Ondo State election results 2020: Rotimi Akeredolu emeriela ntuliaka gọvanọ maka afọ anọ ọzọ

Ebe foto si, Twitter/Akeredolu
Gọvanọ Ondo steeti bụ Rotimi Akeredolu emeriela ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na Ondo steeti n'ụbọchị Satọde.
Nke a pụtara na ọ ga-achịkwa Ondo steeti afọ anọ ọzọ ruo afọ 2024.
Rotimi Akeredolu meriri n'okpuru ọchịchị iri na isii n'ime okpuru ọchịchị iri na asatọ dị na Ondo steeti.
Lee maapụ na-egosi mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Ondo steeti.
Pia aka na maapụ gosiri okpuruọchịchị 18 dị na steeti ahụ ka ị hụ paati na-emerinu ugbua nakwa etu ndị mmadụ si tụ vootu.
Nsịrịpụta; INEC

Igodo maapụ
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Anya anyị na-ahụ mpụtara dịka a na-akpọpụta ya ma na-edepụta ya ozugbo a na--akpọpụta ya.









