Prepaid Meters: NERC enyela EEDC iwu ka ha kwụsị ibupu igwe ọkụ meter n'ike

'Meter' ọkụ latrik
Nkọwa foto, Ndị mmadụ kwuru na ndị EEDC na-ebupu 'meter' ochie ha n'ike ma na-ana ha puku naịra 39 iji tinye nke ọhụrụ
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service

Ụlọọrụ na-ahazi ka ndị na-enye ọkụ si arụ ọrụ ha na Nigeria bụ 'National Electricity Regulatory Commission' (NERC) enyela ndị Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) iwu ka ha kwụsị ibupu igwe 'meter' ndị mmadụ n'ike na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjiria.

Onyeisi ndị NERC n'Enugwu steeti bụ Frank Okafor gwara ndị EEDC ka ha malite itinyere ndị mmadụ meter ọhụrụ ahụ ngwangwa ha wepụrụ nke ochie na-akwụghị ụgwọ ọbụla.

Ndị nọ na ya bụ nkwekọrịta bụ otu Ndigbo United Forum, EEDC nakwa NERC.

Frank Okafor, onyeisi Ndigbo United Forum
Nkọwa foto, Frank Okafor, onyeisi Ndigbo United Forum

Cheta na otu Ndigbo United Forum haziri ngagharịiwe n'Enugwu n'ọnwa Jenụwarị, maka atụmatụ ahụ ndị EEDC wepụtara.

Atụmatụ ndị ahụ gụnyere na kamgbe Jenụwarị 2020, EEDC malitere wepụwa meter ọkụ ochie wee sị ndị mmadụ kwụọ puku naịra 39 n'ụma tupu ha enye nke ọhụrụ.

Aha onyonyo, EEDC: Gọọmentị anaghị emezu nkwa ha kwere

Ndị Igbo United Forum nke onyeisi ha bụ Chinedu Mba kwara arịrị na EEDC kwụsịkwara ndị niile nwere meter ochie ịzụta ọkụ nke mere na nhịahụ dị n'inwe ọkụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ kamgbe ọnwa Jenụwarị.

Ndị NERC gwakwara EEDC ka ha leba anya ka akparamagwa ndịọrụ ha siri dị na ebe ndị mmadụ nọ nakwa ihe ise ọzọ ha kwekọrịtara na EEDC ga-eme.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, "Ịgba egwu Salsa zọrọ ndụ m" - Emeka Adindu