Lee ihe mere n'agbamakwụkwọ Harry na Meghan Markle

Ụbọchị 19 nke ọnwa Mee bụ nke ndị mmadụ agaghị echefu ọsịsọ, maka na ọ bụ ụbọchị Ọkparaeze Harry lụrụ Meghan bụ onye na-eme ihe nkiri na mba Amerịka.

Ọlụlụ ha kpalitere ụka n'ụfọdụ ebe maka na nne Meghan bụ onye isi ojii. Nwaada a bụkwa onye ji afọ atọ tọ di ya.

Ọlụlụ Harry bụ 'Duke of Sussex' ga-eme Meghan 'Duchess of Sussex'.

Foto niile a si n'aka ndị Getty Images.