Joe Biden: Onyeisiala mba Amerịka enyela iwu ka ejikọọ ụmụaka ekewapụrụ ha na nne na nna ha mgbe ha chọrọ ịbata Amerịka

Joseph Biden

Ebe foto si, Reuters

Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden enyela iwu atọ nke ga-ahụ na ụmụaka ha na ezinụlọ anọghị na mba Amerịka maka iwu Donald Trump tinyere ga-enwe ohere ka ndị nke ha nọnyere ha n'Amerịka.

Trump hiwere iwu ndị a iji gbochie ndị mmadụịbata mba Amerịka.

Oge Trump nọ n'ọchịchị ha anaghị ekwe ka nne na nna na-enwezughị akwụkwọ njem soro ụmụ ha bata Amerịka.

Iwu ọhụrụ a Biden wepụtara ga-ehiwe nzụkọ nke ga-ahụ na ụmụaka ruru narị asaa na nne na nna ha ga-anọkọta dịka ezinụlọ n'Amerịka.

Dịka o siri dị, ụmụaka opekete mpe puku ise na narị ise ka ekewapụrụ ha na ndị okenye du ha n'oke mba Amerịka site n'afọ 2017 ruo 2018.

Lee iwu ndị ọzọ Joe Biden tinyere aka maka ndị njem

Onyeisiala ọhụrụ nke mba Amerịka bụ Joe Biden amalitela ọrụ ịtụgharị ụfọdụ iwu Donald Trump mere mgbe ọ nọ n'ọkwa.

Biden mere nke a n'ime elekere ole na ole e duchara ya n'iyi ọrụ n'ụbọchị 20 ọnwa Jenụwarị, 2021.

O binyere aka n'ime iwu ruru iri na asaa (170 ọkachasị n'ihe banyere etu a ga-esi busoo ọrịa covid-19 agha.

Ihe ndị ọzọ metụtara ndị mbịara mbịara, mgbanwe ihu eluigwe, nakwa mmekọ agbụrụ na ibe ya.

Kedụ iwu ndị o binyere aka na ya?

Aha onyonyo, Onye bụ Joe Biden bụ onyeisiala ọhụrụ mba Amerịka

Akwụkwọ ozi si n'obi gọọmentị nke depụtara iwu ndị a kọwara na oge eruola a ga-eji "megharịa ihe ndị ọchịchị Trump mebiri"

Ụfọdụ n'ime ha gụnyere:

- Iwu ikpuchi ihu n'ụlọọrụ gọọmentị etiti niile.

- Ụlọọrụ ọhụrụ ga-elekọta ihe gbasara nkwụsị mfesa coronavirus.

- Ịkwụsị usoro Trump malitere ịpụta n'ọgbakọ World Health Organisation (WHO).

- Isonyekwa na "Paris climate agreement" na-ahụ maka ọdịmma ihu eluigwe.

- Mwepụ ikike e nyere ụlọọrụ Keystone XL Pipeline.

- Mwepụ ego a mapụtara ịrụcha mgbidi kewara mba Amerịka nakwa Mexico.

- Mwepụ mmachi njem e tinyere n'ụfọdụ mba okpukpere alakuba.

Aha onyonyo, Ihe ịkwesịrị ị maka Bill Biden bụ nwunye onyeisiala ọhụrụ Amerịka

Ihe ọzọ pụtara ihe bụ na ya na onyeisiala mbụ ya na ya ga-enwe mkparịtaụka bụ Justin Tredeau nke mba Kanada.

Mkparịtaụka ha nke ga-eme n'ụbọchị Fraide ga-emetụta okwu Keystone XL Pipeline nke agbụrụ ndị Native Amerikans na-eme ngagharịiwe maka ya kemgbe afọ iri.