Covid-19 : 'Gọọmentị si anyị kwụọ N545,600 maka isi Chaịna lọta'

Naijiria. esonyela ọtụtụ mba dị iche iche na-agba mbọ ịkpọlata ndị nke ha nọ mba dị ọzọ maka Coronavirus na-awakpo ụwa niile ugbua.
mana ụmụ Naijiria nọ Chaịna na-atụ arịrị maka nnukwu ego gọọmentị na-ana ha iji kpọlata ha, nke ha kwuru dị oke ọnụ.
Nwaafọ Igbo na-agụ akwụkwọ na mba Chaịna aha ya bụ Chukwuma Nzube gwara BBC Igbo na, a gwara ndị chọrọ ịlọta ha kwụọ N545,600 bụ ụgwọ ụgbọelu, dịka gọọmenti etiti na ụlọorụ AirPeace kpebiriela ị bịa buru na nabalị iri na asatọ nke ọnwa Mee.
O kwuru na a gwara ha ka ha kwụọ ụgwọ a tupu ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Mee afọ 2020.
Mana ụfọdụ ụmụ Naijiria nọ Chaina na-atụ arịrị na ego ahụ karịrị akarị.
Dịka otu onye n'ime ha bụ Michael Okeke sị kwuo, "Kedu ihe e ji sị anyị kwụọ $1,240 maka ịlọta? Anyị nọ n'ime ụlọ ọnwa atọ. Kedu ebe ego a ga-esi bịa?"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ebe Idogwu Obiora kwuru sị na "ndị nọ na Chaịna na-edi mmegbu , oteela aka anyị chewara ka gọọmentị bịa kpọpụ anyị".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'otu aka ahụ, Akachukwu Nnenna Grace kwuru sị " ọtụtụ ndị mmadụ enweghị ego. Ụfọdụ enweghị ụlọ ma ụfodu enweghị ego ha ji eri nri."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Nzube kọwara na tupu coronavirus ebido, na ihe ha na-akwụ erụghị ego a gọọmentị sị ka a kwụọ.
Ọ kọwawara na a na-akwụ N200,000 maka isi Chaina lọta Naijiria, ebe o na-eri 480 ije ma lọtakwa Chaina.
Mana Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyema kwuru na ọ ghọtara na ihe siri ụmụ Naijirịa nọ na Chaina ike kama ya na ngalaba gbata gbata bụ NEMA na-atule etu ha ga-esi wetulata ụgwọ ndịa ga-akwụ.
N'otu aka ahụ o kwuru na Naijirịa adịla njikere maka nlekọta na idopu ndị a kpọtara iche.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
N'abalị Wenezde, a kpọlatara ụfọdụ ụmụ Naijiria dị 256 site na Dubai.










