What is 420 celebration: Lee ihe mere 420 jị bụrụ akara dị mkpa maka ndị na-ese 'marijuana'

Ebe foto si, Getty Images
Ị lee anya na soshal midia taa bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Eprel, ị ga-ahụ na akara '420' na-efegharị, lee ihe kpatara nke a.
Dịka taa bụ ụbọchị 20 nke ọnwa anọ bụ nke ndepụta akara ya bụ 420, ọtụtụ mba dị ịcheịche na-eme ihe omenala ncheta ahịhịa marijuana nke anyị ma dịka igbó.
Ihe a malitere dịka ndị enyi ise na mba California maliter ịgbakọ ma o were nkeji iri abụọ gafee elekere anọ nke mgbede ụbọchị ọbụla, ma na-achọ ebe ha ga-ese 'marijuana'.
Aha mmadụ ise a bụ Steve Capper, Dave Reddix, Jeffrey Noel, Larry Schwartz, and Mark Gravich. Ha bụ ụmụakwụkwọ oge ha malitere ime nke a.
Cheta na ọtụtụ ndị nnyocha sayensị na-ekwu na ahịhịa 'marijuana' nwere ọtụtụ akụrụngwa na-edozi ahụ ma na-agwọ ọrịa n'ime ya.
Mana ọtụtụ mba ụwa dị icheiche machiri 'marijuana' dịka ọgwụ ike. Naịjirịa so na mba dị otu a.

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, dịka akara 420 na-efesa, ọtụtụ otu na-alụ ọgụ ikike dịrị mmadụ na mba dị iche iche jizị ụbọchị a eme ngagharị iji kpọkuo gọọmentị ka e bulie mmachị a machịrị ọgwụike marijuana na mba ha.
Emume 420 nke afọ a ga-adị n'obodo Denver nke dị na steeti Colorado na mba Amerịka.
Colorado bụ steeti mbụ na mba Amerịka buliri mmachị ise 'marijuana'
Ndị na-ese ihe osise hụtara nke a dịka nnukwu mmeri nyere mbọ ha na-agba ka ewepụ mmachị a machiri ise anwụrụ.
Ọ bụrụ na i na-ese maọbụ na etinye igbó na nrị, lee ihe dị mkpa ị kwesịrị ima.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe Ị kwesịrị ima maka igbó [Marijuana]
Ahịhịa 'marijuana' maọbụ 'cannabis' nke e ji Igbó mara na Naịjirịa, so na otu n'ime ọgwụ ike nke gọọmentị Naịjirịa machiri amachi.
Mana nke a egbochighi ọtụtụ ndị mmadụ ịse ya, ọkachasị ndị ntorobịa.
Ọ bụ eziokwu na ndị nnyocha sayensị na-ekwu na ahịhịa 'marijuana' nwere uru ọ bara maka ahụike, mana o nwekwara ọtụtụ ọghọm nke mere gọọmentị ji machie ya.
Ihe ndị ọkammụta n'ihe gbasara ahụike kwuru gbasara 'marijuana':

Ebe foto si, Getty Images
Ahịhịa 'marijuana' nwereike inyere mmadụ aka n'ọtụtụ ụzọ ọkachasị ndị na-arịa ụfọdụ ọrịa.
Enyemaka a gụnyere: "Ibelata ahụ mgbu, ịbelata ọnọdụ ahụike na-emetụta ụbụrụ isi mmadụ maọbụ "multiple sclerosis" na Bekee, ibelata oke ịgbọ agbọ, ịkwụsịlata oke ụjọ na obi mmapụ, nakwa inyere ndị nwere ọrịa kansa aka."
Onye kwuru nke a bụ okammụta Makuochi Muobike, bụ ọkachamara n'ọgwụ nakwa ịmepụta ọgwụ.
Muobike gwara BBC Igbo na "'marijuana' nwere ike inye aka ka agụụ gụọ mmadụ, ọkachasị onye ahụ na-arịa".
O kwukwara na a na-eji ya enyere ndị nwere ihe Bekee na-akpọ "post-traumatic stress disorder" nakwa ọrịa parkinson' aka.
Dọkịta ọzọ aha ya bụ Udodi Okoli kwuru na 'marijuana' na-enyere ndị na-enwe nsogbu ihi ụra aka ka ha rarụ ụra nke ọma.
Kama ọ dọrọ aka na ntị na ọ bụ dọkịta kwesịrị ịgwa mmadụ ụzọ ka mma ọ ga-esi jiri 'marijuana' mee ihe, "ọ bụghị ihe mmadụ na-aṅụrụ onwe ya aghara aghara
"Agbanyeghi na 'marijuana' nwere ọtụtụ uru, ọ naghi abụ ọgwụ mbụ maọbụ nke abụọ a na-enye onye ọrịa n'ihi ọghọm dị n'ịṅụfe ya oke,"dọkịta Okoli kwuru.
Kedụ ọghọm dị na mmadụ ịse Igbó maọbụ itinye ya na nri?

