Unknown Gunmen Attack: Ndị a na-eche bụ ndị oji egbe egbukwala ndị uweojii a sị ruru anọ n'Enugu steeti

Ihe onyoonyo na-efeghari gosiri ka ozu otu nwoke yi akwa ndị uweojii Naịjirịa tọgbọọ n'ala
Nkọwa foto, Ihe onyoonyo na-efeghari gosiri ka ozu otu nwoke yi akwa ndị uweojii Naịjirịa tọgbọọ n'ala

Akụkọ si Enugu abịa na-ekwu na ndị a na-eche bụ ndị o ji egbe agbagbuola ndị uweojii a sị ruru anọ n'Obeagu dị n'okpuruọchịchị Enugu south n'ụbọchị Satodee

N'ihe onyoonyo na-efeghari na soshal midia n'ụbọchị Satọdee, e kwuru na mwakpo nọ ya bụ ihe onyoyo mere n'okporoụzọ si Obeagu gawa Agbani.

E kwuru na agbagburu ndị uweojii anọ n'agbanyeghi na ihe onyoonyo ahụ gosiri naani otu nwoke yi akwa uweojii ebe ahụ.

Akụkọ na-ekwu na mwakpo a mere ebe elekere atọ nke ehihi Satọdee.

Nke a na-abịa dịka naani otu abalị gachara ebe ndị o ji egbe amabeghi ndị ha bụ wakporo ogige Meniru street dị na Gariki nke Enugwu.

Na mwakpoo a mere n'ụbọchị Tọzde, agbagburu otu onye nche a ma ama n'Enugwu aha ya bụ 'Jango'.

N'ihe onyonyo na-efeghari ugbua, ndị njem bu ụgbọala ha na-agafee ogige ebe ndị uweojii na-enyocha ụgbọala ndị mmadụ nke Bekee na-akpọ Check Point, nke e kwuru bụ ebe mwakpoo a mere.

Ihe onyoonyo ahụ gosiri 'Check point' ebe ndị uweojii na-anọ eme ọrụ nchekwa

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Ihe onyoonyo ahụ gosiri 'Check point' ebe ndị uweojii na-anọ eme ọrụ nchekwa

Ndị njem ahụ nọ na-eti mkpu dịka ozu otu nwoke yi akwa ndị uweojii tọgbọọ n'ala ebe ahụ.

Ihe onyonyo ahụ gosikwara ka ọbara si n'ahụ ozu nwoke ahụ tọgbọọ ebe ahụ jupụtara n'ala ya bụ okporoụzọ ahụ.

Ndị nọ ebe ahụ ihe a mee kwuru na ndị o ji egbe ahụ bi ụgbọala "Sienna" na "Lexus jeep" wee wakpo ndị uweojii na checkpoint ahụ ama ama n'ụzọ si Obeagu gawa Agbani.

Ndị a kwukwara na a gbagburu ndị uweojii anọ, ndị ozu ha tọgbọrọ na ya bụ n'okporoụzọ.

Chetakwa na ọ bụ ụbọchị abụọ gara aga ka ndị o ji egbe wakpokwara "check point" ndị Uweojii na akụkụ Timber shade, Enugu ma gbagbuo mmadụ anọ.

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugu steeti bụ Daniel Ndukwe maka nke a mana ọ zabeghi ekwentị ya.

Ọkaiwu Steve Orurua bụ onye enyeka gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi kwuru na ọ nụrụ maka ya bụ mwakpo mana gọọmentị Enugu steeti ga-ezipụta ozi banyere ya na nso nso a.

Cheta na Ndukwe ekwuolarị okwu maka nke mere abali abụọ gara aga were zaa ndị ntaakụkọ na ha na-atinye anya na mmiri ịchọpụta ndị omekaome ahụ.