Pandemic Prevention Fee: Ihe anyị ma maka ụgwọ a sị ụmụakwụkwọ ABSU kwụọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụmụ akwụkwọ mahadum steeti Abia bụ ABSU egosila iwe ha maka ụgwọ 'Pandemic Prevention fee' nke a sị ha kwụọ.

N'ime akwụkwọ ozi na-efegharị na soshal midia, a sị ha kwụọ "Pandemic Prevention fee ruru puku iri na ise iji nwe ohere denye aha ha ma lee ule".

Ha kwukwara na agụmakwụkwọ ga-ebido n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Nọvemba.

Onyebuchi Ememanka na-ekwuchitere Gọvanọ Okezie Ikpeazụ ọnụ gwara BBC Igbo na ego ahụ bubu naira puku iri abụọ na ise, mana mgbe ya na ndị isi ụlọakwụkwọ nwere nzụkọ n'ụbọchị Wenzde, o kpebie ịwedata ya bụ ego rue naira puku iri na ise.

Ememanka kwuru si: "ọ bụghị m ka ọ dịrị ịkọwa ihe ya bụ ụgwọ pụtara nakwa ihe a ga-eji ya mee, ọ bụ Mahadum ahụ ka ọ dịrị"

O kwukwara na gọọmentị agaghị enweike ịkwụrụ mmadụ niile ụgwọ ịme nyocha maka covid-19.

Ndị Mahadum ahụ nakwa ndị ntoroọbia ndị ọzọ ka na-akatọ ya bụ iwu.

Onye dị ka Benson Ibeabuchi na-ajụ ma ụgwọ ahụ a ga-echekwa ha n'ebe ọrịa ahụ dị

Onye ọzọ bụ Glory na-ekwu ka ndị Mahadum ahụ kwụsị ịkapụ mmadụ ego n'aka.