Anambra Governorship Election: Obi siri m ike na m na m ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra - Chukwuma Soludo

Chukwuma Soludo ekwuola na obi siri ya ike na ọ ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti na ntuliaka a ga-eme na Nọvemba 6.

Soludo kwuru nke a na mkparịtaụka ya na Channels TV na mgbede Mọnde, dịka otu ụlọikpe dị n'Awka, Anambra steeti, nyere iwu ka INEC tinyeghachi aha ya dị ka onye ga-anọchi pati APGA na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti.

Mana ọtụtụ na-ekwu na ya okwu ebibeghị, n'ihi na ụlọikpe ka elu ekpebibeghị ya bụ ikpe.

Ka ọ dị ugbua, ụlọikpe 'high court' abụọ enyela mkpebi n'okwu gbasara APGA n'Anambara steeti, nke pụtara na ọ bụ ụlọikpe 'appeal court' ga-ekwuzi ihe Inec ga-eme.

Lee ihe bụ isiokwu

Cheta na ngalaba 'Independent National Electoral Commission' wepuru aha Soludo ma tinye aha Chukwuma Umeoji n'akwụkwọ ha biputara n'izuka gara aga.

Nke a bụ maka na pati APGA kere ụzọ abụọ ma nwee mmadụ abụọ na-azọ ọkwa onyeisioche, Victor Oye na Jude Okeke.

Otu ụlọikpe dị na Jigawa nyere iwu na ọ bụ Jude Okeke bụ ezigbo onyeisi Apga na Naịjirịa, ọ bụghị Victor Oye.

Nke a mere ka INEC were aha Chukwuma Umeoji, bụ aha nke otu Jude Okeke zigara, ma hapụ Soludo bụ aha otu Victor Oye zigara.

Mana taa bụ Mọnde ka ọkaikpe Valentine Okaa nyere iwu n'Awka na ọ bụ Victor Oye bụ onyeisioche APGA n'Anambra steeti, nke pụtara na ọ bụ ntuliaka nke ha haziri ka INEC ga-ewere.

Otu n'ime ndị enyemaka mgbasaozi Soludo bụ Mazi Ejimoro Opara gwara BBC Igbo na nke a mere eme n'ụbọchị Mọnde a.

Ejimofor kwuru sị: "Ọ bụ eziokwu na ụlọikpe ukwu steeti etinyeghachila Soludo dịka onye ga-anọchi anya APGA na ntuliaka Novemba 6."

"Ụlọikpe ahụ kwukwara na ọ bụ Victor Ike Oye bụ onyeisi APGA na Naịjirịa."

Ejimofor gara n'ihu kwuo na ọ dịziiri INEC ugbua itinyeghachi aha Soludo dịka ụlọikpe si nye iwu.

Ọ kọwara na ụlọikpe dị na Jigawa nke nyeburu iwu na Victor Oye abụghị onyeisi APGA enweghị ikike inye ya bụ iwu n'ihi na ebe esemokwu na-ada bụ n'Anambra.

Ndị ọkaiwu anyị ka na-agakwa okwu ya iji hụ na INEC tinyeghachiri aha Soludo.

Ihe Chukwuma Umeoji kwuru

Mana Azubuike Okafor, bụ onye na-akwado Chukwuma Umeoji gwara BBC na INEC agaghị eme ihe ụlọikpe ahụ dị n'Awka kwuru.

Okafor kwuru sị: "Okwu a nọzi n'ụlọikpe mkpesa bụ 'appeal court' ugbua, nke a pụtara na ọ gafeela ihe ụlọikpe steeti ga-ekpebi."

"Ka ọ dị ugbua, INEC ejirila mkpebi nke ụlọikpe Jigawa nyere rụba ọrụ. Ha eweputela aha ndị ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ, ha agaghị alaghachi azụ ugbua n'ihi mkpebi ụlọikpe nke dị n'Awka."

"Ọ bụ naanị ụlọikpe karịrị ụlọikpe 'hgh court' nwere ike ikwu ihe ọzọ INEC ga-ege ntị."