Corruption Perceptions Index: Obasanjo,Ezekwesili nyụrụ ihe na-esi- Onye ọrụ Buhari

Ebe foto si, Getty/Ezekwesili/Onochie
Onye nnyemaka pụrụiche nke Onyeisiala Muhammad Buhari bụ Laurette Onochie na-arụ Olusegun Obasanjo na Oby Ezekwesili aka maka ajọ aha nnyocha Transparancy International nyere Naijiria na nsonso a.
Nnyocha nke otu na-eme ngụkọ maka ịkwụba aka ọto n'ụwa niile bụ "Transparency International" gosipụta na Naijirịa kpụụ afọ n'ala ada ngụkọ mba na-akwụba aka ọto nke afọ 2019.
Ha kwuru na Naịjirịa bụ mba nke anọ ebe nrụrụaka kacha njọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka.
Mana Onochie kwuru na nnyocha ha adabaghị n'ihi na ọ bụ ndị 'iweobi' Obasanjo na Oby Ezekwesili nyụrụ ihe na-esi n'ihi na ọ bụ ha hiwere otu Transparency International.
O gara n'ihu gwaa ụmụ Naijria ka ha ghara iji nnyocha ahụ Transparency International wepụtara kpọrọ ihe.
"Onyeisiala Buhari bụ onye ọkaibe n'ibu agha megide nrụrụaka n'Afrịka."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Na-agbanyeghị na ọchịchị Buhari na-etisi mkpu ike sị na ha na-ebu agha megide nrụrụaka, nnyocha Transparency International kwuru na Naijiria na-agba ọnụba.
Mana ya bụ nnyocha na-arụ ngalaba gọọmenti na-ebu agha megide nrụrụaka dịka EFCC na ICPC afọ.
N'onwe ya Ezekwesili onye sị okwu Collin Powell tụọ ilu kwuru na ọ bụ kụrụ ka ọ ga-aghọrọ.
O kwuru n'akara Twitter sị' "Okwu Collin Powell nke sịrị na 'O nweghị ụzọ nzuzo e si enwe ọganihu karịa nkwado, itinye uchu nakwa ịmụta ihe site na ọdịda' bụ ihe gbatara m n'obi oge m hụrụ nnyocha Corruption Perception Index ọhụrụ."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Nrụrụaka n'ọdịda anyanwụ Afrịka: Naanị Chad, Guinea Bissau na Cameroon ka Naịjirịa ka mma

Naịjirịa bụ mba nke anọ ebe nrụrụaka kacha njọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka.
Nke a bụ dịka nnyocha ọhụrụ ndị otu 'Transparency International' wepụtara n'ụbọchị Tọzde si kwuo.
Naanị Cameroon, Chad nakwa Guinea Bissau ka Naịjirịa ka mma na mpaghara ọdịda Anyanwụ Afrịka.
N'Afrịka niile Naịjirịa gbara 33 n'ime mba 48 e nyochara.
N'ụwa niile, nnyocha ahụ gosiri na Naịjirịa bụ ndị nke 146 n'ime mba 180.
Nke a bụ na-agbanyeghi na ọchịchị Muhammadu Buharị etuola ọnụ na ha ebutuola nrụrụaka na Naịjirịa.

Otu 'Civil Society Legislative Advocay Centre' (CISLAC) nke bụ otu na-anọchite anya 'Transparency International' kọwara ihe nrụrụaka jị aka njọ na Naịjirịa.
Auwal Rafsanjani, onyeisi otu CISLAC kwuru na gọọmentị etiti ka na-enupu isi nye mkpebi ụlọikpe.
Rafsanjani kwukwara na nrụrụaka na ndọrọndọrọ ọchịchị bawanyere na Naịjirịa n'afọ gara aga.

Lee ka ụfọdụ mba ndị ọzo bụ agbata Naijirịa sị kwụrụ
Ihe gọọmentị kwuru

Mana gọọmentị etiti ekwenyeghi n'ihe ndị Transparency International kwuru.
Ọkaiwu ukwu bụ Abubakar Malami kwuru na otu ahụ ejighi ihe akaebe ọbụla wee mee ya bụ nnyocha.
Malami kwuru na ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari emeela ka nrụrụaka gbadata nke ukwu na Naijiria
Ọ gara n'ihu maa Transparency International aka n'ihu ka ha gosipụta etu ha si mee nnyocha ha.
'Lassa Fever' ka na-akpa ike

Iba Lasa aribatala n'Enugwu steeti.
Onye ntaakụkọ BBC gara ụlọọgwụ Parklane ebe ndị ọrụ nọ na gbagharia dịka orịa lassa Fever gburu otu nwaanyị gbara afọ iri asaa na ise ebe ahụ.
Ka ọ dị ugbua, enwetela mkpesa Lassa fever na Ondo,Abia, Delta na Kano steeti.
ọrịa a egbuola dọkinta abụọ na nwaanyị dị ime na Kano, mmadụ iri na isii na Ondo steeti, otu nwoke n'Abia steeti.
Mmachị obodo Wuhan nke dị na China

Ka akụkọ nje na ọrịa na-aga n'ihu, ndị mba China amachiela mbata ma ọ bụ ọpụpụ na obodo Wuhan maka nje Corona nke na-egbu ndị mmadụ ka ọrịa SARS.
Nyocha na egosi na ọ bụ na Wuhan ka ya bụ nje siri bido site na-ire anụ ọhia. Mmadụ iri na asaa anwụọla ebe ihe dịka mmadụ narị ise na iri asaa bụ ya bụ ọria ma otutu ha bị na Wuhan.
Ọkụ Ọstrelịa

Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ atọ anwụọla dịka ụgbọelu eji emenyu ọku dara na mba Ọstrelịa.
Mmadụ atọ a bụ ndị mba Amerịka sọ na mmadụ iri ato na atọ nwurula maka ọku a bidoro gbawa kamgbe ọnwa Seputemba 2019.
Dịka ọ dị ụgbụa, amabeghị ihe mere ka ya bụ ụgbọelu daa.









