Nnamdi Kanu detention: Chukwu gozie ndị isi Ipob maka etu ha si kagbuo 'sit-at-home' - Fr Mbaka

Father Ejike Mbaka bụ onye onyeisi ụlọụka Adoration Ministry Enugu, Nigeria ekwuola ka ndị mmadụ pụta taa bụ Monde gawa mkpa ha maka na Ipob akagbuola 'sit-at-home'.

O kwuru nke a n'onyonyo ewepụtara na soshal midia gosiri oge ọ na-aka ụka n'ụlọụka ya dị n'Enugu ụnyahụ.

Mbaka gụpụtara ozi ndị otu Indigenous People of Biafra depụtara maka nkagbu 'sit at home 'n'ụlọụka ya.

O kwuru na ọ ma na ndị tinyere ọnọdụ nọrọ n'ụlọ na-eme ya maka na ha chọrọ ịkatọ nnwụchi Nnamdi Kanu mana o nwere ọtụtụ ndị bụ ihe ha nwetara n'ụbọchị ka ha na-eri.

"A na m agọzị ndị isi Indigenous People of Biafra maka etu ha si kagbuo 'sit at home'," Mbaka kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na o tinyere ọnụ n'okwu a makana ya bụ 'sit-at-home' na-eme ka ụmụakwụkwọ ghara ịgazi akwụkwọ ụbọchị Monday, bịakwa na-emetụta ndị ụka Sabath.

N'ọnụ ya, "Nnamdi Kanu kwuru na onye ọbụla na-amanye ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ, na-emegide ya."

Mbaka kwuru na ọ bụrụ na Nnamdi Kanu nwụọ n'ebe e ji ya, ọ ga-ebute nsogbu.

O kpọkuru ndị ọchịchị ma nke obodo, ndị gọvanọ na ndị ọnụ na-eru n'okwu pụta kwuo ma mara ihe ha ga-eme maka mmegbu ndị Igbo nakwa ndị ntoroọbịa Igbo na-ata ahụhụ.

Ihe ọzọ o kwukwara bụ na Nnamdi Kanu achọghị ahụhụ ndị Igbo site n'atụmatụ 'Sit at home' kama na ọ chọrọ ịtara ha ahụhụ.

"Kama unu ga-anọ n'ụlọ nkịtị, kpeerenu ya (Kanu) ekpere" ka o kwuru.

Ọ sị na ọ dị mma igosi nkwado maka ejiji eji Kanu mana ndị ọzọ atụgharịala atụmatụ ahụ ghọrọ ihe ọzọ.

"Ị maghị na a na-agbaka ụzọ ọdọahịa ndị mmadụ ezu ya ohi?" ka o kwuru gbasara ihe ahụ.

Ihe ọzọ Mbaka metụtara bụ ahụike Nnamdi Kanu ebe e ji ya.

Ọ sị "kemgbe nwanne anyị nwoke batara Naịjirịa, o nweghi Dọkịnta hụrụla ya",

"Agwọbeghị ya ahụ ọ merụrụ na mkpụrụ obi ya" ka o kwukwara.

Ka o kwuchara nke a, o kpeere ya ekpere ka ọ gbakee n'aha Jisos.

"Ka nwanne anyị nwoke bụ Nnamdi Kanu gbakee n'aha Jisos ka o kwuru.

Ihe Mbaka kwuru maka ndị ndọrọndọrọ na ndị ụkọchukwu ibe ya

N'ime ozi ahụkwa, Mbaka gwara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-atụ egwu ọkwa ha chee echiche maka ndị ha na-anọchi anya ha.

"Gịnị ka ha na-emere anyị? Ọ bụ maka na ndị mmadụ gbara nkịtị?" ka o kwukwara gbasara ndị ndọrọdọrọ ọchịchị ala Igbo.

Ọ dọkwara ndị ụkọchukwu dị ka ya sị ha na echiche abụghịzi maka ndị ntorọbịa na ọdịmma ha kama ọ bụzi maka ego ụtụ ha ga-eweta.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị