'Ihe ga-akwụsị ọgụ Agila (Benue) na Ngbo (Ebonyi) bụ itinye oke-ala'- Onyeisi Ohaukwu LGA

Onye isi ọchịchị Ohaukwu LGA bụ Mazi Clement Odah kwuru na ogbugbu ndị Agila si na Benue gburu ndị Ngbo be ha bụ ihe ịgba anya mmiri.

Odah kwuru na ha agwala ndị National Boundary Commission ka mgbe ọtụtụ afọ ka ha tinye oke-ala ga-eme ka esemokwu ala na ogbugbu mmadụ ahụ dị ka mgbe afọ nari n'etiti Ebonyi na Benue bịa n'isi njedebe.

O kwuru na ugbua nani mmadụ itolu nwụnyụrụ anya pii, ma gbakwaa ndị mmadụ ume na igbu mmadụ akwụsịla na Ngbo ugbua.

'Nsogbu ala kpatara ejiri bepụ nne m isi'

Nsogbu ala ahụ dapụtara n'etiti ndị Ngbo dị n'Ebonyi steeti na Agila dị na Benue steeti ataala isi mmadụ karịrị iri.

Ọgbaaghara ahụ malitere n'ụtụtụ ụbọchị Tuzde abalị iri nke ọnwa Maachị oge ndị Agila kere ekike ọgụ wakpoo ndị Ngbo na atụghị anya, ma gbuo mmadụ itolu pii ebe, ndị ọzọ egbukasịrị mma nọkwa n'ụlọọgwụ dị iche iche n'agbata ọnwụ na ndụ.

Mgbe BBC batara n'obodo ahụ, ọ dị ka ebe a gbara ọsọ agha dịka ọgụ na-ada mere ọtụtụ ndị obodo gbaa ọsọ, ebe ndị ọrụ nchekwa juputara ebe ahụ.

Otu nwoke bụ Eugene Edenyi ji anyammiri kọọrọ anyị na ya nọ n'ụlọ ya n'Abakaliki bụ isi obodo Ebonyi steeti oge a kpọrọ ya ka ọ gbata na mkpamkpa akpaala na be ha.

Maazi Edenyi kwuru na ọ bụ ihe dịka elekere 10:30 nke ụtụtụ, mana tupu ya alọta n'ụlọ ndị mwakpo ahụ egbuola nne ya bepụ ya isi ma burukwa isi ya laa.

O kwuru na ụbọchị ahụ ozu mmadụ itoolu ka ha butere ma kwuo na ụfọdụ ndị emerụrụ nnukwu ahụ ka ha na anụzi ozi ugbua na ha anwụọla.

Onye so na otu ndị ntorobia na-achịkọta obodo Ngbo bụ Samuel Okpor kọwara na ọ bụ ndị yi uwe ndị agha Nigeria gburu ndị Ngbo.

Okpor boro ebubo na ọgụ ala ha na ndị Agila anọla ihe dịka afọ nari nke tagoro isi ihe karịrị nari mmadụ.

O ji anya mmiri boo ebubo na ndị agha Naijiria batara na Ngbo izu ụka gara aga sị na ha na achọ ọtụ onye agha navy nke batara na Ngbo mana ahụghịzị ya, ha gwakwara ha na onweghị onye hụrụ nwoke ahụ na Ngbo.

Na agbanyeghị asisa ha nyere ha, ndị agha ahụ bụ ndị ha na asị na ha na arụrụ ndị Ajila ọrụ batara ulo ndị mmadụ otu na otu sị na ha chọrọ ihụ ya bụ nwaamadị, ruo ụbọchi tuzde mgbe ndị Agila wakporo ha ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ.

Okpor kwara arịrị ma ndị Agila nwere ọtụtụ ụmụ ha n'ọrụ ndị agha, ndị uweojii nakwa 'civil defence', nke mere na ha na-ejikari ndị ọrụ ndịagha na ndị uweojii awakpo ha.

'Aka ndi ọchị ehi adịghị n'okwu a'

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Obianuju Udah sị na mwakpo mere n'okpuru ọchịchị ime obodo Ohaukwu butere ogbugbu mmadụ bu mwakpo sitere n'esemokwu dị n'etiti otu obodoakporo Ngbo na ọzọ akpọrọ Agila dị n'okpuru ọchịchị Ardo na Benue steeti.

