Electricity Subsidy removal: Ihe ndị ị maghị maka ego nkwubilata ọkụ latrik gọọmentị wepụrụ

Ebe foto si, AFP
Na nso nso a, ụlọ rụ na-ahazị okwu ọkụ latrik na Naijiria a kpọrọ 'Nigerian Electricity Regulatory Commission'(NERC) na Bekee kwuru n'ezie, na e wepụla ego 'subsidy' n'ọkụ latrik na Naijiria.
Onyeisi ụlọọrụ Nerc bụ Sanusi Garba, onye gbara ama n'Abuja kwuru na a ga-na-agbanwe ihe a na-akwụ maka ọkụ kwa ọnwa isii.
Ozi a nke na-abịa dịka Naijiria na-enwe nsogbu enweghị ọkụ ma ncha abalị abụọ, gbagwojuru ọtụtụ ụmụ Naijiria anya nke mere ka ọtụtụ na-ajụ ihe nke a pụtara.
Na nkọwa ya, Sam Amadi bụ onye bụbu onyeisi NERC(2010-2015) kọwara BBC Igbo na gọọmentị na-etinyebu aka n' kwụbilata ego latrik iji mee ka ọkụ latrik bụrụ ihe ndị ogbenye ga na-enweta,
O kwuru na ọkụ latrik dịka onye na-eme achịcha nke na-azụ akọrọngwa dị iche iche gụnyere shuga, flawa, na ihe ndị ọzọ bụ nke ọ na-agbakọ ma tinyetụ ọmụrụnwa were ree.
"Iji hụ na-ahịa ahụ na-aga n'ihi, onye ahụ kwesịrị ị na-etinye nwa ego n'elu ego akọrọngwa o tinyere were mee achịcha ahụ."
Ndị na-ewetara anyị ọkụ ya bụ ndị "Gencos' bụ mmanụ gaasị ka ha na-eji eme ya. Ha na-azụ ya azụ.Ha nwekwara ihe ndị ọzọ ha na-etinye iji nye ndị Discos ọkụ."
Lee ihe ndị ọzọ o kwuru maka iwepụ ego nkwụbilata gọọmentị:
- Ego ndị a niile ha na-emefu ọ bụrụ na a kwụwa ụgwọ ya, ego ọkụ latrik otu kilowat n'otu awa ga-abụ N40.
- Kama N40 maka otu kilowat n'otu awa, gọọmenti na-akwụ N15 nke mere na a na-akwụ N25 maka otu kilowat maka otu awa
- Ọ bụ ndị World Bank nyere Gọọmentị Etiti ndụmọdụ( dịka ha gara ịgbazite ego ọhụrụ) ka ha kwụsị ịkwụ 'subsidy', ka ndị mmadụ kwụwa ihe kwesịrị iji mee ka ndị ụlọọrụ na-eke ọkụ nwe ike itinye ego mee ka ọkụ dị mma
- Ndị mmadụ ga-amalite ịkwụ ego ọkụ karịa ole ha na-akwụ na mbụ Ijimaatụ Onye na-amụ ọkụ % n'otu ọnwa ga na-amụsị n'izu
- Ndị enweghị ike ịkwụ ụgwọ, aga abịa gbubie ego.
- Ndị a na-ebutere akatamkpo ego maka na ha enweghị 'prepaid mitre, Ha ga-ahusi anya n'ihi na ego a ga na ebutere ha ugbua ga-akarị
- Nke e mere ugbua, ndị mmadụ ga-enweta 'prepaid metre' karịa mgbe gara aga n'ihi na ụlọọrụ ga-enweta ego iji zụta metre ha ga-enye ndị mmadụ.










