Ehime Mbano: Etu e si jiri ụtụaka kụgbuo otu nwoke gbagburu mmadụ abụọ n'obodo ahụ

Ndị ntoroọbịa

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwoke ji egbe gbagbuo mmadụ abụọ n'Ehime Mbano, Imo Steeti ezutela ọnwụ nke ka ndị mmadụ tụrụ ya ụtụ aka.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steetị bụ Orlando Ikeokwu sị na nke a mere n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Eprelụ 2021.

Nwoke a aha ya bụ Chidubem Mbamara gara n'ụlo ebe a na-agba chaachaa ma gbaa chaachaa ego dị narị naịra isii (N600).

Mana o jizughi ego, o nyere ekwentị ya sị ka ọ gaa wetezuo ego, mgbe ọ lọghachịrị o nyere ha narị naịra ise na iri ise (N550).

Nke a butere esemokwu n'etiti Chinedu Mbamara na Henry Obi bụ onye nwe ụlọ chaachaa ahụ.

Ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Dịka nke a mechara, Mbamara pụrụ ma gaa buru egbe lọghachịte, o ji egbe ahụ gbaa Henry Obi na mmadụ abụọ ndị ọzọ; gụnyere Chibuike Iwunze na Ebuka.

Nke e mere ndị mmadụ nọ ebe ahụ ji malite ịkụ ya Chidubem Mbamara ihe ma kụgbuo ya.

Henry Obi na Ebuka nwụrụ n'ọgwụgwụ site n'egbe ahụ Mbamara gbara ha ebe Chibuike Iwunze ka dị ndụ na-anata ọgwụgwọ.

E tinyela ozu mmadụ atọ ndị a nwụrụ anwụ (Chidubem Mbamara, Henry Obi na Ebuka) n'ụlọozu.

Ndị uweojii Imo Steetị dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara iji aka ikpeikpe na ịbọ ọbọ kama ka ha gbaara ndị uweojii ama.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: