You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Inec Anambra Governorship List 2021: Lee kpọmkwem ndị niile INEC kwuru ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti
Ngalaba na-ahazị ntuliaka na Naịjiria bụ 'Independent National Electoral Commission' eweputela aha mmadụ iri na asatọ ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti.
Cheta na ọ bụ n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ka ntuliaka a ga-adị.
INEC wepụtara aha ndị a na mgbede taa bụ Tọzde, abalị asaa nke ọnwa Ọkụtoba.
Ka ọ dị ugbua, ọ fọla naanị abali iri atọ na isii tupu ụbọchị ya bụ ntuliaka eruo.
Lee aha ndị ha wepụtara nakwa otu ndọrọndọrọ ọchịchị ha nọ na ya:
Aha Soludo, Val Ozigbo adịbụghị n'akwụkwọ nke mbụ INEC wepụtara maka ntuliaka Gọvanọ Anambra steeti
Ngalaba 'Independent National Electoral Commission' ewepụtela aha ndị ga-eso zọọ ọkwa Gọvanọ n'Anambra Steeti.
Mana ihe gbara gharịị bụ na aha Chukwuma Soludo nakwa nke Valentine Ozigbo adịghị n'akwụkwọ nke Inec wepụtara.
Chukwuma Soludo bụ onye meriri ntuliaka imeụlọ nke pati APGA, ebe Valentine Ozigbo meriri nke PDP
Ọ bụ n'ehihie Fraịde ka Inec wepụtara akwụkwọ aha ndị ga-eso zọọ ọchịchị n'Anambra steeti.
N'ime akwụkwọ ahụ, aha mmadụ iri atọ na isii dị n'ime ya, nke gụnyere mmadụ iri na asatọ na-azọ ọkwa gọvanọ nakwa mmadụ iri na asatọ bụ osote ha.
A bịa na pati APC, onye aha ya dị ebe ahụ bụ Emmanuel Andy Nnamdi Uba, ebe osote ya bụ Johnbosco Okechukwu Anaedobe.
Mana na Pati APGA, onye aha ya dị ebe ahụ bụ Chukwuma Michael Umeoji, ebe osote ya bụ Orogbu Obiageli Lilian.
Na nke PDP, onweghị aha ọbụla e dere ebe aụ, kama ihe Inec dere bụ "court order".
Na YPP, onye aha ya dị ebe ahụ bụ Ifeanyi Uba, ebe osote ya Aloysius Izuchukwu Ekee.
Cheta na ndị PDP n'Anambra steeti kewara ụzọ abụọ n'ihi na ha na-azọ onye ga-abụ onyeisioche.
Mmadụ abụọ na-azọ ya bụ okwa nwechara akwụkwọ si n'ụlọikpe nke na-ekwu na ọ bụ ha bụ onyeisi n'otu n'otu.
Nke a mere ka ndị isi PDP n'Abujakposaa ọchịchị PDP nke Anambra, ọ ga-enye ha nsogbu na ntuliaka 'Primary' ha?ma jiri aka ha họpụta ndị ga-ahazi ntulaiaka imeụlọ na steeti ahụ.
Mana nke a mere ka otu PDP abụọ ahụ nọ n'Anambra mee ntuliaka imeụlọ icheiche, ma họpụta ndị ha kwuru meriri.
Otu nke mbụ họpụtara Valentine Ozigbo, ebe otu nke abụọ họpụtara Ugochukwu Uba.
Mana ugbua, Inec ekwuola na onweghị onye n'ime mmadụ abụọ a ha kwenyere na ya, n'ihi na ya bụ okwu ka dịn'ụlọikpe.
N'otu aka ahụ kwa, pati APGA kewakwara ụzọ abụọ n'Anambra steeti n'ihi esemokwu imeụlọ.
Mmadụ abụọ na-azọ ọkwa onyeisi oche na pati ahụ: ha bụ Victor Ike Oye na Jude Okeke.
Chukwuma Soludo nọ n'otu nke Victor Oye ebe Chukwuma Uneoji - onye nke Inec nabatara - nọ n'otu nke Jude Okeke.
BBC Igbo kpọtụụrụ Chukwuma Soludo mana o kwuru na ya achọbeghị ikwu ihe ọbụla ugbua.
Ebe ihe mgbu APGA nọrọ malite
Nsogbu malitere n'APGA n'afọ 2016 oge ụfọdụ ndị otu ahụ kwuru na ha achọzighị Victor Oye dịka onyeisi ha.
Ndị a gara n'ihu họpụta nwoke a kpọrọ Nwabueze Okafor ka ọ bụrụ onyeisi ha.
Mana o teghị aka, Okafor anwụọ; ha wee họpụta Martin Agbaso ka ọ nọchie anya ya.
Kamgbe ahụ, okwu onye bụ onyeisioche APGA n'Anambra steeti akọbeghị ụkọ n'ụlọ ikpe.
Bido na 2016 ruo taa, Ndị kwurula na ha bụ ndị isi APGA gụnyere: Victor Oye, Martin Agbaso, Edozie Njoku, na Jude Okeke.
Mana dịka o si dị ugbua, INEC egosila na ọ bụ Jude Okeke ka ha ma dịka onyeisi Apga.