Ebe foto si, Getty Images
- Ọ na-eri mmadụ ahụ ma sie ike ịkwụsị: Ọtụtụ ndị nnyocha sayensị ekwuola na igbó nwereike ịtọkụrụ mmadụ.Dịka Mazị Muobike si kwuo, ịkwụsị onye igbó tọkụụrụ ga-ebute nsogbu ụfọdụ dịka ọnọdụ mgbakasi ahụ, mmụọ ida mba,nsogbu ihi ụra, nakwa ndị ọzọ
- O nwereike ịmetụta akọ na ụche nakwa ụbụrụ isi mmadụ: Ndị ọrụ ahụike kwuru na igbó nwereike ikpata obi mmapụ, ụjọ nakwa nkụja n'ahụ ụfọdụ.Dọkịnta Okoli kwuru na ọ nwereike ibute oke obi ịda mba nke a na-akpọ "Clinical Depression".Igbó nwereike ikpalite mmadụ ịhụ ihe dịka ọ nọ na nrọ maọbụ 'halucination' na bekee, o nwekwara ike ịghasa akọnuche mmadụ.Dọkịnta Okoli kwukwara na isefe igbó oke nwereike ibute ọrịa isi mgbaka nke Bekee na-akpọ "schizophrenia".
- Ọ na-emebi akụkụ ahụ dị mkpa n'ime ahụ mmadụ: Maazị Muobike kwuru na ise 'marijuana' dịka anwụrụ nwereike butere mmadụ ọrịa obi, ọrịa kansa ngụgụ, nakwa ụkwara akwụsị akwụsị.
- O nwereike iduba gị mkpọrọ: Dịka 'marijuana' bụ ihe iwu Naịjirịa machiri, ndị uweojii maọbụ ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọgwụ ike bụ 'National Drug Law Enforcement Agency' (NDLEA) nwere ikike ịnwụchị ndị na-ese ya, kpụpụ ha ụlọikpa ma tụọ ha mkpọrọ.
- O nwereike ime ka achụọ mmadụ n'ọrụ: Ụfọdụ ụlọọrụ nwereike ịchụpụ mmadụ ma achọpụta na ọ na-ese ya bụ ọgwụ.Ụlọọrụ dị ịcheịche na-enyocha ndị ọrụ ha ịmata ma ha a na-aṅụ ọgwụ ike. E nyochapụta ọgwụ a na-ahụ mmadụ enwereike ịchụ onye ahụ n'ọrụ, dịka na ọrụ ndị agha, ndị egwuregwu, ndị ọkwọ ụgbọelụ nakwa ụgbọala, maọbụ ndị na-anya igwe e ji arụpụta ihe nke Bekee na-akpọ "Manufacturing Industries" wdgz
Ahụmihe ụfọdụ ndị na-ese igbó

