Etu gọọmentị Abia steeti si mechie 'Merry Home Hotel' ebe otu nwaanyị nwụrụ

Ebe foto si, Merry Home Hotel/Facebook
Gọọmentị Abịa steeti emechiela ụlọ ndina Merry Home Hotel dị n'Aba maka ebubo na mmadụ nwụrụ n'ime ya nakwa na ụfọdụ ndị mmadụ na-efu ebe ahụ.
Nke a na-abịa dịka a chọtara ozu otu nwaanyị a sị na ụfọdụ akụkụ ahụ ya anọghịzị, n'ụlọ ndina ahụ dị n'Ogbor Hill.
Ihe onyonyo CCTV dị n'ụlọ ndina ahụ gosiri n'ezie na nwaanyị ahụ ku nwa ma soro ụmụnwoke abụọ, ji ndụ ya banye ebe ahụ n'ụbọchị 15 nke ọnwa Epreelụ, mana o jighi ndụ ya pụta.
A hụrụ ebe ụmụokorobịa abụọ ahụ ku nwa ahụ pụọ n'ụlọ ndina ahụ mana nke nwaanyị esoghi ha, ndị ọrụ ụlọ ndina ahụ mechara gbakaa ụzọ n'ime abalị wee hụ ozu nwaada ahụ.
Kọmishọna Mgbasaozi nke Abia steeti bụ Dkt Eze Chikamnayo, gwara BBC Igbo na ha mechiri ụlọ ndina ahụ iji mee ka ndị gbochie ndị mmadụ ịga ebe ahụ, ọkachasị ruo mgbe ndị uweojii mechara nnyocha ha.
Ọ kọwara na mmechi a bịara dịka ha natachara akụkọ na ọtụtụ ndị mmadụ gabara na ya bụ ụlọ ndina na-efu efu, ọkachasị n'ebe a na-egwu mmiri ebe ahụ.
O kwuru na e nweghi etu gọọmentị gaara esi gbachi nkịtị ka ụdịrị ihe a na-eme na steeti ahụ, ma kwuo na aka ndị uweojii akparala ndị niile a na-enyo na aka ha dị na ya bụ ihe.
Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị ga-emechi ụlọ ndina ọbụla hapụrụ ka e jiri ụlọ ha mee ụdịrị iuhe ọjọọ a.
Ruo mgbe e dechara akụkọ a, Geoffery Ogbonna bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ azaghị ekwentị ya mgbe BBC kpọrọ ya.









