Nnamdi Kanu agaghị anọgide n'aka ndị DSS ụwatụwa - Fr Mbaka

Ụkọchukwu na-ahụ maka ụlọ ekpere 'Adoration' dị n'Enugwu, bụ Ejike Mbaka, ekwuola na ihe ekwesiri ị na-ekwu maka ya bụ etu a ga-esi tọhapụ Nnamdi Kanu ọ bụghị maka atụmatụ "sit-at-home".

Mbaka kwuru nke a n'ụlọ ụka ya ma tinyekwe okwu ahu n'akara Facebook ụlọ ụka ahụ.

Ọ sị na ya na-ekpe ekpere ka uche Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari gbanwee n'ebe Maazị Kanu nọ.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na Kanu agaghị anọ n'aka ndị nchekwa Bekee kpọrọ "Department of State Services" (DSS) ruo mgbe ebighegbi.

Mbaka sị na ya kwuru nke a maka na "dịka ọ dị taa, Kanu bu otu onye na-ekwu okwu ndị ntoroọbịa Igbo niile a sị isee".

Ọ sị na atọhapụ Nnamdi Kanu "sit-at-home akwụsị ozugbo".

Ọ jụrụ ihe mere ndị ochịchi mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kwesiri ị na-ekwu maka "nwa ha" anaghị eme etu ahụ.

Ọ jụkwara sị: "Mmadụ sị na nwa gi bụ ajọ mmadụ, na a ga-egbu ya, ị ga-ebinye aka n'akwụkwọ ka e gbuo nwa gị?"

Mbaka sị na ya na-achọ otu n'ime nwa atụrụ ya na-efu dịka "akwụkwọ nsọ" siri kwuo.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị ọchịchị ekwesịghị iji maka ihe ha ga-erite gbahapụ nwa ya.

Mbaka rụtụru aka n'ogbugbu o kwuru na ndị ọrụ nchekwa na-egbu ndị ntorobịa n'Ọwụwa anyanwụ.

O kwuru na ọ ka mma na a rụrụ ụlo mkpọrọ ọhụru kpọrọ ndị mmadụ na-etinye ebe ahụ karịa igbu ha.

"Ndi Ipob anaghị eji egbe maọbu mma," Mbaka na-ekwu.

"Ọ uwe ha ka ha ji aga. Ha na-eyi uwe "rising sun".

Chukwu ga-egosi Buhari ụzọ ọ ga-esi."

Mbaka sị na ọ dị mkpa ka Onyeisiala Buhari kpee ekpere banyere ihe na-eme ugbua, ka Chukwu nye ya amamihe ọ ga-eje kpezie nsogbu niile chere Naịjirịa n'ihu.

Ọ sị na nke a bụ makana "onye o ji abụghị obere mmadụ.

"Ọ bụru na n'ihi otu onye, onweghi onye na-aga ọrụ n'ala Igbo n'ụbọchị Mọnde, onye ahụ pụrụ iche."

Mbaka kagburu ogbugbu mmadụ ọkachasi ndi ntoroọbịa ma kwuo na nsogbu Naịjirịa bụ ihe a ga-akwụsịnwụ ma agbakpọọ kpaa ya ọfụma.

Cheta na Ụkọchukwu Mbaka so kwado ọchịchị Onyeisiala Buhari n'afo 2015 nakwa 2019 ma kwuo na ọ bụ onye nwereike ịgbanwe ọnọdụ Naịjirịa ka ọ ka mma.

Mana ugbua, ọ na-ekwuzi na gọọmentị ahụ anaghị eme ihe ha kwesiri ime.

Garba Shehu bụ otu n'ime ọnụ na-ekwuru Buhari kwuru na iwe Mbaka bụ maka na gọọmentị Buahri enyeghi ndị ọ kpọtara ọrụ.