Enugu Golf Estate Shooting: 'Onye uweojii gbagburu di m anapụla mụ na ụmụ anọ anya anyị ji ahụ ụzọ'- Nwaanyị agbagburu di ya

Oluchi Orji di ya so na ndị onye uweojii gbagburu na Golf estate, GRA dị n'Enugu kwuru na a napụla ya na ụmụ anọ ya otu anya ha ji ahụ ụzọ.
Nwaanyị ahụ kwuru na di ya bụ Ndubueze Orji gara ịzụta ncha o ji asụrụ ụmụ ya akwa mgbe o zutere ọnwụ ya. Ha bụ ndị Abia steeti.
Oluchi kwuru na onye uweojii ahụ bụ onye Calabar gbagbuchara ndị ya na ya na-arụkọ ọrụ n'ụlọ ebe ọ na-eche nche ma pụta iro gbawa onye ọbụla ọ hụrụ n'ụzọ egbe.
O kwuru na ọ bụ ihe ndị bi n'ogbe gwara makana ọ gara akwamozu onye ọzọ mgbe ọdachị ahụ mere.
"Di m bụ Ndubueze Orji so na otu onye onye uweojii a gbara egbe n'afọ, tupu e buru ya gagharịcha n'ụlọọgwụ nile jụrụ ya ma butezia ya n'ụlọọgwụ Parklane, ọ nwụọla."
"Onye ga-azụrụ m ụmụ anọ di m a agbagburu hapụrụ m?", bụ ajụjụ nwute Oluchi kpụ n'ọnu.
Ndị bi n'ogbe kwuru ihe ha hụrụ

Ezinne ekwegba bi n'ogbe ebe ihe a mere kwuru na ha ma ya bụ onye uweojii nọkatara gbawa ndị mmadụ egbe aghara aghara na Golf Esate dịka Mopol.
Ọ gwara onye ntakụkọ anyị na ha amaghị eigbo aha ya.
O kwuru na onye uweojii ahụ na-egosibụ ụmụ agwa gosiri na uche ya achịkọtachaghị ọfụma mana o nweghị ihe ndị bi n'ogbe ji ya wee kpọrọ.
Ekweagba kwuru na o so na ndị bụgara di Oluchi Orji n'ụlọgwụ ebe e bugaziri ya n'ụlọ ozu dị ụlọọgwụ ESUT Teaching Hospital Parklane, Enugu makana Oluchi nwunye ya anọghị mgbe agbara di ya egbe. n'afọ.
Etu onye uweojii si gbagbuo mmadụ ise aka ha dị ọcha n'Enugu

Ebe foto si, Enugu Steeti góómenti
Mmadụ ise nwụrụ ebe mmadụ anọ merụrụ ezigbo ahụ oge onye uweojii nọkatara gbawe egbe n'ụlọọrụ RC Lotto dị na Golf Estate, GRA, Enugu, n'ụbọchị ụka (June 20,2021).
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Enugu steeti bụ ASP Daniel Ndukwe kwuru na ya bụ uweojii e si na Special Protection Unit (SPU) Base 9, Umuahia, Abia State, weta na-echere ụlọọrụ ahụ nche.
Nke a mere ka gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi gaa leta ndị merụrụ ahụ n'ọdachị ahụ n'ụlọọgwụ ESUT Teaching Hospital Parklane, Enugu ebe ha na-anata ọgwụgwọ.
Gọvanọ Ugwuanyị n'ozi o si n'aka kọmishọna mgbasa ozi ya bụ Chidi Aroh wepụta ụnyahụ gosiri ịtụ n'anya ya gbasara ọdachị a.
O tiri ndị niile a ọdachị a metụtara nakwa ezinụlọ ha aka n'obi ma kwuo na ọchịchị ya ga-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ ọgwụgwọ ha ga-eri.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ. Lee ihe ọ hụrụ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post

Ebe foto si, Enugu Steeti Enugu
Ọ gwakwara ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ ọ bụ ọkammụta Hyacinth Onah nọ n'isi ya na ha nye ndị niile a ọdachị a metụtara ọgwụgwọ zuru oke ruo mgbe ha gbakere.
Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugu wepụtaburu ozi na ha anwụchiela ya bụ onye uweojii gbagburu mmadụ ise ma merụọ anọ ahụ mgbe ọ nọ ọrụ ụlọọrụ RC Lotto Company, Golf Estate, GRA, Enugu.
O kwuru na onye uweojii ahụ ha na-akpọpụtaghị aha ya ga-anọgide n'aka ndị uweojii ruo mgbe e mechara nyocha etu ya bụ ọdachị si mee.
Ndukwe depụtakwara na mmadụ anọ merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ ebe ndị dọkịta nọ ọrụ n'ụlọọgwụ adọnyela ozu mmadụ ise nwụrụ n'ọdachị a n'ụlọ ozu dị n'ESUT Teaching Hospital Parklane, Enugu.
O kwuru na kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mohammed Ndatsu Aliyu ekwuola ka ndị niile hụrụ mgbe ọdachị a mere nye ha akụkọ ga-eme ka nyocha ha na-eme ga-ọsịsọ ma nweta ikpe kwụ ọtọ.









