You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe mere ụlọikpe ji sị ka Ropo, nwunye Sunday Igboho, lawa be ya
Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ụlọikpe mba Bene Repọblik atọhapụla nwunye Sunday Adeyemo eji Sunday Igboho mara.
Ụlọikpe a yiharịri ụbọchị ikpe Sunday |Igboho tutu ụbọchị iri abụọ na isii bụ mọnde ọnwa Julai a, dịka ozi ruru BBC ntị kwuru.
Cheta na mba a jidere Igboho na nwunye n'ụbọchị Mọnde maka ịda iwu njem mba na mba.
Ozi BBC nụtara kwuru na ulọikpe ahụ nyeghachiri nwunye Igboho akwụkwọ njirimara o ji eme njem ma sị ya lawa.
Nwunye Igboho, Ropo, bụ nwa afọ mba Jamini. Ụlọikpe si na onweghị ihe ya bu nwaanyị mere.
Igboho na onwe ya ka ga-azara ọnụ ya dịka ngalaba uweojii a kpọrọ "Criminal Brigade" n'isi obodo Bene bụ Cotonu mana ekwughị mpụtara ya.
Kepu kepu sibu na o bụ n'ụbọchị Fraịde ka Igboho kwesiri ịga n'ihu ọkaikpe.
Ka ọ kwụ ugbua, amabeghị etu ọ ga-esi gaara Igboho dịka mba Naịjirịa na-agba mbọ ịkpọlata ya ka ọ bịa zara ọnụ ya banyere ebubo na ọ na-achọ ibuso obodo agha.
Igboho malitere bụrụ onye a na-anụ aha ya n'afọ 2021 dịka ọ pụtara na-ekwu na ya na-echekwa ndi ọdịda anyanwụ dịka ndị a na-ache na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi na-awakpo ha.
O mechara malite achụmta nwereonwe mba ọ sị a ga-akpọ "Yoruba Nation".
Na mwakpo ndị ngalaba uweojii a kpọrọ Department of State Services (DSS) mere na be ya n'ụbọchị Jụlaị 1, 2021, mmadụ abụọ ndi enyemaka Igboho nwụrụ ebe a nwụchiri mmadụ 13 n'ime ha.
Gọọmentị na-ebo ya ebubo na ọ na-akwakọ ngwa agha dịka ọ na-kpọ ka ndị mmadụ malite ime ngagharịiwe na Naịjirịa.