You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anambra election: Kedụ uru ndị otu nnyocha ntuliaka a kpọrọ 'election monitors' na bekee ga-aba n'Anambra steeti?
Ndị nkịtị abụghị ndị ọrụ gọọmentị ịnyocha ntụlịaka amaliteghị taa na Naịjirịa.
Kemgbe nụrụrụaka richara ibe ya elu na ntụlịaka e mere n'afọ 1964 nakwa nke e mere na ndịda anyanwụ n'afọ 1965, ya bụ ụgụrụ bụ nnyocha-ntụlịaka abụghịzị mbụ oyi na Naịjirịa.
Ihe ya bụ nnyocha ndị esoghị azọ ọchịchị dị oke mkpa maka na nchọcha nwaamdị Ademola Adebisi chọpụtara na ọ na-eme ka ọchịchị onye kwuo uche ya kwusie ọkpa ike n'ala dịka ọ ga-enyeaka ịme ka usoro ntụlịaka gbaa n'anwụ ma gbakwa mgborogwu.
Ọ bụ maka nrụrụaka ntuliaka nke gara aga mere Naịjirịa jiri webata nnyocha na ntuliaka malite n'afọ 1990.
Otu dị iche iche si mba ofesi bụ nke ihe Naịjirịa na-amasị na-abịa nnyocha na Naịjirịa isonye ndị nke Naịjirịa.
Ndị otu dị iche iche na Naịjirịa gụnyere otu nkwụụrụ onwe ha bụ 'Non-governmental Organisations' na Bekee, ndị ụka na ndị ọzọ chọrọ ịmata ka ya bụ ntụlịaka sị gaa na-abịa nyocha.
Nchọcha Adebisi kwuru na nyocha maọbụ ịgbaakabe nke ntụlịaka nyekwara aka ịkwalite ntụkwasịobi ndị mmadụ n'ọchịchị onye kwuoụche ya agbanyeghị na ọ nwere ụfọdụ ndị nke Naịjirịa na-emenyere ndị pati ha chọrọ n'ọchịchị.
Nke a mere e jiri chewe nnyocha maọbụ ịgba akaebe ntuliaka nwereike ịbụ ọgbatauhie karịa ngọzi nye ọchịchị onye kwuo uche ya.
Tupu a nabata ntuliaka dịka ihe e mere n'ụzọ kwụọtọ, ọ ga-abụ ihe igwe mmadụ kwere na o gosiri ụche ya.
Ndị ọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) nwekwara usoro ha depụtara ndị di otu a kwesiri iso.
Ụlọọrụ a na debe aha ndị niile chọrọ iso rụọ ya bụ ọrụ n'akwụkwọ ha ma nye ha akwụkwọ ikike ha ga-eji agagharị ụbọchị ahụ.
Ọ bụ akwụkwọ ikike dị otu a na-enye ha ohere ịba ebe niile a na-eme ntuliaka.
Gịnị ka ndị akaebe ntuliaka na-arụ?
Ndị nọ ọrụ nnyocha maọbụ ịgba akaebe ntuliaka na-apụ n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị ahụ yiri uwe na akwụkwọ ikike ha Bekee kpọrọ "ID card".
Ndị nọ n'ime obodo ga-eji ọkpa gawa wọdụ ebe a na-eme ntulịaka dị ha nso.
Ha ruo ebe ahụ, ha na-akọwara ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ Inec nọ be ahụ onwe ha.
Ha na ajụ ha ajụjụ dị iche ịche nke gụnyere ma ebutela akụrụngwa e ji arụrụ ọrụ?
- kedụ mgbe e jiri bute ngwongwo e ji eme ntụlịka ebe ahụ?
- Ntụlịaka amalitela?
- Kedụ mgbe ọ malitere?
- Ndị ọrụ nchekwa ole nọ ebe ahụ?
- E nwere ọgbaaghara ebe ahụ? Wdz.
- Ha na-edetu ọnụọgụ ndị debere aha maka ịtụ ya bụ vootu na mbụ.
- Nke a ga-enyere ha aka ịmata ka ọnụọgụ ndị tụrụ vootu ọ karịrị mgbe e mechere.
- Ha ga-ejikwa anya ha lee mara ka ha aga ahụ mpụ ọbụla nke mmadụ agaghị agwalị ha dịka ịzụ vootu, ire vootu, ịme ka mmadụ ghara ịtụ vootu, ịkwụ okwu ga-eme ka mmadụ tụnyere onye ọbụla n'ụzọ ọbụla, ma edere ya ede ma ekwuru ya n'ọnụ.
- Ha jụchaa ajụjụ maọbụ hụchaa ihe ndị a, ha edetuo ya, pụwazịa gawa ebe ọzọ mekwaa otu ihe ahụ.
- Ha na-ede ihe ndị a, ha na-ezipu ya ozugbo na Situation Room bụ ebe a na-ekpokata ya.
Ọ bụ ihe ndị a ka e ji amata ka ntuliaka ọ gara nke ọma ka ọ bụ na ọ gaghị.
Ugochi Agalaba-Ehiahuruike bụ onye nnọchịte anya CLEEN Foundation n'Anambra steeti nakwa onye otu Nigeria Civil Society Situation Room sị na ndị nnyocha ntuliaka na-enweta ọzụzụ pụrụiche na-enyere ha aka ị rụ ọrụ ha.
Ugochi sị na 'anyị amalitelarị ọzụzụ ndị bụ nke anyị na-enye ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche nakwa ụmụ ntorobịa, dịka ndị otu Ipob.
Ọ sị na ọzụzụ dị otu a ga-enyeaka ka ha mata ihe a tụrụ anya n'aka ha mgbe o ruru.
O kwuru na ndị ọgbakọ Situation Room ga-edupu ndị otu ha nọ n'Anambra ka ha ga gbaa akaebe n'okpuruọchịchị ha dị iche iche.
Ndị dị otu a ga-esi n'okpuruọchịchị ndị a zitere ha mpụtara ntuliaka dịka ọ na-apụta ozugbo ozugbo.
Ndị nnyocha ntuliaka ekwesighị itinye ọnụ n'okwu gbasara ịme ntuliaka ha na-enyocha kama ọrụ ha bụ ịkwu ihe ha hụrụ.