Onye ga-abụ onyeisi ọhụrụ na commonwealth?

Ndị isi Commonwealth na-ezukọ ka ha kparịta ụka ị chọputa ma nwaeze Wales a ga-anọchite anaya nne ya dịka onyeisi ga-chi ngalaba jikọtara obodo 53.

Ụbọchị Tọsde ka Ezenwaanyị Briten kpebiri na nwa ya Charles ga-achị otu akpọrọ CHOGM na Buckingham Palace.

Ọ si na ọ bụ mmasị ya ka nwa ya Charles chịa CHOGM otu ụbọchị.

Mana ya bụ ọkwa abụghị ihe Ezenwaanyị na-ekenye nwa ya maọbụrụ godu na ọ nwụọ.

A na-tụ anya na ndị isi oche Commonwealth ga-ekpebi maka onye ga-achị ha ma ha zukọ na Windsor Castle mana enwebeghị ihe gosiri na a ga-ekwupụta ya bụ ihe na nzukọ ahụ.

Ọ bụ na-enweghị onye ọzọ nwereike ichi commonwealth?

Onye ntaakụkọ BBC bụ James Landale sị na atụọla arọ ka ọkwa ahụ na-agagharị n'etiti ndị isi obodo nọ na Commonwealth.

Mana, Onyeisiala Saut Africa Cyril Ramaphosa egbubirila ije ya na nzukọ a na-eme na London ka owere mara ihe kpatara mwakpo a na-eme n'obodo ya.

Mwakpo a na-eme n'ugwu Saụt Afrịka ebe ndị ngagharị iwe na-asị ka-enye ha ọrụ, ụlọ obibi na nkwụsị mmerụaka.

Kedu ihe bụ ọrụ onyeisi Commonwealth?

Ọkwa nke Ezenwaanyị Briten nọ na ya dị oke mkpa.

Ngalaba a na-achịkọta mba iri ise na atọ iji wee hụ na ihe njirimara Commonwealth bụ ihe bịara na mmezu.

Nke a gụnyere ijikọta mba ndị a site n'azụmaahịa na mmekọrịta mba ụwa niile.

Akụkọ ga-amasị gị:

Onyeisi otu ndị a na-eme njem nleta na mba niile nọ na otu ahụ, iji mee nkwekọrịta ahụ guzosie ike.

O bụ ndị isi otu a na-eme mkpebi onye ga-abụ onyeisi ha gbagburugburu.

Praịm Mịnịsta bụ Theresa May na Praịm Mịnịsta mba Canada bụ Justin Trudeau akwadola ọkparaeze Charles ị bụ onyeisi.

Gịnị bụ CHOGM?

  • CHOGM bụ Commonwealth Heads of Government Meeting n'asụsụ bekee.
  • Ọ bụ ọgbakọ ndị ndu mba ndị so n'otu commonwealth, nke a na-eme kwa afọ abụọ.
  • Ndị na-eme ya bụ ndị isiala na ndị Praịm Mịnịsta mba dị iri ise na atọ na ndị ezinaụlọ ha, ndị na-ekwuru ha okwu na ndị ntaakụkọ.

Ọgbakọ nke afọ mere na Lọndọn, ebe nke gara aga n'afọ 2015 bụ na Valletta dị na Malta.