Police Recruitment 2021: Ndị ntoroọbịa Ọwụwa Anyanwụ e nwere mmasị ịba ọrụ uweojii?

N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Naijirịa bụ Frank Mba ekwuola na ndị sị na steeti dị n'ọwụwa anyanwụ tinyere akwụkwọ ịrụ ọrụ ndị uweojii erụghị passenti abụọ n'ime mmadụ puku iri asatọ na otu, na ise tinyere akwụkwọ na Naijirịa niile.
Ọ gara n'ihu kwuo na Anambra steeti bụ steeti ebe ndị tinyere akwụkwọ maka ọrụ a kacha pee mpe n'Ọwụwa Anyanwụ dịka naanị mmadụ otu narị na iri ise na asatọ si steeti ahụ.
Ndị ntorobịa Ọwụwa Anyanwụ a na-etinye akwụkwọ ọrụ ndị uweojii n'oge gara aga?

Iji tulee ihe ndị uweojii kwuru, ọnụ ọgụgụ ndị tinyere akwụkwọ maka ọrụ ndị uweojii n'afọ 2018 gosiri na mmadụ puku abụọ na narị itolu na iri asaa na isii bụ ndị si Abia Steeti, mmadụ puku abụọ na narị abụọ na anọ sitere Anambra, mmadụ puku anọ, narị ise na iri asatọ na ise si Enugwu Steeti ebe mmadụ puku anọ, narị ise na iri na atọ si Imo steeti.
Ụfọdọ ndị ntoroọbịa si n'Ọwụwa Anyanwụ Naijịrịa gwara BBC Igbo ihe mere ha etinyeghị akwụkwọ maka ya bụ ọrụ dịka ndị uweojii na-eme achụmnta iwe ọrụ ugbua.
Ihe ndị ntoroọbịa sị n'ọwụwa anyanwụ Naijirịa kwuru maka itnye akwụkwọ ọrụ ndị uweojii
David Onwuameze nwata akwụkwọ ka gụchara Sekọndrị n'afọ 2021 n'Enugwu gwara BBC Igbo na o tinyeghị akwụkwọ maka ya bụ ọrụ maka na ego a na-akwụ ndị uweojii pere mpe.
O kwukwara si "E cheghị m na ọrụ ndị uweojii Naijịrịa bụ ọrụ nwere ugwu"
Onwuameze gara n'ihu kwuo "Na agbanyeghị na ọrụ ndị uweojii dị mkpa, echeghị m na ha na-arụ ha nke ọma na Naijirịa, nke mere ọrụ a amasighị m."
Samuel Ibe onye gụcharala mahadum ma biri n'Ebonyi steeti kwuru na ihe siri ike na Naijirịa.

Ebe foto si, NPF/Facebook
O kwuru na ọ chọrọ itinye akwụkwọ maka ya bụ ọrụ ka o si ebe ahụ bido ụwa.
Ibe kwuru sị, "Kama mgbe m gara na Websaịt ha, ọ naghị emepe maọbụ nye m ohere itinye akwụkwọ".
Dịka onye gụcharala Mahadum, ọ kọwara na ọ karịrị ya bụ ọrụ kama maka ihe isiike na Naijịrịa, ọ ga-amasị ya isonye ndị uweojii Naijirịa.
Agbanyeghi na ụfọdụ ndị ntorobịa n'Ọwụwa Anyawụ Naijiria achọghị itinye akwụkwọ maka ọrụ a, Nwaoha Emmanuel Uchendu ọnye nọ Abia Steeti kwuru na ọ chọrọ itinye akwụkwọ kama na ọ gafeela afọ eji etinye akwụkwọ.
Dịka a na-awakpo ndị uweojii n'Ọwụwa Anyawụ Naijịrịa, Uchendu kwuru sị "N'uche m, obi akaghị ụfọdụ ndị mmadụ itinye akwụkwọ maka ọrụ a, kama ọ bụrụ na afọ m ruru ya, a gaara m etinye akwụkwọ".
BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Frank Mba ka ọ kọwaa ihe mere ọtụtụ ndị si n'ọwụwa anyanwụ etinyeghị akwụkwọ maka oru a, kama ọ zaghị ekwe ntị ya.
Ihe i kwesịrị ịma maka ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Nigeria Police/ Facebook
E hibere ọrụ ndị uweojii n'afọ 1930.
Ọ bụ ndị ọchịchị Briten hibere ha mgbe ha na-achị Naịjirịa.
Tupu afọ 1930, ihe e jiri mara ndị uweojii bụ Northern Nigeria Police (NNP) na Southern Nigeria Police (SNP).
Ugbua, ha nwere ndị uweojii ruru nde mmadụ 206.
Ndị uweojii Naijiria ezipụtala ozi na ha adọtiala oge achụmnta iwe ọrụ nke kwesiri ịkwụsị n'ụbọchị 12 nke ọnwa Jenụwarị ruo ụbọchị 22 nke ọnwa Jenụwarị 2022.
Dịka a na-ama ọkwa ka ndị ntoroọbịa tinye akwụkwọ maka ọrụ ndị uweojii Naijirịa, ọnụọgụgụ ndị uweojii wepụtara na-ekwu na ndị tinyere akwụkwọ maka ya bụ ọrụ n'ọwụwa anyanwụ pere mpe nke ukwu.









