Anambra state: Lee ihe Eze Umumbo na Omor kwuru maka ọgbaaghara dara n'etiti ha

Dịka ọgbaaghara dara n'etịtị obodo Omor na Umumbo, ọtụtu akụkọ na-efegharị n'Intanetị kama onweghị onye ma nke bụ eziokwu.

Mana otu ihe pụtara ihe bụ na ọ bụ nsogbu ala butere ya bụ esemokwu.

Ndị mgbasaozi nke Anambara steeti kwuru na mmadụ iri ise bụ ndị a na-achọ achọ ebe ihe ruru mmadụ narị atọ bụ ndị e ji mgbọ egbe na obejiri merụọ ahụ.

BBC kpọtụrụ ndị uweojii na ndị Eze obodo abụọ a ka anyị mata ihe mere.

Ihe ndị uweojii kwuru

Ndị uweojii kwuru na ọ bụ otu onye nwụrụ ebe mmadụ anọ merụrụ ahụ.

Ha kwukwara na ha ejidele mmadụ asatọ aka ha dị n'ihe mere.

Ihe ndị Eze obodo ndị a kwuru.

Igwe Oranu Chidume nke obodo Omor na Igwe Solomon Ikechukwu Chidubem nke ndị Umumbo kwuru na ha bụ ụmụnne na-emekọ nke ọma.

Ha kwuru na ọ bụ ndị na-akọ osikapa bụ ndị butere ya bụ okwu.

Gere ihe ha kwuru n'uju ya ebe a.

Dịka ọ dị ugbu a, ndị nchekwa nọ n'obodo abụọ ndị a. Ugbụ a bụzị oge udo dịka ndị Eze abụọ siri kwụọ na ha na-agba mbọ ihu na udo batara n'obodo abụọ ndị a.

Akụkọ ga-amasị gị