Orji Uzor Kalu: Ụlọikpe kachasị akụchapụla ikpe a mara ya maka nrụrụaka

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Aka chịburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu ga-esi n'ụlọ mkpọrọ pụta.

Nke a na-abịa dịka ụlọikpe kachasị kụchapụrụ ikpe a mara ya maka nrụrụaka.

Cheta na ụlọikpe dị na Legọs mara Kalu ikpe ma tụọ ya nga afọ iri na abụọ maka izu ego Abia steeti oge ọ bụ gọvanọ.

Ọ bụ n'ọnwa Disemba afọ 2019 ka e kpere ikpe a.

Oge nke a mechara, Kalu gbagharịrị akwụkwọ n'ụlọikpe mkpesa, mana ụlọikpe ahụ kwuru na mkpọrọ a tụrụ ya ziri ezi.

Nke a mere ka Kalu were ikpe ahụ gaa ụlọikpe kachasị.

Ụlọikpe kachasị kwuru na ọkaikpe ahụ kpebiri ikpe Kalu abụghị onye kwesịrị ikpe ya bụ ikpe.

Ọkaikpe 'Supreme Court' aha ya bụ Olabode Rhodes-Vivour kọwara na Mohammed Idris abụghịzị ọkaikpe n'ụlọikpe ahụ oge ọ mara Kalụ ikpe.

E buliri Mohammed Idris n'ọkwa gaa ụlọikpe 'Appeal Court' mana ọ natara ikike ka ọ nọrọ kpechaa ikpe Orji Uzor Kalu tupu ọ pụọ.

Dịka ndị ọkaikpe 'Supreme Court' si kọwaa, ikike ahụ Idris natara ezighi ezi n'iwu Naịjirịa nke a mere na ikpe ọ mara Kalu agaghị akwụdo.

Mana ụlọọrụ EFCC bụ ndị kpụpụrụ ya n'ụlọikpe sị na ikpe a bụ kpagbu megide agha mpụ maka na ihe akaebe ha ji n'ebe Kalu nọ buru ibu.

Ha sị n'ebubo e boro ya kadị n'ụlọikpe akachapụghị ha, na ha ga-agakwa ịmalite ikpe ya ọzọ.

Nwoke ọ pịara nwata nwaanyị a mụụrụ ya n'ala?

Ndị uweojii nọ n'Imo steeti ekwuola na akụkọ na-efegharị n'elu soshal midia na otu nwoke akpọrọ Ezekiel Anorue piara nwa nwaanyị amụrụ ya ọhụrụ n'ala bụ asị.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ikeokwu Godson kwuru na onweghị mgbe ihe dị etu ahụ mere.

Godson kwuru na onweghị mgbe ya ji kwuoro ndị ntaakụkọ gbasara ya bụ ihe dịka akụkọ ụgha ahụ si kwuo.

Ọ rịọkwara ka ndị na-ede udiri akụkọ ụgha chegharịa maka ibutere obodo ọdachị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: