You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Tracy Zille: Onye bụdị Tracy Zille a ndị Nigeria kpụ n'ọnụ na soshal midia?
Kemgbe o wepụtara na nsonso a ozi ndị e nwere ike ịkpọ 'ikpu nkata n'ihu gwa eze okwu' nke metụtara ndị isiojii Afrika na ndị ndu ha, aha @TracyZille na-ewu na Twitter na Naijiria nakwa Afrịka niile.
N'ozi o wepụtara n'ụtụtụ Wenezde, abali isii nke ọnwa Jenụwarị afọ 2020, Tracy Zille kwuru na "ndị ndu Afrịka na-aga ụlọọgwụ ala Bekee. Ọ bụrụ na e mepụtara ọgwụ mgbochi n'Afrịka, ndị ndu Afrịka ga-ahapụ ya gawa Alabekee ịga gba ọgwụ mgbochi."
Ọ gara n'ihu kwuo na ọrịa Covid-19 bụ ihe ncheta na ndị mpụ na-edu Afrịka enweghị mgbe anya ha dị n'ọganihu Afrịka.
Okwu ahụ dịka ịwasara ahụhụ nnu Bekee dịka ọtụtụ ụmụ Afrịka ruru otu puku tinyere ọnụ n'okwu akụ , ebe ndị ọzọ kekọrịtara ya na-egbughị oge.
Ihe ndị mmadụ na-ajụ bụ onye bụ 'nwaaanyị' a obi kara ịkpọ okwu aha na atụghị ụjọ ọbụla ịgwa ndị isiojii Afrịka ebe ha si adajọ n'okwu mmepe obodo na ọganihu mpaghara ahụ?
N'akara Twitter ya, naanị ihe ị ga-ahụ dịka nkọwa onye ọ bụ bụ "Aha m bụ Tracy Zille. Nke a bụ ọba ozi m," nakwa foto nwaanyị onye ọcha.
Mana, na-agbanyeghị na ọ bụ n'ọnwa Juune afọ 2020 ka o mepere ọba ozi ahụ nke e chere n'ọ bụ onye Saụt Afrịka nwe ya, mana ọbaozi ya na-apụ ọkụ dịka o nwere mmadụ puku iri ise na itoolu na ụma isii(59,600 ) na-eso ya na Twitter.
A na-eche na ọ bụ okwu na-ese okwu ọ na-edepụtakarị bụ ihe na-adọtara ya ndị mmadụ.
Nke a bụ n'ihi na oge ụfọdụ, Tracy Zille na-akwa ndị isiojii emo maka ọnọdụ "ohu" ha nọ na ya n'ihi ihe ndị ndu ha nakwa ndịọcha gbakọtara aka na-eme ha.
Ngalaba na-ahụ maka ikike dịrị onye na Saụt Afrịka bụ South African Human Rights Commission (SAHRC) kwuru n'afọ 2020 na ha ga-akpụpụ onye nwe ọbaozi Tracy Zille nke ha akpọghị aha ya ụlọikpe maka okwu asị (hate speech).
Mana onye bụdị 'Tracy Zille'
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụta Tracy Zille ka nwaanyị onyeọcha onye Saut Afrika na-agba mbọ maka ọdimma ndị isiojii Afrịka.
Mana ndị ịma ihe ekwe na-akụ na-ekwu na ọ bụghị nwaanyị nwe ọbaozi ahụ, kama ọ bụ ọbaozi adigboroja nke otu onye ndọrọndọtọ ọchịchị Saut Afrịka ji achụ akpa ya.
A na-enyo ọbaozi Tracy Ville dịka nke e ji arata ndị mmadụ site n'ikwu okwu na-akpa oke agbụrụ(Saụt Afrịka bụ ebe oke agbụrụ nnwere ntọala) iji dọta ndị mmadụ gaa na websaiti atọ ebe a na-agbasa ozi maka ịnweta ọrụ iji si na ya rite ego 'Google Adsence' maka mmadụ ole a dọtara na websaiti ahụ.
Ụlọọrụ na-eme nchọpụta maka akụkọ ụgha a kpọrọ 'Africa Check' kwuru na Tracy Zille bụ akara obaozi adigboroja.
AfricaCheck na ụlọọrụ nnyocha miri emi nke Atlantic Council nwe bụ "Digital Forensic Research Lab" (DFRLab) gbara n'anwụ na @TracyZille bụ ọbaozi adigboroja nke otu na-agba onya ego nke otu onye n'ime otu "Economic Freedom Fighters (EFF), nwe."
Economic Freedom Fighters (EFF) otu ndọrọndọrọ ọchịchị mba Saụt Afrịka na-anọghị na gọọmenti nke onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama bụ Julius Malema hiwere n'afọ 2013.
Ewezụga, ịgbasa ozi na-ese okwu,Tracy Zille na-ejikarị akara Twitter ya agbasaozi ọrụ maka ndị na-achọ ọrụ.
'Africa Check' na-akọwa na websaiti atọ ndị Tracy Zille na-adọga ndị mmadụ na ya bụ nke otu nwoke a ma ama mana nwoke ahụ agọọla na o nweghị ihe gbasara ya n'akara Tracy Zille.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- Eastern Security Network: "Anyị akwadoghi mba ọgụ Nnamdi Kanu na-abara ndị gọvanọ"
- Gịnị ka akpa, abụzụ na nri ndị ọzọ na-eyi ndị mmadụ izizi ndị Igbo na-eri oge gboo na-enye n'ahụ?
- Orji Uzor Kalu akpọọla oku ka APC na PDP nye ndị Igbo ohere na 2023
- Nkwenye ndị Igbo oge gboo banyere ịlọụwa, agwụ, ọgbanje na ihe dị ọzọ metụtara ọnwụ na ndụ
- Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwu