You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anambra election 2021: Tupu ị tụọ vootu lee njirimara pati ndị so na ntuliaka gọvanọ Anambara steeti
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjiria bụ Independent National Electoral Commission (Inec) pịakọtara pati niile nọ na Naịjiria ọnụ, nke bụ na ha dịzị naanị iri na asatọ (18) ugbua.
N'ime ya bụ 18, ha niile wepụtara ndị ga-efere ha ọkọlọtọ dịka a na-azọ onye ga-abụ gọvanọ Anambara steeti site n'ọnwa Maachị 2022.
- Lee etu ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti si aga taa bụ Nọvemba 6
- Gọvanọ Willie Obiano o mezuru nkwa ndị o kwere imezi Anambra n'afọ asatọ?
- Lee akụkọ ụgha na-efegharị gbasara ntuliaka Anambra steeti, zeere ha
- Inec Anambra Governorship List 2021: Lee kpọmkwem ndị niile INEC kwuru ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti
Maka ndị ga-atụ vootu, ọkachasị ndị ọ bụ mbụ ha na-apụta ịtụ vootu, ị ga-ahụ njirimara pati ndị aha ha dị n'akwụkwọ ntuliaka Inec.
Lee pati ndị ahụ, njirimara ha nakwa ndị na-azọ oche gọvanọ n'okpuru ha.
Pati ndị na-azọ oche gọvanọ Anambara steeti
1) Accord (A)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Godwin Maduka
Njirimara ha - E sere aka na-eme 'turu ugo' n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Hon. Mohammad Lawal Nalado
2) Action Alliance (AA)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Etiaba Bennet Chukwuogo
Njirimara ha - E sere nnụnụ ọcha n'etiti kpakpando na-acha anụnụ anụnụ n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Hon. Adekunle Rufai Omoaje
3) African Action Congress (AAC)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Chidozie Wilson Nwankwo
Njirimara ha - E sere aka abụọ na-acha akwụkwọ ndụ na oji n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Dkt. Leonard Nzenwa
4) African Democratic Congress (ADC)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Nze Akachukwu Sullivan Nwankpo
Njirimara ha - E sere aka abụọ na-ekwe onwe ha n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Ralphs Okey Nwosu
5) Action Democratic Party (ADP)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Prince Ume-Ezeoke Afam Luke Douglas
Njirimara ha - E sere aka ji akwụkwọ a sapere asape n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Engr. Yabagi Yusuf Sani
6) All Progressives Congress (APC)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Emmanuel Nnamdi Andy Uba
Njirimara ha - E sere aka ji azịza n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - H.E Mai Mala Buni (onyeisi na-elekọta ya ruo mgbe a họpụtara onye ọzọ)
7) All Progressives Grand Alliance (APGA)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo
Njirimara ha - E sere ọkụkọ n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Dkt. Victor Ikechukwu Oye
8) Allied Peoples Movement (APM)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Onyejegbu Geoffrey Okwudili
Njirimara ha - E sere akpụ a bọpụtara n'ala n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Yusuf Mamman Dantalle
9) Action Peoples Party (APP)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Azubuike Philip Echetebu
Njirimara ha - E sere enyi n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Ikenga Imo Ogochinyere
10) Boot Party (BP)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Chika Jerry Okeke
Njirimara ha - E sere akpụkpọụkwụ n'ọkọlọtọ ha
Onyeisi ha - Adenuga Sunday
11) Labour Party (LP)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Agbasimalo Obiora Emmanuel
Njirimara ha - E sere ezinaụlọ nna, nne na nwa n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Ọkaiwu Julius Abure
12) National Rescue Movement (NRM)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Ezenwafor Afamefuna Victor
Njirimara ha - E sere aṅụ n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Sinetọ Saidu Muhammed Dansadau
13) New Nigeria Peoples Party (NNPP)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Ohajimkpo Leonard Emeka
Njirimara ha - E sere nkata mkpụrụosisi juru n'ime ya n'etiti maapụ Naịjiria n'ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Ambassador Agbo Gilbert Major
14) Peoples Democratic Party (PDP)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Valentine Chineto Ozigbo
Njirimara ha - e sere nche mmiri/anwụ n'etiti ọkọlọtọ ha.
Onyeisi ha - Sinetọ Iyorchia Ayu
15) Peoples Redemption Party (PRP)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Nnamdi Nwawuo
Njirimara ha - ọkọlọtọ pati a nwere agwa atọ; nke na-acha uhie uhie, nke dị oji na nke ọcha. E sere ntụghe igodo dị oji n'etiti ya bụ ọkọlọtọ.
Onyeisi ha - Mallam Falalu Bello, OFR
16) Social Democratic Party (SDP)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Obinna Chukwudum Godwin Uzoh
Njirimara ha - E sere ịnyịnya ọcha n'ọkọlọtọ pati ha.
Onyeisi ha - Dkt. Olu Agunloye
17) Young Progressive Party (YPP)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Ifeanyi Patrick Ubah
Njirimara ha - Ọkọlọtọ ha na-egosi aka ji ahịhịa ndụ, n'ime ọnụụzọ dị n'ime eserese maapụ Naịjiria.
Onyeisi ha - Cmrd. Bishop Amakiri
18) Zenith Labour Party (ZLP)
Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Okonkwo Obiora Francis
Njirimara ha - E sere ndị na-arịgo n'elu ubube.
Onyeisi ha - Ichie Dan Nwanyanwu