Ndị uweojii kwuru na onyeisi ndị nche nọ n'Ohaukwu wetara ha mkpesa, mgbe ha ruru, "ha hụrụ na otu nwoke bụ Fidelis Ali Omem (70) na otu nwaanyi bụ Helen Ali nakwa mmadụ asaa ndị ọzọ nwụnyụru anya n'aka ndị ahụ ebe otu nwoke bụ Titus Ugadu (50) ji ndụ ya gbalahụ ọnwụ ma nọro n'ụlọogwụ ugbua".

Ha hukwara na ndị ajọ mmadụ ahụ gbara otutu ụlọ na ọba ji ndị mmadụ ọkụ.

Nwaada Odah sị na esomoku a abụghị ihe ọhụrụ, ma sikwa na agbaghanyeghi ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia, ọ bụghị ndị Fulani na-achị ehi kpara mkpa mkpa.

Ọ sịkwa na ọ bụ unyaahụ ka ha nwetere ozi maka ihe mere mana ndị ọrụ ha agaala ebe ahụ maka nchekwa.

Odah sị; "O bụ eziokwu na-egburu mmadụ na mwakpo a mere n'ime abalị. Anyị ga-ewepụta ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ụtụtụ a."

Otu onye mpaghara Ngbo aha ya bụ Uche Ali gwara BBC na ndị kpara mkpa mkpa a yi uwe ndị agha

Ọ sị, "Ọ bụ makana ha yi uwe ndi agha mere ha jiri gafee nwuo ga-ebe anaghịdi azọ ala ka gbusisia mmadụ. Ha che n'ọbụ ndi agha na-abịa, ha amaghị na ọ bụ ndị iro."

Ali sị na iwe dị ndị mmadụ n'obi.

Ọ sị, "Ọ bu ili ndi egburu ka anyị na-eme ugbua. Mana iwe juru ndi mmadụ n'obi."

Onyisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ Awosola Awotinde emeela njem nkasiobi ebe ahụ ịga tie ndị ihe ahụ metutere aka n'obi.

Awotinde Ji ohere ahụ rịọ ndị mmadụ ha dere juu ma ghara ime ihe ga-eme ka ya bụ okwu kawanye njọ.

Ọ si na ya bụ mwakpo bụ ọnwụnwa ịbịa mebie atụmatụ gọọmenti etiti na nke steeti hibere maka ikpezi ya bụ okwu diwara kamgbe.

Awotinde nọkwa ebe ahụ kwuo na ndị ọrụ ndị National Boundary Adjustment Commission etinyela 26 Maachi 2020 dịka ụbọchị ha ga-eme njem nchọpụta na Makurdi, Benue steeti.

Ọ sị ndị mmadụ ha wepụ anya na asịrị na-efegharị na sochal media bụ nke nwere ike idufu ha ụzọ.

Esemokwu abughi okwu taa

Esomokwu dị n'etiti obodo Ngbo na Agila eteela aka.

N'afọ 2019, n´ọnwa Mai, egburu mmadụ anọ so na kọmiti gọọmenti Ebonyi na Benue hibere maka ịhụ etu a ga-esi kwụsị esomokwu a.

Ndị egburu bu ndị Ngbo na-aga nzukọ kọmiti na Benue. Ihe mere ka o mere izuụka ehibere kọmịti a.

N'ọnwa Ọktoba 2019, Osote Onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osinbajo kpọrọ aka na-achi steeti Benue bụ Samuel Ortom na Osote aka na-achi Ebonyi bụ Kelechi Igwe nzukọ n'obi gọọmenti n'Abuja ma okwu a.

Ndị nwụrụ maka okwu n'afọ 2018 karịrị ise.

Onye nnọchịte anya ngalaba na-ahụ maka oke ala Bekee kpọrọ "National Boundary Commission" sokwa na nzukọ ahụ Osinbajo kpọrọ.

Uche Ali sị na ọ bu eziokwu na okwu eteela, ọ bụ n'afọ gara aga ka ọ malitere ọzọ.