Anyị amaghị na ụmụakwụkwọ Naijiria nọ China sị na ha agaghi akwụnwụ ụgwọ 'evacuation' - Air Peace
Ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ Ụgbọelu Air Peace bụ Stanley Olisa gwara BBC Igbo na ha amaghị maka mkpesa ụmụakwukwọ Naịjirịa gụchara na Chaịna kpesara banyere ego eji agba ụgbọelu ha eji alọta.
Maazị Olisa sị na ya amachaghị ego ole a sị ka ndị ga-eso na njem nlọta a kwuọ, mana ọ bụ ngalaba na-ahụ maka Naijirịa na Chaịna ka ọ di n'aka.
Ụmụakwụkwọ Naijiria a gụchara na mahadum mba Chaịna n'afọ 2020 tọrọ na mba ahụ n'ihi mmachi obodo dị na mbaụwa nke ọrịa coronavirus butere.
Dịka ha siri kọwaa, ihe karịrị ụmụakwụkwọ narị abụọ (200) ndị gụchara akwụkwọ mahadum nsonso a bụ ndị ihe metụtara.
Ha gwara BBC Igbo na gọọmentị Naijiria na Ụgbọelu 'Air Peace' nwere nkwekọrịta ibulata ha, mana ụgwọ ụgbọelu nke bụ otu puku dọla na narị anọ ($1,400) nke ruru puku narị isii na iri ise na asatọ (N658,000) na Naịra, karịrị ha aka n'ihi na ọ bụ mmaji atọ ihe a na-akwụbu maka ife ụgbọelu.
Otu n'ime ụmụakwụkwọ ndị ahụ nke achọghị ka a kpọọ aha ya, gwara BBC Igbo na"Ụdịrị mmadụ dị iche iche tọrọ na Chaina; ụfọdụ ndị ojiegoachụego, mana ndị ọ kachasị metụ bụ ụmụakwụkwọ."
"Ọtụtụ ụmụakwụkwọ nke a metụtara bụ ndị nwetara ohere agụmakwụkwọ n'efu, ha enweghị onye ga-akwụrụ ha ụgwọ a."

Ebe foto si, Úmú Naijiria
Ebe okwu ha siri ka njọ bụ na oge e nyere ha n'akwụkwọ njem nke Bekee kpọrọ 'visa', ga-ebi n'abalị iri atọ na otu nke ọnwa Julaị, nke afọ 2020.
Mba Chaịna nyere ha amara ọnwa abụọ ọzọ, mana ha tụrụ arịrị na ha enweghị ego nri na ụgwọ ụlọ dịka ha enweghị akwụkwọ ikike ịrụ ọrụ na mba Chaịna.
Nsogbu ọzọ ha nwere bụ na ha amabeghi ụbọchị gọọmenti ga-abịa ebulata ha iji mata etu ha ga-esi akwado onwe ha maka irute n'ọdọụgbọelu.
Mbọ BBC gbara ịnụta olu onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ụmụ Naijiria bi n'ofesi bụ NIDCOM n'aha ịchafụ, amịtaghị mkpụrụ dịka onyeisi ha bụ Abike Dabiri-Erewa asabeghị ozi e zigara ya n'ekwentị oge akụkọ a na-apụta.
BBC gbakwara mbọ inweta ndị nnọchịte anya Air Peace, mana onye nke zara ekwentị ya sị na ya enweghị ikike ikwu okwu banyere okwu a.

