nwa nwoke nne ya mụrụ.
Ọ gwara onye ntaakụkọ BBC na azọpụtara ya, di ya nakwa ụmụ ya abụọ ndị ọzọ mana o si ụlọọgwụ gbapụta mgbe ọ nụrụ kepu kepu na o nwere nwa nwoke azọpụtara.
Mana o ruru ebe ahụ ọ bụghị nwa nke ya. Ọ ka nọ ebe akwa achọ nwa ya.

"A zọpụtala mmadụ 23 gụnyere ụmụaka asaa na ndị okenye 16.
Otu nwaanyị na nwa ya anwụọla n'ụlọ ogogo atọ dara na Legọs n'abalị Satọde

Ụlọọrụ gbatagbata nke steeti Legọs bụ Lagos State Emergency Management( LASEMA) na Bekee ekwuola na nwaanyị na nwa ya so na ndị nwụrụ n'ụlọ ogogo atọ dara n'Ebute Metta, Legọs n'abalị ụbọchịụka.
N'ozi nke onyeisi Lasema bụ Olufemi Oke-Osanyintolu, binyere aka , o kwuru na a gbapụtala mmadụ 23, ebe mmadụ abụọ nwụrụ anwụ.
Oke-Osanyintolu, kwuru na ọdachị ahụ mere n'ebe Elekere 10.56 nke abalị sịrị, "A mabeghị mmadụ ole tọrọ n'ụlọ ahụ dara mana a na-achọ ndị mmadụ n'okpoko na ọyọkọ ụlọ dara."
"Dịka o si kwụrụ n'Elekere 02:10 nke ụtụtụ a gbapụtala nwoke 22 na otu nwaanyị na ndụ, ebe otu nwoke na otu nwaanyị n'ozu."

Ọdịda ụlọ bụ ọdachị na-adakarị na Legọs steeti dịka ọtụtụ na-ada nkwa mgbe kwa mgbe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
N'ọnwa Febụwarị afọ 2022, ụlọelu ogogo atọ dara na mpaghara Onike dị na Yaba, Legọs.
N'ọnwa Novemba afọ 2021, mmadụ 45 nwụrụ n'ụlọ ogogo 21 dara n'Ikoyi dị Legọs.
Ndị ọkachamara na ndị ọrụ gọọmenti ọdị n'aka ekwuola ụgboro ugboro na nsogbu na-esite ndị inginịa rụ ha dịka ha na-eji akọrọngwa adịgboroja arụ ụfọdụ.
Ụlọ ọgọgọ atọ adaala na Legọs

Ebe foto si, LAGOS STATE fIRE SERVICE
Ụlọ ogogo atọ a adara n'abalị ụbọchị ụka na mpaghara Ibadan Street, dị n'Ebute Metta, Legọs.
Ụlọọrụ na emenyụ ọkụ na Legọs bụ 'Lagos State Fire and Rescue Service' bụ ndị gbara ama a n'ime abalị kwuru na ọrụ ịzọpụta ndị tọrọ ebe ahụ amalitela.
Ha kwuru na ha azọpụtala mmadụ 20 dị ndụ ebe abụọ merụrụ nnukwu ahụ, ebuga ha n'ụlọọgwụ 'Lagos State University Teaching Hospital' maka nleta.
Amabeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole ka tọrọ atọ n'ime ụlọ ahụ dara ada.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- Etu emume ụzọ iyi nke Uke n'Anambara steeti nke afọ 2022 si chakee
- Etu Chinedu Bernard, Chima Precious ndị ejije Nollywood si laa mụọ
- Ọrịa ise ị nwereike ibute maọbụrụ na gị na anụmanụ nwee aramara
- Yul Edochie second wife: 'Anyị gwara Yul alụla nwaanyị nke abụọ mana o kweghị' - Uche Edochie, nwanne Yul












