Buhari and Coat of Arms: Akụkọ na Buhari zọrọ ụkwụ n'elu 'Coat of Arms' Naịjirịa bụ akụkọ nduhie

Onyeisiala Buhari

Ebe foto si, Bashir Ahmad

Akụkọ gbasara etu Onyeisiala Muhammadu Buhari si zọọ ụkwụ n'elu 'Coat of Arms' nke Naịjirịa agbasaala ebe niile ugbua, dịka ndị ntaakụkọ atọ n'ụlọọrụ TVC ji ya mere isi akụkọ.

Nke a akpalitekwalka akụkọ ụgha wuburu n'oge gara aga na Buhari anwụọla, na onye nọ n'oche ọchịchị Naịjirịa ugbua abụghị Buhari.

Na mparịtaụka TV ahụ, onye ntaakụkọ aha ya bụ Ayodele Osugbakun kwuru na "ọtụtụ ndị Naịjirịa ọ kachasị ndị isi ndị agha na-ewe nnukwu iwe etu Onyeisiala Buhari si zọọ ụkwụ n'elu 'Coat of Arms' nke Naịjirịa, n'ụbọchị a na-echeta ndị agha larala mmụọ, nke bụ ihe emetụbeghị mbụ".

Okwu a kpalitere asịrị nakwa akụkọ ụgha na soshal midia ebe ndị mmadụ na-ekwu na Buhari nwụrụ n'afọ 2017, na onye nọ n'ọkwa onyeisiala Naịjirịa ugbua bụ nwoke aha ya bụ Jubril.

Akụkọ ụgha

Ebe foto si, Twitter Screengrab

Ọ bụ Nnamdi Kanu, onyeisi otu na-achọ ikewapụ na Naịjirịa a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra (Ipob)', bu ụzọ kwulite akụkọ ụgha a.

Ọtụtụ ndị na-eso Nnamdi Kanu kwenyekwara ihe a onyeisi ha na-ekwu ruo taa.

Mana Buhari ọ zọrọ ụkwụ n'elu 'Coat of Arms' Naịjirịa?

Presidential Seal

Ebe foto si, Nigerian Government

Onye enyemaka mgbasa ozi Buhari na soshal midia aha ya bụ Tolu Ogunlesi, kọwara na ọ bụghị 'Coat of Arms' ka Onyeisiala Buhari kwụ n'elu ya, kama ọ bụ akara a na-akpọ 'Presidential Seal'.

Ogunlesi kọwara na mba Amerịka, ebe Naịjirịa si ṅomite ọchịchị onye kwuo uche ya, nwekwara akara a bụ 'Presidential Seal'.

"Na Naịjiria, dịka ọ dị n'Amerịka, Onyeisiala nwere ikike iguzo n'elu akara a bụ 'Presidential Seal'," Ogunlesi kọwara.

"Ọ bụrụ na Onyeisiala kwụrụ ọtọ n'elu akara 'Seal' a, ndị ọbịa ya nwere ike ikpudebe ya nso kwụrụ ebe ahụ, mana o nweghị onye ọzọ nwere ikike ịkwụ n'elu ya ma ọ bụrụ na Onyeisiala anọghị ebe ahụ."

"Ịkwụ n'elu 'Presidential Seal' so n'ugwu a na-akwanyere Onyeisiala, ọ bụghị mmehie ka ọ bụ."

Tolu Ogunlesi

Ebe foto si, Tolu Ogunlesi

Ogunlesi katọrọ etu ndị ntaakụkọ si gbasaa akụkọ duhiere ndị mmadụ, na-ebughị ụzọ mee nnyocha miri emi maka ozi ha na-agbasa.

BBC tulekwara onyonyo ahụ e sere n'ụbọchị 15 nke Jenụwarị 2022, wee chọpụta n'ezie na ọ bụ n'elu 'Presidential Seal' ka Buhari guzo ọtọ n'ụbọchị ahụ.

N'ụbọchị 22 nke ọnwa Jenụwarị, 2022, ụlọ ntaakụkọ TVC rịọrọ mgbaghara ma kọwaa na Onyeisiala nwere ikike iguzo ọtọ n'elu 'Presidential Seal'.

Gịnị bụ Coat of Arms, gịnị ka ọ na-egosipụta?

Coat of Arms

Ebe foto si, By Lumia1234

'Coat of Arms' Naịjirịa so n'otu ihe njirimara Naịjirịa gbara ọkpụrụkpụ.

Ihe njirimara ndị ọzọ gụnyere ọkọlọtọ Naịjirịa, Abụ njirimara Naịjirịa (National Anthem), na Nkwa njirimara Naịjirịa (national pledge).

'Coat of Arms' bụ eserese ịnyịnya abụọ, na nnụnụ Ugo dị n'elu ya, na okooko e ji chọọ ala ya mma, na akara ngosipụta osimiri Naịja osimiri Benue, nakwa ederede "Ịdịkọnotu na Okwukwe, Udo na Ọganihu".

Inyinya abụọ ahụ na-egosipụta nkwanye ugwu, Ugo na-egosipụta ike, okoko na-egosipụta mma obodo Naịjirịa mara.

Onye ọkaiwu aha ya bụ Ugo Egbujo gwara BBC na oge ọbụla e tinyere ihe ọzọ n'ime maọbụ n'elu eserese 'Coat of Arms', ọ bụkwaghị 'Coat of Arms'.