You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ego ole ka Harry na Megan na-agbakụta azụ ugbua ha chọrọ ịchọwa akara aka ha?
Obi adịghị ezinaụlọ Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth mma na nwanwa ya bụ Harry na nwunye ya bụ Meghan kwupụtara na ha ga anọrọ onwe ha, chụwa ego nke ha.
Ụbọchị Wenezde, Harry na Meghan kwuru na ha achọghịzịkwa ịbụ ndị welitere isi n'ezinaụlọ eze, na ha chọrọ ịgawa Kanada nakwa Amerịka ịchụ akara aka ha.
Nke a na-abịa ọnwa ole na ole ha tụchara arịrị maka agwa ọjọọ ndị ụlọọrụ akụkọ na-akpaso nwunye bụ Megan.
Okwa ha mara maka ịchụwa ego nke ha butere okwu ebe ka ego ha na-eribu si? Ego ole ka ha na-enwetabu?
Di na nwunye a gbara ama na pasent 95 ego nnweta ha si n'aka Ọkparaeze Charles, nna Harry.
Ọ na-akwụ ha ụgwọ ọrụ ọha ha na-arụ dịka 'Duke' na 'Duchess' nke Sussex nakwa ego igbo mkpa ezinaụlọ ha.
Harry na Meghan eritela ike karịrị nde paụnds ise(#5m) nke pụtara ijeri naira abụọ na ụma(N2,355,000,000) bido n'afọ 2018 a lụtara Meghan were rue 2019.
Ego bụ ego si n'ụlọ na ihe na-amịta ego nke Charles si na ya nweta ihe ruru £21.6m.
Ha na-enwetakwa pasent ise ego site na 'Sovereign Grant' bụ ego obi eze na-eketa.
Harry na Meghan eketakwara ego ruru £13m bụ ego nne Harry bụ Diana hapụrụ.
Harry ketakwara ego na ekpe nnenne bụ nne mụrụ Ezenwaanyị Elizabeth hapụrụ.
N'onwe ya, Meghan na-erite ego ruru £38,300 site n'ihe nkiri o sonyere na ya, ejiji nakwa ide ihe na intanet.
Iwu ji ezinaụlọ Ezenwaanyị Briten enyeghị onye ọbụla bụ onye ezinaụlọ ahụ ohere ịrụ ọrụ ọzọ iji kpata ego.
Ọkwa ndị ezinaụlọ Ezenwaanyị Elizabeth na etu ha si nọrọ nso n'oche Eze Briten
Ugbua ha chọrọ ịchụwa nke ha, a na-eche na ha ga-ebido nwetawa ego site na ide akwụkwọ.
Ha gbaburu ama na ha chọrọ ibido ụlọrụ na-enyere ndị mmadụ aka.
Ha nwekwara ihe ndị ha tinyere aha 'Royal Sussex' ha na-ere dịka mkpọ eji etinye mkpịsị odee, ihe egwuregwu nakwa ọzụzụ banyere agụmakwụkwọ.