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwoke na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na ịse Igbo na-enyere ya aka n'ikpalite mmụọ ya nakwa na-iralarụ ụra nke ọma.
Otu nwaanyị na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na enyochapụtara ọgwụike a n'ahụ ya n'ụlọọrụ ya, nke mere e ji chụọ ya n'ọrụ n'ihi na ọ bụ ihe ụlọọrụ ha machiri amachi.
Onye ọzọkwa sị ka a kpọọ ya John kwuru na Igbo na-enyere ya aka ịkpalite agụụ iri nri n'ihi na ọ naghi enwe mmasi rie nri. John kwukwara na "Igbo na-enyere m aka n'ịchepụta echiche ọma n'ọrụ aka dịka onye ọkwa nka."
Nwaokorobịa ọzọ kwuru na ọ na ese Igbo iji bụ ihe na-enyere ya aka imesapụ ahụ n'ihi na ọ bụ onye ihere. O kwukwara na ụtọ Igbo abaala ya n'ụmị nke bụ na ọ ga-esiri ya ike ịkwụsị. Nke a ebuterela ya na ndị ezinụlọ ya nsogbu n'ihi na nne ya achọghị ka ọ na-ese ya.
Ihe iwu Naịjirịa kwuru banyere Igbo?

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba NDLEA bụ ndị na-ahụ maka mgbochi ịṅụ na ibughari ọgwụ ike bekee kpọrọ 'narcotics' na Naịjirịa.
Ntaramahụhụ dịịrị onye a hụrụ ọgwụ ike dịka 'marijuana' n'aka ya bụ na onye ahụ ga-aga mkpọrọ ihe dịka afọ iri na abụọ.
Ọ bụrụ na ọgwụ a hụrụ n'aka onye ahụ buru ibu, o nwereike ịga nga mkpụrụ ọka.
Ọ bụ ezie na ọtụtụ mmadụ na mba ofesi na-agba mbọ ka a kagbuo mmachị 'marijuana', gọọmentị Naịjirịa ka kwusoro ike na ya bụ ahịhịa megidere iwu.
Onye ụtọ ịṅụ 'Marijuana' banyere n'akara, enwere ike ịgwọ onye ahụ?
Agbanyeghi na ụfọdụ ndị ahụike ka na-eme ndọrọndọrọ ma ọgwụ a enwereike ịtọ kụrụ mmadụ tọfee ya uche, ọtụtụ akwụkwọ ahụike agbaala ama na ụtọ ọgwụ a nwereike ịba mmadụ n'akwara nke bụ na onye ahụ aghaghị enwe ike kwụsị ịṅụ ya maọbụ see ya.
Onye nọ n'ọnọdụ a nwereike ịnata ọgwụgwụ site n'aka ndị ọrụ ahụike na-ahu maka akparamagwa.
E nwere ụfọdụ usoro ọgwụgwọ a na-eji enyere ndị a aka nke gụnyere:
- Cognitive-behavioral therapy
- Contingency management
- Motivational enhancement therapy
Ha niile nakwa ndị ọzọ bụ usoro eji azọpụta ndị ịse ọgwụ a na-eme ịwa.
Marakwa na onye nọ n'ọnọdụ a abụghị onye e kwesịrị ịchị ọchị maọbụ kwaa emo, kama ọ bụ onye e kwesịrị iji ịhụnanya na ọmịiko nyere aka.
Lekwa ụfọdụ ihe onye nwere mmasị ibelata ise maọbụ ịkwụsị ise ọgwụ a ga-eme:
- Wepụ na tufuo ihe ndị ịji aṅụ ya bụ ọgwụ maọbụ ihe ndị na enyere gị aka ịsee ya dịka akwụkwọ, ihe eji a mụrụ ọkụ (lighter) wdgz
- Kwụsị ịga ebe ndị mmadụ na-ese ya ga-anọ
- Kwụsị ịkpọ ndị maọbụ inye na-eresi gị ya bụ ọgwụ. Wepụ akara ekwentị ya n'akwụkwọ gị nakwa na ekwentị gị
- Mara ihe ndị na-akpalite mmụọ gị ịchọ ịse ya bụ ọgwụ ma zere ihe ndị ahụ
- Mara oge agụụ ịse ya kacha e ji agụ gị ma kee nkwụcha etu ịga esi gbalahụ ya bụ agụụ
- Kwupụta nzube gị ịkwụsị ise ya nye ndị hụrụ gị n'anyị ma gwaa ha nyere gị aka n'atụmatụ ahụ
- Gba mbọ chọọ ihe dị mma ga-anọchịte anya mmasị ise ọgwụ a na ndị gị









