Paul-Henri Damiba: Onyeisi agha weghara ọchịchị n'ike aṅụọla iyi ọrụ dịka Onyeisiala Burkina Faso

Paul-Henri Damiba weghara ọchịchị n'izu atọ gara aga

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Paul-Henri Damiba weghara ọchịchị n'izu atọ gara aga

Onyeisiagha ndị Burkina Faso weghara ọchịchị n'ike aṅụọla iyi ọrụ.

Nke a na-abịa ka izu atọ gara kamgbe ha weghara ọchịchị n'aka ndị gọọmenti ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọ ṅụrụ iyi ọrụ dịka Onyeisiala ji isioche na-eche ka ọchịchị onye kwuo uche ya.

Na foto ịṅụ iyi ọrụ onye isi oche obodo, o yi uwe ndị agha ma kwuru okpu uhie Paul-Henri Damiba ṅụrụ iyi na ọ ga-eso akwụkwọ iwu ala Burkina Faso na mmemme e mere n'isi obodo Wagadugu (Ouagadougou).

Ndị agha a si na ha ga-eweghachị ọchịchị nye ndị ọchịchị onyekwuo uche ya mana ha ekwupụtabeghị mgbe ha ga-eme ya.

Mpaghara ọdịda anywanwụ ahụla ọtụtụ mweghachị ọchịchị ndị agha na nsonso a.

Prince Andrew na Virginia Giuffre ekpebiela okwu mwakpo dị n'etiti ha

Prince Andrew na Virginia Roberts na Ghislaine Maxwell, n'afọ 2001

Ebe foto si, Virginia Roberts

Nkọwa foto, Prince Andrew na Virginia Roberts na Ghislaine Maxwell, n'afọ 2001

Prince Andrew bụ otu n'ime ụmụ Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ nke mba Briten, ekpebiela ikpe dị n'etiti ya na Virginia Giuffre - onye kpụpụrụ ya ụlọikpe maka mwakpo na mba Amerịka.

Nwaada Giuffre gbara Prince Andrew (Duke nke York) akwụkwọ n'ụlọikpe, ebe o boro ya ebubo iwakpo ya ugboro atọ oge ọ dị naanị afọ 17, nke ọ gọrọla ụkwụ na aka ya ugboro ugboro.

Akwụkwọ ozi e zigara ụlọikpe dị na mba Amerịka n'ụbọchị Tuzde, kwuru na Prince Andrew na nwaada Giuffre kpebiri okwu ha n'onwe ha, na-esoghizi mkpebi ụlọikpe.

Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na ọ ga-akwụ nwaada Giuffre ego ole a na-akpọghị aha.

Ndị nnọchite anya ya kwuru na o nweghi ihe Prince Andrew nwere ikwu karịa ihe e kwurula n'akwụkwọ dị n'ụlọikpe, ebe Buckingham Palace jụrụ itinye ọnụ n'ihe gbasara mkpebi a.

Russia-Ukraine tension: Russia ewepụla ụfọdụ ndịagha ha nọ n'okeala Ukraine

Ndịagha Russia nọ n'okeala ha na Ukraine

Ebe foto si, Anadolu Agency

Mba Russia sị na ọ gwala ụfọdụ ndịagha ha nọ nso n'okeala ha na mba Ukraine ka ha lọghachite n'azụ.

Minista ha na-ahụ maka nchekwa sị nkwado ha na-eme ga-aga n'ihu kama na ụfọdụ ndịagha na-alọghachite n'ogige ha.

O kwughi ndịagha ole na-apụ, a mabeghi ma o nwere ibelata egwu dị n'ebe ahụ ugbua.

Russia ji ndịagha ha karịrị otu puku narị (100,000) kwụrụ chịm n'okeala ha na mba Ukraine, mana ha gọnarịrị ebubo na ha chọrọ ịwakpo Ukraine.

Ndịagha nọ na-enwete ọzụzụ dị iche iche n'ogige ahụ dịka ọnụ na-ekwuru ministry nchekwa bụ Igo Konashenkov si kwuo.

Mkparịtaụka etu a ga-esi gbochie ọgụ na ọgbaghara a ka na-aga n'ihu na Tuzde dịka Chansela Germany bụ Olaz Scholz ga-ezute onyeisiala Russia bụ Vladimir Putin.

Kama m ga-agba ọgwụ mgbochi coronavirus ọ kaara m mma ịkwụsị ịkụ tennis - Djokovic

Novak Djokovic

Novak Djokovic na-akụ tennis ekwuola ihe mere o ji jụụ ịgba ọgwụ mgbochi coronavirus.

Na mkparịtaụka ya BBC nwere, ọ sị na mmadụ enweghi ikike ịmanye ya n'ike ka ọ gbaa ọgwụ mgbochi coronavirus.

Ọ sị kama ọ ga-agba ọgwụ mgbochi coronavirus, na ọ ga-akara ya mma ịhapụ ịkụ asọmpi tennis.

Djokovic sị na o soghi na ndị na-asị ka a gbaala ọgwụ mgbochi kama na ọ bụ maka ahụike ya mere ọ chọghị ịgba.

Novak Djokovic of Serbia during a practice session ahead of the Australian Open in January 2022.

Ebe foto si, EPA

Cheta na mba Australia nyere nwamadị a ọsọ na mba ha maka na ọ gbaghị ọgwụ tupu ọ bịara ịkụ asọmpi Tennis.

Djokovic bụ onye mbụ n'ịkụ tennis, sị na o nwere akwụkwọ mkpuchi ịbanye Australia na-agbaghị ọgwụ a.

Mana minista ọpụpụ na mbata n'Australia bụ Alex Hawke kagburu akwụkwọ ikike Djokovic ma sị na o nwere ibute ọgbaghara na mba ha.

Onye bụ Djokovic?

  • Novak Djokovic bụ nwafọ mba Serbia na-akụ tebụlụ tennis.
  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee afọ 1987.
  • Djokovic malitere ịkụ tennis dịka aka ọrụ n'afọ 2003.
  • Ọ bụ otu n'ime ndị kachasị akụ tennis n'ụwa, o turula ugo a kpọrọ 'Grand slams' ugboro iri abụọ na abụọ.
  • Ọ lụrụ nwunye ya bụ Jelena Djokovic n'afọ 2014 ma mụọ ụmụ abụọ bụ Tara na Stefan Djokovic.