Cyprian Michael Iwene Tansi Profile: Ihe niile ị kwesịrị ịma maka ụkọchukwu a bụ onye Naịjirịa mbụ bụ 'Saint'

Ebe foto si, Catholic Diocese of Onitsha
Fada Cyprian Michael Iwene Tansi bụ ụkọchukwu a ma ama n'okpukperechi Kraịst na mbaụwa niile, ọkachasị n'ụka Katọlik.
Ndị Ụka Katọlịk na-asọpụrụ ya dịka onye nsọ, ka mgbe e chiri ya Saint n'afọ 1998.
Ụbọchị 20 n'ọnwa Jenụwarị bụ ụbọchị ncheta oge ọnwụ ya mere afọ 58 kemgbe ọ lara mmụọ.
Dịka a na-eme ncheta ya taa nke ụfọdụ na-akpọ "Feast day", akụkụ ụwa dị iche iche kpụ aha Fada Tansi n'ọnụ.
Lee ihe ndị dị mkpa ị kwesịrịịma maka Fada Tansi

Ebe foto si, Catholic Archdiocese of Onitsha
- A mụrụ Fada Cyprian Michael Iwene Tansi n'afọ 1903 n'Aguleri, Anambra steeti, Naijirịa.
- Tansi mere mmiri Chukwu (baptism) n'afọ 1913.
- Nne na nna ya abụghị ndị ụka. Ha bụ ndị ọgọ mmụọ.
- Mgbe ọ bụ nwokoroọbịa, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nkuzi, tupu ọ bụrụ onye ụkọchukwu Katọlik.
- E chiri ya ụkọchukwu ụka Katọlik na dayọsis nke Ọnịcha n'afọ 1937, oge ọ dị afọ 34.
- O mechara banye ụlọ ekpere pụrụ iche Bekee kpọrọ 'monastery', nke aha ya bụ 'Mount Saint Bernard Abbey' na mba Briten, n'afọ 1950.
- N'ebe ahụ ka ọ malitere ịgbaso ndụ ndị ụkọchụkwụ dopụrụ onwe ha iche maka ọrụ ụka nke Bekee na-akpọ 'monk'.

Ebe foto si, Catholic Diocese of Onitsha
- Fada Tansi lara mmụọ n'ụbọchị 20 Jenụwarị 1964, mgbe ọ dị afọ 61, e wee lie ya n'ogige ebe obibi ndị 'monk' dị na mba Briten.
- N'afọ 1986 ka e gwupụtara ozu ya wee bughachite ya na Naijiria, lie ya n'ụlọụka 'Holy Trinity Basilica' dị n'Ọnịcha.
- N'otu afọ ahụ kwa, otu nwaanyị nwetara ihe iribeama pụrụ iche site n'ekpere o kpere site n'enyemaka Fada Tansi.
- Nnyocha gosiri na nwaanyị ahụ nwetara ọgwụgwọ ọrịa kansa ji ya n'ezie

Ebe foto si, Getty Images
- Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope John Paul nke abụọ, bịara Naịjirịa n'afọ 1998 ebe ọ nọrọ kwuputa Fada Tansi dịka onye dị ngọzị nke Bekee kpọrọ 'Blessed'.
- Ọ bụ Fada Tansi bụ nwaafọ Naịjirịa mbụ a na-enye nkwanye ugwu a pụrụ iche ma kpọ ya Saint.
Kedụ etu e si eme mmadụ onye nsọ n'ụka Katọlik?

Ebe foto si, Catholic Diocese of Onitsha
Ụka Katọlik na-ahọpụta ụfọdụ ndị nke ha rụrụ ọrụ ọma oge ha dị ndụ ma mee ha ndị nsọ, nke bekee na-akpọ 'Saint'.
Ime mmadụ 'Saint' bụ ụzọ ụka Katọlik ji ekwupụta na onye ahụ nwụrụ anwụ nọ n'Eluigwe.
Enwere usoro doro anya a na-agbaso tupu ụka Katọlik ekwupụta na mmadụ bụ onye nsọ. Lee ha:
- Afọ ise ga-agafe onye ahụ ji nwụọ (mana ọ bụghị oge niile). Pope John Paul nke abụọ anọzughị afọ ise ọ nwụrụ tupu e mee ya onye nsọ.
- A ga-enye onye ahụ nzere 'Nwa odibo Chineke' maọbụ 'Servant of God' na Bekee
- A ga-egosipụta ihe akaebe na onye ahụ biri ndụ kwesịrị nṅomi
- A ga-enwe ihe iribeama abụọ doro anya
- Nke a mechazie, a ga-akpọpụta onye ahụ dịka onye nsọ
Gịnị mere ịbụ onye nsọ ji bụrụ nnukwu ihe n'ụka Katọlik

'Saint' bụ nkwanye ugwu kachasị ụka Katọlik nwereike inye onye otu ha ọbụla larala mmụọ.
E nwere nkwenye na onye ọbụla a kpọpụtara dịka onye nsọ agaruola Eluigwe.
Ndị ụka Katọlik kwenyekwara na onye dị otu ahụ nwere ike ịrịọtara ha arịrịọ n'aka Chukwu.
Ndị mmadụ na-enye ụmụ ha aha ndị nsọ (dịka John, Peter, Michael wdgz) dịka ha kwenyere na ọ ga-eme ka ụmụ ha mụta ezi omume.










