You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe ndị mmadụ kwuru maka agbamakwụkwọ Harry and Meghan
Agbamakwụkwọ Ọkparaeze Harry na Meghan Markle kpalitere ọtụtụ akụkọ n'etiti ndị Naịjirịa.
Agbamakwụkwọ a so n'otu ihe 'jikọrọ' ọtụtụ ndị Naịjirịa, maka na o buteere ọtụtụ n'ime ha obiaṅụrị nke mere ka ha kwado 'ụdịrị ịhụnanya' dị n'etiti ha.
Ebe ụfọdụ na-ekwu na ịhụnanya a dị ụtọ n'anya ma na ntị, ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ ihe ọma nye ndị isi ojii.
Cheta na Meghan ji afọ atọ tọ di ya, ma bụrụ onye ya na onye ọ lụbụrụ mbụ gbara alụkwaghịm, lụrụ Harry bụ nwanwa Ezenwaanyị Elizabeth nke Briten.
Meghan bụ onye mba Amerịka bụzị 'Duchess of Sussex' site n'ịlụ Harry bụ 'Duke of Sussex'.
Ihe ndị mmadụ kwuru
BBC gara na soshal midia ịhụ ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka agbamakwụkwọ a.
Otu onye kwuru na ịhụnanya ọ hụrụ gụrụ ya anya mmiri.
Ụfọdụ kwuru etu Harry sị kwe lụọ onye tọrọ ya. O jikwa ya tụnyere ụdịrị ọnọdụ ahụ na Naịjirịa.
Ụfọdụ gụrụ ya aha ndị Naịjirịa.
Onye ọzọ kwuru na Ọkparaeze Harry yi ụdịrị uwe o ji gbaa akwụkwọ nke ya n'afọ anọ gara aga.
Ụfọdụ kwuru na ọ bụ ebumnobi ha na ọ ga-eme ka ụmụnwaanyị ghara ite ihe n'ihu ha ụbọchị agbamakwụkwọ ha.
Ụfọdụ jikwa ohere ahụ tụnyere agbamakwụkwọ a na ụdịrị nke nwere ike ime na Naịjirịa.
@Dr_Aphiz kwuru sị na ọ hụrụ na Theresa May bụ praịm minista abịaghị, mana ọ bụrụ na Naịjirịa onyeisiala na ndị ọzọ ga-abịarịrị.