Imo State Isopadec: Ihe mere gọọmentị Imo steeti ji chụọ mmadụ 108 n'ọrụ

Hope Uzodimma

Ebe foto si, Twitter/Hope Uzodimma

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Aka na achi steetI Imo bụ Hope Uzodinma achụọla mmadu di otu nari na asatọ bụ ndi ụlọọrụ 'Imo State Oil Producing Areas Development Commssion' (ISOPADEC.)

Ozi si na aka Gomenti Imo kwuru na ihe kpatara e ji chụọ ndị ahụ bụ maka na e si n'azụ ụlọ wee ha n'ọrụ oge Rochas Okorocha nọ n'ọchịchị.

Ọnụ na-ekwuru ISOPADEC bụ Ekeh Promise Onyekachi kwenyere na esi n'ụzọ iwu na akwadoghi wee ndị ahụ n'ọrụ.

Onyekachi kwukwara na sọsọ ọchụchụ a chụrụ ndị ọrụ agaghi ewetacha mgbanwe tọrọ atọ na ya bụ ulọ ọrụ.

Otu onye n'ime ndi ọrụ a achụrụ achụ aha ya bụ Ifereze Victor, katọrọ agwa gọmeenti imo kpara.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

O kwuru na esi n'ụzọ iwu kwadoro wee ha n'ọrụ.

Ifereze Victor kwuru na ọtụtụ n'ime ha bụ ndị obodo ebe e si amịta mmanụ nakwa gaasị nke na-enye Imo steeti ego.

"O kwesịghị ka anyị bụ ndị obodo ebe e si amịta mmanụ bụrụ ndị na-enweghị ọrụ," Ifereze Victor na-ekwu.

Cheta na ndị ọrụ ISOPADEC nọrọ n'izụka olemole gara aga mee ngaghari mkpesa, gba abụbụ ọrụ, ma gbachie isi ụlọ ha di n'Owerri n'ihi nchabi ụgwọ ọnwa ha nakwa ụgwọ ochie nke gọọmentị ji ha.